Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-atachi obi n’oge ikpeazụ a, anyị ga na-atụkwasị Jehova na nzukọ ya obi. Ekwensu na-agbalị iji ọnwụnwa ndị na-abịara anyị mee ka anyị kwụsị ịtụkwasị Jehova na nzukọ ya obi. N’isiokwu a, anyị ga-ekwu banyere ihe atọ Ekwensu na-eme nakwa ihe anyị ga-eme ka mbọ ọ na-agba kụọ afọ n’ala.