Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Agụmakwụkwọ n’Oge Bible
    Ụlọ Nche—1992 | Nọvemba 1
    • Agụmakwụkwọ n’Oge Bible

      “Unu ga-ezi ụmụ unu ha.”—DEUTERỌNỌMI 11:19.

      1. Gịnị na-egosi na Jehova nwere mmasị n’agụmakwụkwọ nke ndị na-ejere ya ozi?

      JEHOVA bụ Onye Nkụzi Akwụkwọ Ukwu. Ọ dịbeghị mgbe ọ hapụrụ ndị na-ejere ya ozi n’ọnọdụ amaghị ihe. Ọ dịwo njikere mgbe nile iso ha kerịta ihe ọmụma. Ọ na-ezi ha uche ya na ụzọ ya nile. N’ọtụtụ puku afọ a na-apụghị ịgụta ọnụ Ọkpara ya nọ n’akụkụ ya, na-amụ ihe mgbe nile dị ka “onye ọkà” Chineke. (Ilu 8:30) Mgbe ọ nọ n’elu ala Jisọs kwuru, sị: “Di ka Nna m ziri m, otú a ka m na-ekwu ihe ndị a.” (Jọn 8:28) N’izo aka n’ebe Chineke nọ dị ka Onye Nkụzi Akwụkwọ Na-enweghị Atụ, Elaịhu jụrụ, sị: “Ònye bụ onye ozizi dị ka ya?” (Job 36:22) Aịsaịa onye amụma kwuru banyere Jehova ịbụ “Onye Ozizi Ukwu” nke ndị Ya wee buo amụma, sị: “Ụmụ gị nile ga-abụ ndị mmụta Jehova; udo nke ụmụ gị ga-abakwa ụba.” (Aịsaịa 30:20; 54:13) Ajụjụ ọ bụla adịghị ya na Jehova chọrọ ka ihe ndị o kere eke nwere ọgụgụ isi bụrụ ndị maara ihe a na-akọ na ndị a kụziiri akwụkwọ nke ọma.

      Agụmakwụkwọ Ndị Nna Ochie

      2, 3. (a) Olee otú ndị nna ochie ahụ kwesịrị ntụkwasị obi si lee agụmakwụkwọ ụmụ ha anya, ntụziaka dịkwa aṅaa ka Jehova nyere Abraham? (b) Nzube dị ebube dị aṅaa dị ná ntụziaka ahụ nke inye ụmụ Abraham ọzụzụ?

      2 Otu n’ime ikike ndị bụ isi e nyere onye isi ezinụlọ n’oge ndị nna ochie bụ ọzụzụ nke ụmụ ya na ezinụlọ ya. Nye ndị na-ejere Chineke ozi, agụmakwụkwọ nke ụmụ ha bụ ọrụ okpukpe. Jehova kwuru banyere Abraham na-ejere ya ozi, sị: “Amawo m ya, ka o wee nye ụmụ ya na ụlọ ya, ndị ga-anọchi ya, iwu, ka ha wee debe ụzọ Jehova, ime ezi omume na ihe e kpere n’ikpe; ka Jehova wee weta n’isi Abraham ihe o kwuru banyere ya.”—Jenesis 18:19.

      3 Okwu Chineke nke a na-egosi na Jehova lere agụmakwụkwọ anya dị ka ihe dị oké mkpa. Chineke chọrọ ka Abraham, Aịsak, na Jekọb kụziere ezinụlọ ha ihe n’ụzọ Ya nile nke ezi omume na ihe e kpere n’ikpe ka ọgbọ ndị na-abịa n’ihu wee nọrọ n’ọnọdụ nke idebe ụzọ Jehova. Otú a, Jehova ga-emezu nkwa ya nile banyere mkpụrụ Abraham na ngọzi nke “mba nile nke ụwa.”—Jenesis 18:18; 22:17, 18.

      Usoro Agụmakwụkwọ n’Israel

      4, 5. (a) Gịnị mere ka usoro agụmakwụkwọ ndị Israel dị iche pụọ na nke ndị mba ndị ọzọ? (b) Olee ọdịiche ọzọ dị mkpa nke e depụtara n’akwụkwọ Encyclopaedia Judaica, gịnịkwa ka ihe ịrụ ụka na-adịghị na ya na ọ bụ ya kpatara ọdịiche nke a?

      4 Akwụkwọ bụ́ Encyclopaedia Judaica na-asị: “Bible bụ isi iyi bụ isi maka nghọta nke usoro agụmakwụkwọ n’Israel oge ochie.” Jehova jiri Mosis mee ihe dị ka onye nkụzi mbụ bụ mmadụ n’Israel. (Deuterọnọmi 1:3, 5; 4:5) Mosis kpọsara okwu ndị Jehova nyere ya. (Ọpụpụ 24:3) Ya mere, n’ikwu eziokwu, Chineke bụ Onye Nkụzi Akwụkwọ bụ isi nke Israel. Nke a n’onwe ya mere ka usoro agụmakwụkwọ n’Israel dị iche site na nke ndị mba ọzọ.

      5 Otu akwụkwọ ntụaka ahụ kwupụtara, sị: “Agụmakwụkwọ dị elu ma ọ bụ ọmụmụ ihe na Mesọpọtamia na Ijipt bụ nke a na-eme n’ụlọ akwụkwọ, ọ dịkwaara nanị ndị odeakwụkwọ, nke na-eyighị ka ọ dị otú ahụ n’Israel. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọdịiche ahụ bụ n’ihi usoro mkpụrụ okwu ndị ka mfe bụ́ nke ndị Hibru ji eme ihe. . . . Ịdị mkpa nke iji mkpụrụ okwu na-ede ihe maka akụkọ ihe mere eme nke agụmakwụkwọ bụ nke a na-apụghị ileghara anya ma ọlị. O webatara nkwụsị nke usoro ọdịnala nke ndị odeakwụkwọ nke Ijipt, Mesọpọtamia, na Kenean nke puku afọ nke abụọ. Ịma akwụkwọ abụkwaghị ihe e ji amata na nke dịịrị nanị ìgwè ndị odeakwụkwọ bụ́ ọkà na ndị nchụàjà, ndị maara agụ ihe odide ndị e ji mkpụrụ okwu ndị dị ka mkpọ na ihe osise dee bụ́ ndị na-esi ike nghọta.”

      6. Ihe àmà Bible dị aṅaa ka e nwere na site ná mmalite akụkọ ihe mere eme ha, ndị Israel bụ ndị maara akwụkwọ?

      6 Bible na-enye ihe àmà nke na ndị Israel bụ ndị maara akwụkwọ. Tupu ha abanye n’Ala Nkwa ahụ, a gwara ha ka ha dee iwu nile nke Jehova n’awara ụzọ na n’ọnụ ụzọ ámá ha. (Deuterọnọmi 6:1, 9; 11:20; 27:1-3) Ọ bụ ezie na ihe nke a e nyere n’iwu bụ n’ụzọ ihe atụ, ọ garaghị enwe nnọọ uru ọ bara nye onye Israel nkịtị ma ọ bụrụ na ọ maghị ka e si agụ na ka e si ede. Akụkụ akwụkwọ nsọ ndị dị ka Joshua 18:9 na Ndị Ikpe 8:14 na-egosi na ndị ọzọ e wezụga ndị ndú dị ka Mosis na Joshua maara ede ihe ogologo oge tupu e guzobe usoro ndị eze n’Israel.—Ọpụpụ 34:27; Joshua 24:26.

      Ụzọ Dị Iche Iche nke Izi Ihe

      7. (a) Dị ka Akwụkwọ Nsọ na-ekwu, ònye nyere ụmụaka ndị Israel agụmakwụkwọ ha bụ isi? (b) Ihe ọmụma dị aṅaa ka onye France bụ onye mmụta Bible na-enye?

      7 N’Israel, a na-akụziri ụmụaka ihe site na mgbe ha dị nnọọ ná nwata site n’aka ma nne ma nna ha. (Deuterọnọmi 11:18, 19; Ilu 1:8; 31:26) N’akwụkwọ Dictionnaire de la Bible e dere n’asụsụ French, onye mmụta Bible bụ́ E. Mangenot dere, sị: “Ngwa ngwa o nwere ike ikwu okwu, nwatakịrị na-amụ akụkụ ihe odide ole na ole site n’Iwu ahụ. Nne ya ga na-agụghachi otu amaokwu; mgbe ọ mụtara ya, ọ ga-enye ya ọzọ. E mesịa, a ga-etinye ihe odide nke amaokwu ndị ahụ ha nweworo ike ịgụ site n’isi n’aka ha. Otú a, a na-eme ka ha malite ịgụ ihe, mgbe ha mekwara okenye karị, ha pụrụ ịga n’ihu n’ozizi okpukpe ha site n’ịgụ ihe na ịtụgharị uche n’iwu nke Onyenwe anyị.”

      8. (a) Ụzọ nkụzi ihe dị aṅaa bụ isi ka e jiri mee ihe n’Israel, ma nwee ihe dị mkpa dị aṅaa e ji mara ya? (b) Olee ihe ndị e ji mee ihe bụ́ ndị na-enye aka icheta ihe?

      8 Nke a na-atụ aro na ụzọ bụ isi e ji mee ihe bụ ịmụ ihe site n’iburu ha n’isi. Ihe ndị a mụtara banyere iwu nile nke Jehova na ụzọ o si emeso ndị ya ga-abami n’ime obi. (Deuterọnọmi 6:6, 7) A ga-atụgharị uche banyere ha. (Abụ Ọma 77:11, 12) Iji nyere ụmụaka na ndị okenye aka iburu ihe n’isi, e jiri ihe dị iche iche na-enye aka iburu ihe n’isi mee ihe. Ndị a gụnyere usoro mkpụrụ okwu, ahịrịokwu ndị na-esote onwe ha n’abụ, bụ́ ndị na-eji mkpụrụ okwu dị iche na-amalite, n’usoro mkpụrụ okwu nile (dị ka Ilu 31:10-31); okwu mgbawa ọnụ (okwu ndị ji otu mkpụrụ okwu ma ọ bụ ụda olu malite); na iji nọmba na-eme ihe, dị ka ndị e jiri mee ihe n’ọkara nke ikpeazụ nke Ilu isi nke 30. Ọ dị mma ịmara na ụfọdụ ndị mmụta lere Gezer Calendar, otu n’ime ihe atụ ndị kasị ochie nke ihe odide Hibru oge ochie, anya dị ka ihe nwa akwụkwọ ji amụ ibu ihe n’isi.

      Ihe Ndị A Na-akụzi

      9. (a) Gịnị bụ akụkụ dị mkpa nke usoro ọmụmụ ihe maka ụmụaka ndị Israel? (b) Gịnị ka otu akwụkwọ nkà ihe ọmụma Bible na-ekwu banyere nkụzi e mere n’oge ememe ndị a na-eme kwa afọ?

      9 Agụmakwụkwọ n’Israel ejedebeghị n’ịmụ ịgụ ihe na ide ihe. Otu isi ihe ọmụmụ dị mkpa a na-akụzi bụ akụkọ ihe mere eme. Ịmụ banyere ihe ebube ndị Jehova na-eme maka ndị ya bụ akụkụ dị mkpa nke ihe ndị a na-akụzi. A ghaghị ịkụzi ihe akụkọ ndị a mere eme site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ. (Deuterọnọmi 4:9, 10; Abụ Ọma 78:1-7) Ime ememe ndị a na-eme kwa afọ na-enye ohere mara mma maka onye isi ezinụlọ izi ụmụ ya ihe. (Ọpụpụ 13:14; Levitikọs 23:37-43) Banyere nke a akwụkwọ bụ́ The International Standard Bible Encyclopedia na-asị: “Site n’ihe nna na-ezi n’ebe obibi na ná nkọwa ndị ọ na-enye banyere ịdị mkpa nke ememe ndị ahụ, a kụziiri ụmụaka bụ ndị Hibru ụzọ Chineke siworo gosipụta onwe Ya nye ha n’oge gara aga, ụzọ ha ga-esi bie ndụ mgbe ahụ, na ihe bụ nkwa Chineke banyere ọdịnihu nke ndị Ya.”

      10. Ọzụzụ ime ihe eme dị aṅaa ka e nyere ụmụ nwanyị? ụmụ nwoke?

      10 Agụmakwụkwọ ndị nne na nna na-enye gụnyere ime ihe eme. A kụziiri ụmụ nwanyị nkà ọrụ ụlọ. Isiakwụkwọ ikpeazụ nke Ilu na-egosi na ndị a dị ọtụtụ ma dị iche iche; ha gụnyere ịtụ ogho, ịkpa ákwà, isi nri, ịzụ ahịa, na nlekọta ezinụlọ. A na-akụzikarịrị ụmụ nwoke ọrụ ego nna ha na-arụ, ma ọ bụ n’ọrụ ugbo ma ọ bụ ọrụ aka ma ọ bụ nkà ọzọ. N’oge ndị sochiri, ndị rabaị ndị Juu nwere àgwà nke ịdị na-ekwu, sị: “Onye na-akụzirighị nwa ya nwoke ọrụ aka bara uru na-azụlite ya ịbụ onye ohi.”

      11. Gịnị na-egosi nzube bụ isi nke agụmakwụkwọ n’Israel, ihe ndị dị aṅaa ka nke a na-akụziri ndị na-eto eto taa?

      11 Ịdị omimi ime mmụọ nke ụzọ nile nke izi ihe e ji mee ihe n’Israel na-apụta ìhè n’akụkụ nile nke akwụkwọ Ilu. Ọ na-egosi na nzube ya bụ izi “ndị na-enweghị uche” ihe ndị dị elu dị ka amamihe, ịdọ aka ná ntị, nghọta, ezi uche, ezi ikpe, ịma ihe, ihe ọmụma, na izuzu—ihe a dum ‘n’egwu Jehova.’ (Ilu 1:1-7; 2:1-14) Ọ na-emesi ike ebumnobi kwesịrị ịkwali otu n’ime ndị na-ejere Chineke ozi taa imeziwanye agụmakwụkwọ ya.

      Ndị Nchụàjà, Ndị Livaị, na Ndị Amụma

      12. Olee ndị ma e wezụga ndị nne na nna na-ekere òkè n’ịkụziri ndị Israel akwụkwọ, gịnịkwa bụ isi ihe nke okwu Hibru a sụgharịrị ịbụ “iwu” pụtara?

      12 Ebe ndị nne na nna na-enye ọzụzụ bụ isi, Jehova kụzikwuuru ndị ya ihe site n’aka ndị nchụàjà, ndị Livaị na-abụghị ndị nchụàjà, na ndị amụma. Ná ngọzi ikpeazụ ya n’isi agbụrụ Livaị, Mosịs kwuru, sị: “Ha ga-ezi Jekọb ikpe gị nile, iwu gị ka ha ga-ezikwa Israel.” (Deuterọnọmi 33:8, 10) N’ụzọ pụtara ìhè, okwu ahụ bụ “iwu” na Hibru (toh·rahʹ) sitere n’okwu nke ngwaa ya pụtara “igosi,” “ịkụzi,” “izi.” Akwụkwọ Encyclopaedia Judaica na-asị: “Ya mere okwu ahụ bụ [torah] pụtara ‘nkụzi,’ ‘nkwenkwe,’ ma ọ bụ ‘ozizi.’”

      13. N’ihi gịnị ka Iwu Israel ji dị iche site n’usoro iwu nke mba ndị ọzọ?

      13 Nke a kwa guzopụrụ Israel iche site ná mba ndị ọzọ na ọbụna site ná mba ndị dị n’oge a. Mba ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị taa nwere ọtụtụ iwu nke ụba mmadụ n’ozuzu ha maara nanị ole na ole. Mgbe ndị mmadụ mebiri iwu, ha na-akwụ ndị ọkà iwu ụgwọ dị elu iji kpepụta ha. Ụlọ akwụkwọ dị iche iche maka ịmụ iwu bụ maka ndị ọkachamara. Ma n’Israel, Iwu ahụ bụ ụzọ Chineke nwere isi gwa ndị ya otú ọ chọrọ ka ha si fee ya ma bie ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’uche ya. N’adịghị ka ụkpụrụ iwu ndị ọzọ, ọ gụnyere ịhụnanya maka Chineke na ndị agbata obi. (Levitikọs 19:18; Deuterọnọmi 6:5) Iwu ahụ abụtụghị akwụkwọ ụkpụrụ ndị ebere na-adịghị ya. O nyere nkwenkwe, nkụzi, na ozizi banyere ụzọ ndụ nke a na-aghaghị ịmụta.

      14. Olee otu ihe mere Jehova ji jụ ndị nchụàjà bụ ndị Livaị? (Malakaị 2:7, 8)

      14 Mgbe ha na-ekwesị ntụkwasị obi, ndị nchụàjà na ndị Livaị na-emezu ibu ọrụ ha nke ịkụziri ndị ahụ ihe. Ma ọtụtụ mgbe karị, ndị nchụàjà leghaara ọrụ dịịrị ha nke inye mba ahụ ọzụzụ anya. Enyeghị ọzụzụ nke a n’Iwu Chineke gaje inwe mmetụta ọjọọ n’ahụ ma ndị nchụàjà ma ndị ahụ. Na narị afọ nke asatọ T.O.A., Jehova buru amụma, sị: “E mewo ka ndị m laa n’iyi site n’enweghị ọmụma Chineke: n’ihi na gị onwe gị ajụwo ọmụma ahụ, m ga-ajụkwa gị, i wee ghara ịbụrụ m onye nchụàjà: i chezọwokwa iwu nke Chineke gị, m ga-echezọkwa ụmụ gị, ọbụna mụ onwe m.”—Hosea 4:6.

      15. (a) Tinyere ndị nchụàjà, olee ndị ka Jehova kpọlitere dị ka ndị nkụzi n’Israel, gịnịkwa ka otu onye mmụta Bible dere banyere ọrụ ha dị ka ndị na-akụzi akwụkwọ? (b) Gịnị mesịrị mee Israel na Juda n’ihi na ha jụrụ ihe ọmụma Jehova na ụzọ ya nile?

      15 Tinyekwara ndị nchụàjà, Jehova welitere ndị amụma dị ka ndị na-akụzi ihe. Anyị na-agụ, sị: “Jehova wee gbara Israel àmà, gbakwaara Juda, site n’aka onye amụma ọ bụla, na onye ọhụ ụzọ ọ bụla, sị, Sinụ n’ụzọ ọjọọ nile unu laghachi, debe ihe nile m nyere n’iwu, na ụkpụrụ m nile, dị ka iwu ahụ nile si dị nke m nyere nna unu ha n’iwu, nke m zitekwaara unu n’aka ndị ohu m, bụ́ ndị amụma.” (2 Ndị Eze 17:13) Banyere ọrụ ndị amụma dị ka ndị na-akụzi ihe, onye France bụ́ onye mmụta Bible bụ́ Roland de Vaux dere, sị: “Ndị amụma kwa, nwere ọrụ nke izi ndị ahụ ihe; nke a bụkwa ọrụ e kenyere ha dịkwa ka ikwu ihe ga-eme n’ọdịnihu. Mmụọ ibu amụma na-enyekwa nkwusa ha ikike nke okwu Chineke. O doro anya na n’okpuru usoro ndị eze, ndị amụma bụ ndị na-akụziri ndị ahụ ihe n’ihe banyere okpukpe na omume; anyị pụkwara ịgbakwụnye na ha bụ ndị nkụzi kasị mma, ma ọ bụrụ na ha abụghị ndị a kasị aṅa ntị mgbe nile.” Site ná ndị nchụàjà na ndị Livaị ịhapụ ịkụzi ihe kwesịrị ekwesị na tinyere ịda ada n’idebe okwu ndị amụma Jehova, ndị Israel hapụrụ ụ zọ nile nke Jehova. Sameria dabara n’aka ndị Asiria na 740 T.O.A., ndị Babilọn bibikwara Jerusalem na ụlọ nsọ ya na 607 T.O.A.

      Agụmakwụkwọ n’Oge Ndọrọ n’Agha na Mgbe Ọ Gasịrị

      16, 17. (a) Usoro agụmakwụkwọ dị aṅaa ka a manyere Daniel na ndị enyi ya atọ inweta? (b) Gịnị nyeere ha aka ịgafere agụmakwụkwọ ndị Babilọn nke a ma nọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova?

