Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Ndị Kraịst kwesịrị ịmụta ịna-atụ egwu Chineke. Ụdị ịtụ egwu ahụ ga-echebe obi anyị, meekwa ka anyị ghara itinye aka n’omume rụrụ arụ na ile ndị gba ọtọ. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’Ilu isi 9. O ji ụmụ nwaanyị abụọ mee ihe atụ mere ka a ghọta ihe dị iche n’amamihe na nzuzu. Ndụmọdụ dị n’Ilu isi 9 nwere ike ịbara anyị uru ugbu a nakwa n’ọdịnihu.