Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a O nwere ụzọ Jehova ji mee ihe atụ. Ọ bụ ụzọ si Babịlọn gaa Izrel. Ọ kpọrọ ya “Ụzọ Dị Nsọ.” Jehova ò mepeerela ndị ya ụdị ụzọ ahụ n’oge a? À na-ajụkwa ajụ? Kemgbe afọ 1919, ọtụtụ nde mmadụ ahapụla Babịlọn Ukwu malite ịga ije ‘n’Ụzọ Dị Nsọ.’ Anyị niile kwesịrị ịna-aga ije n’ụzọ ahụ ruo mgbe anyị ruru ebe anyị na-aga.