      16 Ihe dị ka afọ iri tupu mbibi Jerusalem, Eze Nebukadneza dọọrọ Eze Jehoịakin na otu ìgwè ndị isi na ndị a maara aha ha laa Babilọn. (2 Ndị Eze 24:15) N’etiti ha e nwere Daniel na ụmụ okorobịa atọ ndị ọzọ a maara aha ha. (Daniel 1:3, 6) Nebukadneza nyere ha anọ iwu ka ha nweta ọzụzụ pụrụ iche ruo afọ atọ n’ide “akwụkwọ na asụsụ ndị Kaldea.” Ọzọ, e nyere ha “òkè nke ụbọchị ọ bụla n’ụbọchị ya site n’ihe oriri ọma nke eze, na site ná mmanya vine nke ọ na-aṅụ.” (Daniel 1:4, 5) Nke a bụ ihe ize ndụ n’ihi ọtụtụ ihe. O yiri ka usoro ozizi ihe ahụ abụghị nanị nkụzi afọ atọ nke asụsụ. Okwu ahụ bụ “ndị Kaldea” n’akụkụ ihe odide a ka ụfọdụ na-eche na ọ na-egosi, “ọ bụghị ndị Babilọn dị ka otu ndị, kama ndị gụrụ akwụkwọ.” (The Soncino Books of the Bible) Ná nkọwa ya nke Daniel, C. F. Keil na-asị: “A ga-enye Daniel na ndị enyi ya ọzụzụ n’amamihe ndị nchụàjà na ndị gụrụ akwụkwọ bụ́ ndị Kaldea, bụ́ nke a na-akụzi n’ụlọ akwụkwọ ndị dị na Babilọn.” Nri eze ahụ kpughepụkwara ha nye imebi mgbochi ndị Iwu Mosis nyere banyere ihe oriri. Olee otú ihe si gaara ha?

      17 Dị ka ọnụ na-ekwuchitere ndị Juu anọ ahụ a maara aha ha bụ́ ndị na-eto eto, Daniel mere ka ọ pụta ìhè site ná mmalite na ha agaghị eri ihe ma ọ bụ ṅụọ ihe nke ga-emebi akọ na uche ha. (Daniel 1:8, 11-13) Jehova gọziri nguzo nke a siri ike ma mee ka obi onye isi Babilọn ahụ na-elekọta ha dị nro. (Daniel 1:9, 14-16) Banyere ọmụmụ ihe ha, ihe ndị mesịrị mee ná ndụ ndị Hibru anọ ahụ na-eto eto nwapụtara n’ụzọ ihe ịrụ ụka na-adịghị ya na agụmakwụkwọ afọ atọ a manyere ha amanye n’omenala ndị Babilọn emeghị ka ha si ná nrapagidesi ike ha rapagidere n’ebe Jehova na ofufe ya dị ọcha nọ pụọ. (Daniel, isi nke 3 na nke 6) Jehova nyeere ha aka ịgụsi akwụkwọ afọ atọ nke a manyere ha amanye ịgụ n’ọgụgụ akwụkwọ dị elu nke Babilọn n’enweghị mmerụ ahụ ọ bụla. “Ma ụmụ okoro anọ ndị a, Chineke nyere ha ọmụma ihe na uche n’akwụkwọ na amamihe nile: Daniel ghọtakwara ọhụụ na nrọ nile. Ma n’okwu ọ bụla nke amamihe nke nghọta, nke eze chọrọ n’aka ha, ọ hụrụ na ha ka ndị odeakwụkwọ dị nsọ nile na ndị dibịa nile ndị nọ n’alaeze ya nile mma ugbo iri.”—Daniel 1:17, 20.

      18. Usoro agụmakwụkwọ dị aṅaa ka e nwere na Juda mgbe ndọrọ n’agha ndị Babilọn gasịrị?

      18 Mgbe ndọrọ n’agha ndị Babilọn gasịrị, Ezra, onye nchụàjà “doziri obi ya ịchọ iwu Jehova, na ime ya, na izi ụkpụrụ ya na ikpe ya n’Israel” rụrụ oké ọrụ ịkụzi ihe. (Ezra 7:10) Ndị Livaị kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ ndị “mere ka ndị ahụ ghọta iwu ahụ,” nyeere ya aka na nke a. (Nehemaịa 8:7) Ezra bụ onye mmụta Bible na “odeakwụkwọ” ma ọ bụ ọkà n’ide ihe odide. (Ezra 7:6) Ọ bụ n’ụbọchị ya ka ndị odeakwụkwọ ghọrọ ndị a ma ama dị ka otu ìgwè.

      Ụlọ Akwụkwọ Ndị Rabaị

      19. Òtù ndị nkụzi dị aṅaa biliteworo n’Israel mgbe Jisọs bịara n’ụwa, n’ihi ihe dị aṅaa dị mkpa ka ya na ndị na-eso ụzọ ya ji ghara inweta agụmakwụkwọ dị elu nke ndị Juu?

      19 Mgbe Jisọs bịara n’ụwa, ndị odeakwụkwọ aghọwo òtù ndị nkụzi nọ n’ọkwá dị elu, na-arapara n’omenala karịa n’ezi ozizi nke Okwu Chineke. Ọ na-amasị ha ka a na-akpọ ha “Rabaị,” nke ghọworo utu aha nkwanye ùgwù nke pụtara “Onye Ukwu (Ọma) M.” (Matiu 23:6, 7) N’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, a na-ejikọkarị ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, nke ụfọdụ n’ime ha bụ ndị nkụzi nke Iwu ahụ. (Ọrụ 5:34) Jisọs boro òtù abụọ ahụ ebubo nke ime ka okwu Chineke ghara ịdị irè n’ihi omenala ha na ịkụzi “ihe mmadụ nyere n’iwu ka ọ bụrụ ozizi ha.” (Matiu 15:1, 6, 9) Ka a sịkwa ihe mere na ma Jisọs ma ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke ndị na-eso ụzọ ya adịghị nke a zụrụ n’ụlọ akwụkwọ ndị rabaị.—Jọn 7:14, 15; Ọrụ 4:13; 22:3.

      20. Gịnị ka ntụleghachi nke a nke agụmakwụkwọ n’oge Bible gosiworo anyị, gịnịkwa na-egosi na ndị na-ejere Jehova ozi nwere mkpa nke agụmakwụkwọ?

      20 Nkọwa nke a nke agụmakwụkwọ n’oge Bible egosiwo na Jehova bụ Onye Ozizi Ukwu nke ndị ya. Site n’aka Mosis, Chineke haziri usoro dị irè nke ịkụzi ihe n’Israel. Ma mgbe ogologo oge gafere, usoro agụmakwụkwọ dị elu nke ndị Juu bilitere bụ́ nke kụziri ihe ndị na-emegide Okwu Chineke. Ọ bụ ezie na Jisọs agaghị ụlọ akwụkwọ ndị Juu, ka o sina dị, ọ bụ Onye Ozizi na-enweghị atụ. (Matiu 7:28, 29; 23:8; Jọn 13:13) O nyekwara ndị na-eso ụzọ ya ọrụ izi ihe, ọbụna ruo ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a. (Matiu 28:19, 20) Iji mee nke a ha aghaghị ịbụ ezi ndị nkụzi, n’ihi ya kwa ha ga-enwe mkpa ịnata ọzụzụ. Ya mere olee otú ezi ndị Kraịst kwesịrị isi lee agụmakwụkwọ anya taa? A ga-atụle ajụjụ nke a n’isiokwu na-esonụ.

      Ule Ncheta Ihe

      ◻ N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jide n’aka na Jehova nwere mmasị n’agụmakwụkwọ ndị na-ejere ya ozi?

      ◻ N’akụkụ dịgasị aṅaa ka usoro agụmakwụkwọ ndị Israel si dị iche na nke mba ndị ọzọ?

      ◻ Agụmakwụkwọ dị aṅaa ka ụmụaka ndị Israel nwetara?

      ◻ Ụzọ izi ihe ndị dị aṅaa ka e jiri mee ihe n’Israel?

