Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
b Onye nlekọta kwesịrị ịbụ onye na-akụzi ihe nke ọma, onye ga-akụziliri Ndị Kraịst ibe ya eziokwu Baịbụl na ihe ndị bụ́ omume ọma. N’akwụkwọ ozi Pọl degaara Taịtọs, o kwuru na onye nlekọta kwesịrị ‘isi n’otú o si akụzi ihe na-egosi na o jidesiri okwu nke eziokwu aka ike’ ka o nwee ike ịgba ndị ọzọ ume ma na-adọ ha aka ná ntị. N’akwụkwọ ozi nke abụọ Pọl degaara Timoti, o kwukwara gbasara “onye ruru eru ịkụzi ihe.” N’ebe ahụ, o kwuru na “ohu Onyenwe anyị” kwesịrị ịna-ejide onwe ya, ‘jirikwa nwayọọ na-akụziri ndị isi ike ihe.’ (2 Tim. 2:24, 25) N’ihi ya, okenye kwesịrị inwe ike iji Baịbụl mee ka mmadụ chebara ihe echiche, na-enye mmadụ ezigbo ndụmọdụ, na-ekwukwa okwu na-eru ndị ọ na-agwa okwu n’obi. O kwesịrị ịna-amụsi Okwu Chineke ike ka o nwee ike ịna-akụziri ndị ọzọ na-amụkwa Okwu Chineke ihe.