Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Kemgbe oge Adam na Iv, ihe Setan na-eme ka ndị mmadụ kweta bụ na ha kwesịrị iji aka ha na-ekpebiri onwe ha ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. Ọ chọrọ ka anyị na-eche otú ahụ gbasara iwu Jehova na ntụziaka ndị nzukọ ya na-enye anyị. Isiokwu a ga-enyere anyị aka ịmụrụ anya ka anyị ghara iji aka anyị na-ekpebi ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ, nke bụ́kwanụ ihe ụwa Setan na-akwado. Ọ ga-enyekwara anyị aka ikpebisi ike irubere Jehova isi mgbe niile.