      ◻ N’ihi gịnị ka Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya ji ghara ịga ụlọ akwụkwọ ndị Juu naenye ọzụzụ dị elu?

      [Foto dị na peeji nke 14]

      Agụmakwụkwọ a manyere amanye na Babilọn emeghị ka Daniel na ndị enyi ya gbakụta Jehova azụ

  • Agụmakwụkwọ nke Nwere Nzube
    Ụlọ Nche—1992 | Nọvemba 1
    • Agụmakwụkwọ nke Nwere Nzube

      “Mee ka onye ezi omume mara ihe, ọ ga-atụkwasị ihe mmụta n’amamihe ya.”—ILU 9:9.

      1. Gịnị ka Jehova na-atụ anya ya n’aka ndị na-ejere ya ozi banyere ihe ọmụma?

      JEHOVA bụ “Chineke nke ọmụma ihe.” (1 Samuel 2:3) Ọ na-akụziri ndị na-ejere ya ozi akwụkwọ. Mosis buru amụma na ndị dị iche iche n’oge ahụ ga-ekwu banyere Israel, sị: “Ndị maara ihe na ndị nwere nghọta ka mba ukwu a bụ.” (Deuterọnọmi 4:6) Ezi ndị Kraịst kwesịrị n’otu aka ahụ ịma ihe. Ọ dị ha mkpa ịbụ ezi ndị mmụta nke Okwu Chineke. Iji gosi nzube nke ihe ọmụmụ dị otú ahụ, Pọl onyeozi dere, sị: “Anyị ewepụghị aka n’ikpe ekpere na ịrịọ arịrịọ n’ihi unu, ka e wee mee ka unu jupụta ná mmazu nke ihe ọ na-achọ n’ime amamihe na nghọta nile nke mmụọ nsọ, ka unu jegharịa n’ụzọ kwesịrị Onyenwe anyị ime otú ọ ga-atọ ya ụtọ n’ụzọ nile nile, na-amị mkpụrụ n’ezi ọrụ nile ọ bụla, na-abakwa ụba n’ime mmazụ nke Chineke.”—Ndị Kọlọsi 1:9, 10.

      2. (a) Gịnị dị mkpa iji nweta ezi ihe ọmụma nke Chineke? (b) Olee otú Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova siworo lee okwu a anya?

      2 Ịmụ ihe na-eburu inweta ezi ihe ọmụma nke Chineke na nzube ya nile n’uche chọrọ ma ọ dịghị ihe ọzọ, ọ̀tụ̀tụ̀ dịkarịsịrị ala nke agụmakwụkwọ. Ma ọtụtụ ndị mụtaworo eziokwu nke Okwu Chineke bi ná mba dị iche iche ebe a na-enweghị ma ọ bụ ebe e nwere ohere dị nta iji nweta agụmakwụkwọ ụwa kwesịrị ekwesị. Ihe adabacharaghị ha. Iji merie nsogbu nke a, Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova ruo ọtụtụ afọ ugbu a enyewo ntụziaka ka a hazie ụlọ akwụkwọ ịmụ ka e si agụ na ka e si ede n’ime ọgbakọ dị iche iche, n’ebe ọ dị mkpa. N’ihe karịrị 30 afọ gara aga, akwụkwọ akụkọ ndị Brazil bụ́ Diário de Mogi bipụtara otu ihe odide isiokwu ya bụ “Ndịàmà Jehova Ebuso Amaghị Agụ na Amaghị Ede Agha.” O kwuru, sị: “Onye ozizi ruru eru na-amalite . . . iji ndidi kụziere ndị ọzọ ịgụ na ide ihe. . . . Ụmụ akwụkwọ, n’ihi ọnọdụ ndị na-arụgide ha dị ka ndị ozi Chineke, aghaghị ịzụlite ihe ọmụma ha n’asụsụ ha iji na-ekwu okwu n’ihu ọha.” E siwo otú a nyere ọtụtụ puku mmadụ gburugburu ụwa aka ịghọ ezi ndị mmụta nke Okwu Chineke. Ha bu nzube dị elu n’uche nara agụmakwụkwọ nke a bụ isi.

      Nkà Ndị A Chọrọ Iji Bụrụ Ndị Ozi Dị Irè

      3, 4. (a) N’ihi gịnị ka ezi ndị Kraịst ji nwee mmasị n’agụmakwụkwọ? (b) Gịnị bụ ọnọdụ dị n’Israel, agụmakwụkwọ bụ isi dị aṅaa ka a na-apụghị ilefuru anya n’ime ọgbakọ anyị nile taa?

      3 Ezi ndị Kraịst nwere mmasị n’agụmakwụkwọ, ọ bụghị nanị iji mara akwụkwọ, kama iji bụrụ ndị na-ejere Jehova ozi n’ụzọ dị irè karị. Kraịst nyere ndị Kraịst nile ọrụ nke ‘ime ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ, na-ezi ha ka ha debe ihe nile, ka ha hà, bụ nke m nyere n’iwu.’ (Matiu 28:19, 20) Iji zie ndị ọzọ ihe, ha onwe ha aghaghị ibu ụzọ mụọ ihe, nke a chọkwara ụzọ ndị dị mma isi na-enwe ọmụmụ ihe. Ha aghaghị inwe ikike nke iji nlezianya nyochaa Akwụkwọ Nsọ. (Ọrụ 17:11) Iji rụzuo ọrụ ha, ọ dịkwa ha mkpa inwe ike ịgụ ihe werewere.—Lee Habakuk 2:2; 1 Timoti 4:13.

      4 Dị ka anyị hụrụ n’isiokwu bu ụzọ, e nwere ezi ihe mere a ga-eji kwere na, n’ozuzu ha, ọbụna ụmụaka n’Israel oge ochie maara ka e si agụ na ka e si ede. (Ndị Ikpe 8:14; Aịsaịa 10:19) Ọ dị ndị ozi bụ́ ndị Kraịst taa mkpa ịdị na-edetu ihe n’ụzọ dị mma n’anya mgbe ha na-aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Ha na-ede akwụkwọ ozi, na-edetu ihe ná nzukọ dị iche iche, deekwa mkpirikpi ihe n’ihe ha na-amụ. Ihe a dum chọrọ aka akwụkwọ a pụrụ ịgụta agụta. Ime ndekọ n’ọgbakọ ndị Kraịst chọrọ ma ọ dịkarịa ala, ihe ọmụma bụ isi nke nkà mgbakọ na mwepụ.

      Uru Ndị Dị n’Ọmụmụ Akwụkwọ Kwesịrị Ekwesị

      5. (a) Gịnị bụ mmalite nke okwu ahụ bụ́ “ụlọ akwụkwọ”? (b) Ohere dị aṅaa ka ndị na-eto eto kwesịrị iji mee ihe?

