Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Job onye ezi omume malitedịrị iche banyere otú ndị mmadụ si ele ya anya mgbe mmadụ atọ sị na ha bụ ndị enyi ya bịara kwuo na ọ ga-abụrịrị na e nwere ihe ọjọọ o mere. Na mbụ, mgbe ụmụ Job nwụrụ, ihe niile o nwere emiekwa ala, “Job emehieghị, o kwughịkwa na Chineke mere ihe na-adịghị mma.” (Job 1:22; 2:10) Ma mgbe e boro ya ebubo na o mere ihe ọjọọ, ọ maliteziri ‘ikwu okwu n’echeghị echiche.’ Ihe gbasara aha ya bịara dị ya mkpa karịa ime ka e doo aha Jehova nsọ.—Job 6:3; 13:4, 5; 32:2; 34:5.