Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Mgbe ụfọdụ, ịtụ ụjọ abụghị ihe ọjọọ n’ihi na o nwere ike ime ka mmadụ ghara ịba ná nsogbu. Ma, mgbe ụfọdụ, ịtụ ụjọ adịghị mma. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Ekwensu na-agbalị ime ka anyị jiri ụjọ mee ihe anyị na-ekwesịghị ime. O doro anya na anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike ka anyị ghara ịna-atụ ụdị ụjọ a. Gịnị ga-enyere anyị aka? N’isiokwu a, anyị ga-ahụ na ọ bụrụ na obi esie anyị ike na Jehova nọnyeere anyị nakwa na ọ hụrụ anyị n’anya, anyị ga-akwụsị ịtụ ụjọ ọ bụla.