      5 Ọ dị mma ịmara na okwu ahụ bụ “ụlọ akwụkwọ” sitere n’okwu Grik bụ skho·leʹ, nke pụtara na mbụ “ntụrụndụ” ma ọ bụ iji oge ntụrụndụ mee ihe ọzọ dị mkpa, dị ka ịmụ ihe. E mesịrị jiri ya na-akọwa ebe a nọ na-enwe ọmụmụ ihe dị otú ahụ. Nke a na-egosi na, n’otu oge, nanị ndị ihe dabaara—na Gris na n’ihe ka ọtụtụ n’ala ndị ọzọ—nwere oge iji mụọ ihe. Ìgwè ndị na-arụ ọrụ na-anọgidekarị n’ìsì. Taa, n’ihe ka n’ọtụtụ mba karị a na-enye ụmụntakịrị na ndị na-eto eto oge iji mụọ ihe. Ndịàmà na-eto eto kwesịrị nnọọ ịzụchapụta oge dị mma iji nweta ihe ọmụma ma bụrụ ndị dị irè na-ejere Jehova ozi.—Ndị Efesọs 5:15, 16.

      6, 7. (a) Olee uru ụfọdụ nke ọmụmụ akwụkwọ kwesịrị ekwesị? (b) N’ụzọ ndị dị aṅaa ka ịmụ asụsụ ndị ọzọ pụrụ isi baa uru? (ch) Gịnị bụ ọnọdụ e nwere taa n’etiti ọtụtụ ndị na-eto eto mgbe ha gụsịrị akwụkwọ?

      6 Ihe ọmụma bụ isi nke akụkọ ihe mere eme, ọdịdị ụwa, nkà sayensị, na ihe ndị ọzọ ga-enyere Ndịàmà na-eto eto aka ịbụ ndị ozi nwere ihe ọmụma n’akụkụ nile. Ọmụmụ akwụkwọ ha ga-akụziri ha ọ bụghị nanị ọtụtụ ihe ọmụmụ kamakwa usoro ịmụ ihe. Ezi ndị Kraịst adịghị akwụsị ịmụ ihe na ọmụmụ ihe mgbe ha hapụrụ ụlọ akwụkwọ. Otú ọ dị, ihe ha nwetara n’ọmụmụ ihe ha ga-adabere n’ebe ọ dị ukwuu na ha ịma otú e si enwe ọmụmụ ihe. Ma ọmụmụ akwụkwọ ụwa ma nke ọgbakọ pụrụ inyere ha aka iwulite izuzu ha nile. (Ilu 5:1, 2) Mgbe ha gụrụ ihe, ha ga-enwe ike karị ịghọta ihe dị mkpa, ihe kwesịrị ka a rịba ama ma buru ya n’isi.

      7 Dị ka ihe atụ, ịmụ asụsụ mba ọzọ abụghị nanị na ọ ga-ewulite ikike ụbụrụ nke ndị na-eto eto kamakwa ọ ga-eme ka ha baara nzukọ Jehova uru karị. N’alaka ụlọ ọrụ ụfọdụ nke Watch Tower Society, ọtụtụ ụmụnna ndị na-eto eto ahụwo ya dị ka ihe bara uru inwe ike ịsụ ma ọ bụ ịgụ Bekee nke ọma. Ọzọkwa, ndị ozi nile bụ ndị Kraịst kwesịrị ịgbalịsi ike inwe nkà n’ịsụ asụsụ obodo ha. Ozi ọma nke Alaeze kwesịrị ka e kwupụta ya n’ụtọ asụsụ doro anya nke ziri ezi. Ihe ndị mere eme na-egosi na n’ụwa taa mgbe ọtụtụ ndị na-eto eto gụsịrị akwụkwọ, ha ka na-enwe ihe isi ike n’ide na ịgụ ihe nke ọma na ịrụ mgbakọ na mwepụ kasị dị mfe; ha nwekwara ihe ọmụma na-edoghị anya ma ọlị nke akụkọ ihe mere eme na ọdịdị ụwa.

      Agụmakwụkwọ zuru Ezu

      8. Akụkụ akwụkwọ nsọ ndị dị aṅaa na-emetụta isiokwu nke agụmakwụkwọ ụwa na ikike mmadụ nwere ịkwado onwe ya?

      8 Ya mere, nke a yiri ka ọ bụ oge kwesịrị ekwesị ịtụle àgwà onye Kraịst n’ebe agụmakwụkwọ ụwa dị. Olee ụkpụrụ Bible ndị metụtara isiokwu a? Nke mbụ, n’ihe ka n’ọtụtụ na mba nile, ido onwe n’okpuru “Siza” n’ụzọ kwesịrị ekwesị na-achọ ka ndị nne na nna bụ ndị Kraịst zigaa ụmụ ha ụlọ akwụkwọ. (Mak 12:17; Taịtọs 3:1) Nye Ndịàmà na-eto eto, n’ọrụ ụlọ akwụkwọ ha ha kwesịrị icheta Ndị Kọlọsi 3:23, nke na-asị: “Ihe ọ bụla unu na-eme, na-arụnụ ọrụ site ná mkpụrụ obi unu, dị ka unu na-arụrụ Onyenwe anyị ọrụ, ọ bụghịkwa mmadụ.” Ụkpụrụ nke abụọ o metụtara bụ ndị Kraịst kwesịrị inwe ike ịkwado onwe ha, ọbụna ma ọ bụrụ na ha bụ ndị ozi ọsụ ụzọ oge nile. (2 Ndị Tesalọnaịka 3:10-12) Ọ bụrụ na ọ lụrụ nwunye, nwoke kwesịrị inwe ike inyezu nwunye ya na ụmụ ọ bụla a pụrụ ịmụta ihe na-akpa ha n’ụzọ ziri ezi, nweekwa ụfọ ihe dị nta inye ndị nọ ná mkpa na iji kwadoo ọrụ nkwusa a na-eme n’ógbè ya na gburugburu ụwa.—Ndị Efesọs 4:28; 1 Timoti 5:8.

      9, 10. (a) Gịnị yiri ka ọ bụ ihe na-eme n’ọtụtụ mba? (b) Gịnị ka onye ozi ọsụ ụzọ pụrụ ile anya dị ka ụgwọ zuru ezu?

      9 Agụmakwụkwọ hà aṅaa dị onye Kraịst na-eto eto mkpa iji kwanyere ụkpụrụ ndị a nke Bible ùgwù ma na-emezu ibu ọrụ ndị Kraịst dịịrị ya? Nke a na-adị iche site ná mba ruo ná mba. Otú ọ dị, n’ozuzu ya, o yiri ka otú ihe dum si aga n’ọtụtụ mba bụ na ọ̀tụ̀tụ̀ agụmakwụkwọ a chọrọ iji na-enweta ụgwọ ọrụ dị mma dị elu ugbu a karịa ka ọ dị n’afọ ole na ole gara aga. Akụkọ ndị a natara site n’alaka ụlọ ọrụ dị iche iche nke Watch Tower Society n’akụkụ dị iche iche nke ụwa na-egosi na n’ọtụtụ ebe o siri ike inweta ọrụ na-akwụ ụgwọ dị mma mgbe e nwesịrị nanị ọmụmụ akwụkwọ iwu chọrọ ma ọ bụ ná mba ụfọdụ ọbụna mgbe a gụsịrị akwụkwọ sekọndrị ma ọ bụ kọleji.

