Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Jehova nyere anyị onyinye magburu onwe ya, ya bụ, onyinye ikwu okwu. Ma, ọ dị mwute na ọtụtụ ndị anaghị eji onyinye a eme ihe Jehova chọrọ ka anyị jiri ya na-eme. Gịnị nwere ike inyere anyị aka ịna-ekwu ihe ga-agba ndị ọzọ ume na ihe ga-eme ka obi dị Jehova ụtọ n’ụwa ọjọọ a? Olee otú anyị nwere ike isi na-ekwu okwu na-eme Jehova obi ụtọ ma anyị nọrọ n’ozi ọma, ma anyị gaa ọmụmụ ihe, nakwa ma anyị na ndị ọzọ na-akparịta ụka? Anyị ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu a.