Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst hụrụ ụmụ ha n’anya nke ukwuu. Ha na-agbalịsi ike na-egboro ụmụ ha mkpa ha, na-emekwa ha obi ụtọ. Ihe kadị mkpa ha na-eme bụ na ha na-agbalị ike ha niile na-enyere ụmụ ha aka ka ha hụ Jehova n’anya nke ukwuu. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe anọ Baịbụl kwuru nwere ike inyere ndị nne na nna aka ime ihe a.