Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Ọ bụrụ na mmadụ nwụnahụrụ gị, o doro anya na nkwa Chineke kwere na ọ ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ na-akasi gị ezigbo obi. Ma, olee otú ị ga-esi akọwara ndị ọzọ ihe mere i ji kwere na nkwa ahụ ga-emezu? Olee otú ị ga-esi mee ka obi sikwuo gị ike na a ga-akpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ n’eziokwu? Ihe mere e ji wepụta isiokwu a bụ ka o nyere anyị niile aka ka okwukwe anyị sikwuo ike n’olileanya mbilite n’ọnwụ.