Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
f NKỌWA FOTO: Ụmụnna nwaanyị abụọ kpere ekpere tupu ha edejupụta fọm ịga Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze. E mechara kpọọ otu onye, mana a kpọghị onye nke ọzọ. Kama onye nke ahụ a na-akpọghị iwewe iwe, o kpere ekpere, rịọ Jehova ka o nyere ya aka ịchọpụta ụzọ ndị ọzọ ọ ga-esi jekwuoro ya ozi. O degaara alaka ụlọ ọrụ akwụkwọ ozi ma kwuo na ọ chọrọ ije ozi n’ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma.