Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Jehova emeela ka anyị nwee olileanya magburu onwe ya na ọdịnihu ga-aka mma. Olileanya a na-eme anyị obi ụtọ, na-emekwa ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị banyere nsogbu ndị na-abịara anyị ugbu a. Ọ na-eme ka anyị nwee ike ịna-erubere Jehova isi n’agbanyeghị nsogbu ọ bụla bịaara anyị. O nwekwara ike ime ka a ghara iji echiche na-ezighị ezi ghọgbuo anyị. N’isiokwu a, anyị ga-amụta na ihe a niile bụ ezigbo ihe mere anyị ji kwesị ime ka olileanya anyị na-esi ike.