Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
c Akwụkwọ bụ́ New Catholic Encyclopedia kwuru banyere ụbọchị iri anọ ahụ e ji ebu ọnụ a na-akpọ Lent, sị: “N’ime narị afọ atọ ka ndịozi Jizọs nwụchara, oge e ji ebu ọnụ iji kwadebe maka ememme Ista anaghị agafe otu izu; ọ na-abụkarị otu ụbọchị ma ọ bụ abụọ. . . . Ọ bụ ná nnọkọ ahụ ndị ụkọchukwu nwere na Naịsia ka e kwutetụrụ ihe gbasara ibu ọnụ ụbọchị iri anọ. Ma, ụfọdụ ndị ọkà mmụta na-ekwudị na ọ bụghị Lent ka e bu n’uche.”—Mbipụta nke Abụọ, Mpịakọta nke 8, peeji nke 468.