Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Ihe ndị Jehova kere dị egwu. Ha niile na-atụ anyị n’anya, malite n’anyanwụ nke na-akpa ezigbo ike ruo n’okooko osisi nke na-esichaghị ike. Ihe ndị anyị nwere ike ịmụta n’ihe ndị Jehova kere nwere ike inyere anyị aka ịmụta àgwà ndị Jehova nwere. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe mere anyị kwesịrị iji na-ewepụta oge na-eleru ihe ndị Chineke kere anya nakwa otú ime ya ga-esi nyere anyị aka ịbịarukwu Chineke anyị nso.