Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Anyị na-agba ibe anyị ume ma anyị zaa ajụjụ n’ọmụmụ ihe. Ma, ụjọ na-atụ ụfọdụ ndị ịza ajụjụ. Ọ na-atọkwanụ ndị ọzọ ụtọ ịza ajụjụ nke na ọ na-adị ha ka a na-akpọ ha ọtụtụ ugboro. N’agbanyeghị otú o si dịrị anyị, olee otú anyị ga-esi gosi na anyị na-echebara ibe anyị echiche ka e nwee ike gbaa anyị niile ume? Olee otú anyị ga-esi na-aza ajụjụ ga-eme ka ụmụnna anyị na-ahụ ibe ha n’anya ma na-arụ ezigbo ọrụ? A ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu a.