Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Onye ọ bụla a na-amụrụ Baịbụl kwesịrị ịgba mbọ ka e mee ya baptizim. Gịnị ga-eme ka onye a na-amụrụ Baịbụl chọọ ka e mee ya baptizim? Ọ bụ ịhụnanya. Gịnị ka ọ ga-ahụ n’anya? Ònyekwa ka o kwesịrị ịhụ n’anya? Anyị ga-amata azịza ya n’isiokwu a. Anyị ga-atụlekwa otú ihe ga-adịrị anyị ma e mee anyị baptizim.