      10 Gịnị ka “ụgwọ dị mma” pụtara? Ọ dịghị apụta ọrụ ndị na-akwụ ụgwọ dị elu. Akwụkwọ ọkọwa okwu bụ́ Webster’s Dictionary na-akọwa “dị mma” n’ọnọdụ a dị ka “zuru ezu, afọ ojuju.” Gịnị ka a pụrụ ịkpọ nke “zuru ezu,” dị ka ihe atụ, maka ndị chọrọ ịbụ ndị ozi ọsụ ụzọ nke ozi ọma? Ndị dị otú ahụ n’ozuzu ha na-enwe mkpa maka ọrụ nwa oge iji zere itinye “ibogbu” ụmụnna ha ma ọ bụ ezinụlọ ha n’ibu arọ. (1 Tesalọnaịka 2:9) A pụrụ ịkpọ ụgwọ ha na-enweta nke “zuru ezu,” ma ọ bụ na-enye “afọ ojuju,” ma ọ bụrụ na ụgwọ ha na-enweta na-enye ha ohere ibi ndụ dị mma ma na-enyekwa ha oge zuru ezu na ume ijezu ozi ndị Kraịst ha.

      11. N’ihi gịnị ka ụfọdụ ndị na-eto eto jiworo hapụ ozi ọsụ ụzọ, ajụjụ dị aṅaa ka a na-ajụkwa?

      11 Gịnị na-abụkarị ọnọdụ e nwere taa? A kọwo na ná mba ụfọdụ ọtụtụ ndị na-eto eto nwere ezi nzube ahapụwo ụlọ akwụkwọ mgbe ha nwetasịrị ọmụmụ akwụkwọ dịkarịsịrị ala a chọrọ iji bụrụ ndị ọsụ ụzọ. Ha amụghị ọrụ ọ bụla ma ọ bụ nwee iru eru ọ bụla nke ụwa. Ọ bụrụ na ndị mụrụ ha enyereghị ha aka, ọ ga-adị ha mkpa ịchọta ọrụ nwa oge. Ọ dịwo ụfọdụ mkpa ịnakwere ọrụ ndị na-achọ ka a rụọ ọrụ ogologo oge nke ukwuu iji nweta ego ga-ezu iji bie ndụ. Site n’ike ọgwụgwụ n’anụ ahụ, ha kwụsịrị ozi ọsụ ụzọ. Gịnị ka ndị dị otú ahụ pụrụ ime iji kwadoo onwe ha wee banyeghachi n’ozi ọsụ ụzọ?

      Echiche Ziri Ezi Banyere Agụmakwụkwọ

      12. (a) Banyere agụmakwụkwọ, echiche abụọ dị aṅaa gabigara ókè ka onye Kraịst ga-ezere? (b) Maka ndị raara onwe ha nye na-ejere Jehova ozi na ụmụ ha, nzube dị aṅaa ka agụmakwụkwọ gaemezu?

      12 Echiche ziri ezi banyere agụmakwụkwọ pụrụ inye aka. Nye ọtụtụ ndị ụwa na-eto eto, agụmakwụkwọ bụ akara ọkwá mmadụ, ihe ga-enyere ha aka ịgbago n’ọkwá n’etiti ọha mmadụ, ụzọ isi bie ndụ ihe ịga nke ọma, nke ịhụ ihe onwunwe n’anya. Nye ndị ọzọ, ọmụmụ akwụkwọ bụ ọrụ a ga-ahapụ ngwa ngwa o kwere omume. Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime echiche ndị a ziri ezi nye ezi onye Kraịst. Mgbe ahụ, gịnị ka a pụrụ ile anya dị ka “echiche ziri ezi”? Ndị Kraịst kwesịrị ile agụmakwụkwọ anya dị ka ihe e ji enweta ihe. N’ụbọchị ikpeazụ ndị a, nzube ha bụ ijere Jehova ozi ruo otù o kwere omume na n’ụzọ dị irè. Ọ bụrụ na ná mba ha bi, agụmakwụkwọ dịkarịsịrị ala ma ọ bụ ọbụna nke kọleji ga-enye ha ohere ịchọta nanị ọrụ ga-enye ụgwọ na-ezughị ezu iji kwadoo onwe ha dị ka ndị ọsụ ụzọ, mgbe ahụ a pụrụ ịtụle inwekwu agụmakwụkwọ ma ọ bụ ọzụzụ ọzọ. Nke a ga-abụ n’ihi otu ihe mgbaru ọsọ kpọmkwem nke ozi oge nile.

      13. (a) Olee otú otu nwanna nwanyị na Philippines siworo nwee ike ịga n’ihu n’ozi ọsụ ụzọ ya ka ọ na-arụzu ọrụ ezinụlọ ndị dịịrị ya? (b) Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa kwesịrị n’oge a?

      13 Ụfọdụ anarawo ọzụzụ ndị meghepụrụ ohere ọrụ ndị na-enyere ha aka ikere òkè ma ọ bụ ịmaliteghachi ozi oge nile. Otu nwanna nwanyị na Philippines bụ ya na-enye ezinụlọ ya nri, ma ọ chọrọ ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ. Alaka ụlọ ọrụ dị ebe ahụ na-akọ, sị: “O nwewo ike ime nke a n’ihi na ọ natakwuru agụmakwụkwọ iji ruo eru dị ka onye gọọmenti nyere nkwado ime ndekọ ego.” Otu akụkọ alaka ụlọ ọrụ ahụ na-asị: “Anyị nwere ọtụtụ ndị na-aga akwụkwọ ma n’otu oge ahụ nweekwa ike ịhazi ihe omume ha iji rụọ ọrụ ọsụ ụzọ. N’ozuzu ha, ha aghọwo ndị nkwusa ka mma ebe ha na-adị uchu karị n’ịmụ ihe, ọ bụrụhaala na ha enwebigaghị echiche okomoko ókè ná nchụso ihe ụwa.” Ahịrị ikpeazụ kwesịrị inye anyị ihe anyị ga-atụgharị uche banyere ya. A gaghị echefu mgbe ọ bụla nzube nke ịnarakwu ọmụmụ akwụkwọ ahụ, n’ebe nke a dị mkpa, ma ọ bụ gbanwee ya ịghọ ihe mgbaru ọsọ nke ịhụ ihe onwunwe n’anya.

      14, 15. (a) N’ihi gịnị ka a na-ekwesịghị iti iwu ọ bụla banyere agụmakwụkwọ? (b) Agụmakwụkwọ ụwa dị aṅaa ka ụfọdụ ụmụnna nwere ezi uche natara, ma gịnị kwụworo ụgwọ maka nke a?

      14 Ná mba ole na ole, ụlọ akwụkwọ kọleji na-enye ọzụzụ nkà ọrụ ndị pụrụ ịkwadebe onye Kraịst na-eto eto maka nkà ma ọ bụ ọrụ ụfọdụ mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ. Ọbụna mgbe ọ na-adịghị otú a, n’ala ụfọdụ, ndị na-eto eto na-agba mbọ bụ́ ndị nwetara nanị ọmụmụ akwụkwọ bụ isi na-enweta ọrụ nwa oge nke na-enyere ha aka inweta ụgwọ ọrụ zuru ezu iji rụọ ọrụ ọsụ ụzọ. Ya mere, e kwesịghị iti iwu ọ bụla ná nkwado ma ọ bụ imegide inwetakwu agụmakwụkwọ.

