Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a N’agbanyeghị na nsogbu ndị anyị na-atụghị anya ha nwere ike ịbịara anyị n’ụwa ochie a, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga na-akwado ndị ji obi ha niile na-efe ya. Olee otú Jehova si nyere ndị na-efe ya aka n’oge gara aga? Olee otú o si enyere anyị aka taa? Ịmụ banyere ụfọdụ ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl nakwa ndị nke oge a na-eme ka obi sie anyị ike na ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi, ọ ga-akwado anyị.