Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Ọ bụ Jehova kere ihe niile. N’ihi ya, o kwesịrị ka anyị na-efe ya. Ihe ga-eme ka ọ nabata ofufe anyị na-efe ya bụ ma anyị na-erubere ya isi ma na-ebi ndụ otú dị ya mma. N’isiokwu a, anyị ga-atụle ihe asatọ anyị na-eme iji fee Jehova. Anyị ga-amụtakwa otú anyị ga-esi na-emekwu nke ọma na ha na otú ime ha ga-esi na-eme anyị obi ụtọ.