Samuel nke Mbụ
6 Igbe+ Jehova dịgidere n’obodo ndị Filistia ruo ọnwa asaa. 2 Ndị Filistia wee jụọ ndị nchụàjà na ndị na-agba afa,+ sị: “Gịnị ka anyị ga-eme Igbe Jehova? Gwanụ anyị otú anyị ga-esi bulaa ya ebe o si.” 3 Ha asị: “Unu chọọ ibula igbe ọgbụgba ndụ Jehova Chineke Izrel, unu agbakwala aka ebula ya. Unu ga-enyerịrị Chineke ihe ka ọ bụrụ àjà maka na ikpe mara unu.+ Ọ gwụla ya ga-eme ka a gwọọ unu. Mgbe ahụkwa ka unu ga-ama ihe mere na ọ kwụsịbeghị ịta unu ahụhụ.” 4 Ha asị: “Gịnị ka anyị kwesịrị inye ya ka ọ bụrụ àjà maka na ikpe mara anyị?” Ha asị: “Unu ga-enye ya ọkpụ ikè ise e ji ọlaedo kpụọ na òké ise e ji ọlaedo kpụọ. Unu ga-enye ya ole ndị isi ndị Filistia dị,+ n’ihi na ahụhụ a tara onye ọ bụla n’ime unu ka a takwara ndị isi unu. 5 Unu ga-akpụ ọkpụ ikè na òké+ ndị na-emebi ala unu. Unu ga-akwanyekwara Chineke Izrel ùgwù. Unu mee ihe ndị a, o nwere ike kwụsị ịta unu na chi unu nakwa obodo unu ahụhụ.+ 6 Unu akpọchikwala obi unu otú ndị Ijipt na Fero si kpọchie obi ha.+ Ọ bụ mgbe Chineke mesichara ha ike+ ka ha hapụrụ ndị Izrel, ha alawa.+ 7 Ugbu a, rụọnụ ụgbọala ọhụrụ, kpụtakwanụ nne ehi abụọ na-enye ụmụ ara, ndị na-anyatụbeghị yok ọ bụla. Kegidekwanụ nne ehi ndị ahụ n’ụgbọala ahụ, ma nwụghachinụ ụmụ ha ebe ha na-anọ. 8 Dọnyenụ Igbe Jehova n’ụgbọala ahụ. Tinyekwanụ ihe ndị ahụ e ji ọlaedo kpụọ n’igbe ga-adị n’akụkụ Igbe Chineke. Ha ga-abụ ihe unu nyere Chineke ka ha bụrụ àjà maka na ikpe mara unu.+ Hapụkwanụ ehi ndị ahụ ka ha gawa ebe ha chọrọ ịga, 9 lewekwanụ ha: ọ bụrụ na ha agawa ụzọ e si aga Bet-shimesh,+ bụ́ ebe igbe ahụ si, ọ pụtara na ọ bụ Chineke mere anyị nnukwu ihe ọjọọ a. Ma, ọ bụrụ na ha agaghị n’ụzọ ahụ, anyị ga-amara na ọ bụghị ya tara anyị ahụhụ a, kama na ọ bụ otú o si dabara anyị.”
10 Ndị Filistia wee mee ihe a gwara ha. Ha kpụụrụ nne ehi abụọ na-enye ụmụ ara kegide n’ụgbọala, ma ha nwụghachiri ụmụ ha n’ụlọ ha. 11 Ha dọnyekwara Igbe Jehova n’ụgbọala ahụ, dọnyekwa igbe e tinyere òké ha ji ọlaedo kpụọ nakwa ọkpụ ikè ndị ha kpụrụ. 12 Nne ehi ndị ahụ wee gawa nnọọ n’ụzọ gara Bet-shimesh.+ Ha nọ na-aga n’otu okporo ụzọ, na-ebe ubé ka ha na-aga. Ha ahapụghịkwa ụzọ ahụ gaa n’aka nri ma ọ bụ n’aka ekpe. Ndị isi ndị Filistia nọkwa na-eso ha n’azụ ruo mgbe ha banyere n’ala Bet-shimesh. 13 Ndị Bet-shimesh nọ na ndagwurugwu na-aghọ ọka wit. Mgbe ha leliri anya hụ Igbe ahụ, ha malitere ịṅụrị ọṅụ. 14 Ụgbọala ahụ gbabatara n’ala Joshụa onye Bet-shimesh ma kwụrụ n’akụkụ otu nnukwu nkume dị ebe ahụ. Ha wee kpọwaa osisi ụgbọala ahụ, jirikwa nne ehi ndị ahụ+ chụọrọ Jehova àjà a na-esu ọkụ.
15 Ndị Livaị+ wee butuo Igbe Jehova na igbe ahụ e tinyere ihe ndị ahụ e ji ọlaedo kpụọ. Ha dọkwasịkwara ha n’elu nnukwu nkume ahụ. Ndị Bet-shimesh+ wee chụọ àjà a na-esu ọkụ, chụọkwara Jehova àjà ndị ọzọ n’ụbọchị ahụ.
16 Mgbe ndị isi ise nke ndị Filistia hụrụ ya, ha laghachiri Ekrọn n’ụbọchị ahụ. 17 Ndị Filistia wetaara Jehova ọkpụ ikè ọlaedo ndị ahụ ka ọ bụrụ àjà maka na ikpe mara ha.+ Otu bụ maka Ashdọd,+ ọzọ abụrụ maka Gaza, ọzọ abụrụ maka Ashkelọn, ọzọ abụrụ maka Gat,+ ọzọ abụrụkwa maka Ekrọn.+ 18 Òké ndị ahụ e ji ọlaedo kpụọ dịkwa ole obodo ndị Filistia niile dị, ya bụ, obodo ndị Filistia niile ndị isi ise ahụ na-achị, ma obodo ndị a rụsiri ike ma ime ime obodo.
Ruokwa taa, ihe e ji echeta ihe a merenụ bụ nnukwu nkume ahụ ha dọkwasịrị Igbe Jehova na ya, nke dị n’ala Joshụa, onye Bet-shimesh. 19 Ma, Chineke gburu ndị Bet-shimesh maka na ha nọ na-ele anya n’Igbe Jehova. O gburu puku mmadụ iri ise na mmadụ iri asaa* (50,070) n’ime ndị obodo ahụ. Ha wee ruwe uju n’ihi na Jehova asụọla ha akwụ.+ 20 Ndị Bet-shimesh wee sị: “Jehova Chineke dị nsọ.+ Ònye ga-abịali ya nso? Ọ̀ ga-ahapụtụnụ anyị aka gakwuru ndị ọzọ?”+ 21 Ha zipụziri ndị gara gwa ndị Kiriat-jierim,+ sị: “Ndị Filistia ebughachitela Igbe Jehova. Bịanụ buru ya.”+