      15 Ọtụtụ ndị na-eje ozi ugbu a n’ọnọdụ nlekọta dị iche iche dị ka ndị nlekọta na-agagharị agagharị, n’isi ụlọ ọrụ Society, ma ọ bụ n’otu alaka ụlọ ọrụ ya nwere nanị agụmakwụkwọ bụ isi. Ha bụ ndị ọsụ ụzọ kwesịrị ntụkwasị obi, na-adịghị mgbe ha kwụsịrị ịmụ ihe, nata ọzụzụ, e nyewokwa ha ibu ọrụ ndị ka ukwuu. Ha adịghị akwa ụta ọ bụla. N’aka nke ọzọ, ụfọdụ ndị ibe ha họọrọ agụmakwụkwọ mahadum ma dapụ, bụrụ ndị nkà ihe ọmụma ụwa nke na-ebibi okwukwe na “amamihe nke ụwa” kpuru ihu.—1 Ndị Kọrint 1:19-21; 3:19, 20; Ndị Kọlọsi 2:8.

      Ịgụkọ Ihe Ọ Ga-efu

      16. (a) Ònye na-ekpebi ma e nwere mkpa inwetakwu agụmakwụkwọ, gịnị ka e kwesịrị iburu n’uche karịsịa? (b) Gịnị ka e kwesịrị ịtụle?

      16 Ònye na-ekpebi ma onye Kraịst na-eto eto ọ̀ ga-anarakwu agụmakwụkwọ ma ọ bụ ọzụzụ? Ụkpụrụ Bible nke ịbụ isi na-abata n’ebe a. (1 Ndị Kọrint 11:3; Ndị Efesọs 6:1) N’ihi nke a, ndị nne na nna ga-achọ inye ụmụ ha nduzi ná nhọrọ nke ọrụ ma ọ bụ nkà, si otú a nye nduzi n’okere agụmakwụkwọ ga-adị mkpa. N’ọtụtụ mba, a na-eme nhọrọ agụmakwụkwọ na ọrụ n’oge mgbe a nọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndarị. Nke ahụ bụ oge mgbe ọ dị ndị nne na nna bụ́ ndị Kraịst na ndị ntorobịa mkpa ịchọ nduzi Jehova n’ime nhọrọ amamihe dị na ya, na-eburu ọdịmma Alaeze n’uche karịsịa. Ndị na-eto eto na-enwe mmasị na ikike nghọta ihe dị iche iche. Ndị nne na nna nwere amamihe ga-echebara ndị a echiche. Ọrụ ọ bụla e ji ime ihe n’eziokwu na-arụ dị nsọpụrụ, ọ sọ ya bụrụ ọrụ ọfịs ma ọ bụ nke ájá ájá. Ọ bụ ezie na ụwa pụrụ ịdị na-ebuli ọrụ ọfịs elu ma na-elelị mmadụ iji aka ya na-arụsi ọrụ ike anya, Bible adịghị eme otú ahụ. (Ọrụ 18:3) Ya mere mgbe ndị nne na nna na ndị Kraịst na-eto eto taa, ma ha jirisịa nlezianya na ekpere tụlee uru na ọghọm nile, kwadoo ma ọ bụ megide ịgụkwu akwụkwọ mgbe a gasịrị sekọndrị, ndị ọzọ n’ọgbakọ ekwesịghị ịkatọ ha.

      17. Nhọrọ dị aṅaa ka nne na nna ụfọdụ bụ Ndịàmà mewooro ụmụ ha?

      17 Ọ bụrụ na nne na nna bụ́ ndị Kraịst ejiri ezi uche kpebie ime ka ụmụ ha gụkwuo akwụkwọ ma ha gasịa kọleji, nke ahụ bụ okwu aka ha. Oge ọmụmụ ihe ndị a ga-enwe ga-adị ịche iche na-adabere n’ụdị ọrụ ma ọ bụ nkà a họọrọ. N’ihi okwu ego na iji nyere ụmụ ha aka ịbanye n’ozi oge nile ngwa ngwa dị ka o kwere mee, ọtụtụ ndị nne na nna bụ́ ndị Kraịst ahọrọwo usoro ọmụmụ ihe ndị na-adịghị ewe ogologo oge ná nkà ọrụ ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ ndị na-akụzi ịkwa nkà. N’ọnọdụ ụfọdụ ọ dịwo mkpa ndị ntorobịa ịmụ ọrụ n’aka onye ọzọ n’otu nkà ma ọ na-abụ mgbe nile n’inwe itinye ndụ zuru ezu n’ozi Jehova dị ka ihe mgbaru ọsọ.

      18. Ọ bụrụ na a narakwuo ọmụmụ akwụkwọ, gịnị ka e kwesịrị iburu n’uche?

      18 Ọ bụrụ na a narakwuo ọmụmụ akwụkwọ, n’ezie ebumnuche ya ekwesịghị ịbụ ịka ndị ọzọ mara akwụkwọ ma ọ bụ ịdọlị inweta ọrụ ụwa e ji eme okomoko. E kwesịrị iji nlezianya họrọ ihe a na-amụ. Magazin nke a emesiwo ihe ize ndụ nke ọmụmụ ihe dị elu ike, ọ bụkwa ezi ihe kpatara ya, n’ihi na ihe ka n’agụmakwụkwọ dị elu e nwere na-emegide “ozizi ahụ nke na-enye ezi ndụ” nke Bible. (Taịtọs 2:1; 1 Timoti 6:20, 21) Ọzọkwa, kemgbe afọ ndị 1960, ọtụtụ ụlọ akwụkwọ nke ịgụkwu akwụkwọ aghọwo ebe mmebi iwu na omume rụrụ arụ na-ewu ewu. “Ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” ekwugidewo n’ụzọ siri ike ịbanye n’ógbè dị otú ahụ. (Matiu 24:12, 45) Otú ọ dị, anyị aghaghị ịnakwere na n’oge ndị a, ndị na-eto eto na-ezute otu ihe ize ndụ ndị a n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị na kọleji ndị na-akụzi ọrụ aka na ọbụna n’ụlọ ọrụ.—1 Jọn 5:19.a

      19. (a) Nlezianya dị aṅaa ka ndị kpebiri ịnwetakwu agụmakwụkwọ kwesịrị ilezi? (b) Olee otú ụfọdụ siworo jiri agụmakwụkwọ ha mee ihe bara uru?

      19 Ọ bụrụ na e kpebie inwetakwu agụmakwụkwọ, Onyeàmà na-eto eto ga-eme nke ọma ịnara nke a n’ebe obibi ya, ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe omume ma ọlị, si otú a naenwe ike ijigide àgwà ọmụmụ ihe ndị Kraịst na-ejikarị eme ihe, ịga nzukọ, na ọrụ nkwusa. Ná mmalite e kwesịrị iwere nguzo kwesịrị ekwesị n’ụkpụrụ nile nke Bible. E kwesịrị icheta na Daniel na ndị enyi ya atọ bụ́ ndị Hibru bụ ndị a dọọrọ n’agha laa mba ọzọ mgbe e nyere ha iwu ịgụkwu akwụkwọ na Babilọn, ma ha nọgidere na-ejigide iguzosi ike n’ezi ihe ha. (Daniel, isi nke 1) Ka ha na-edebe ọdịmma ime mmụọ n’ọnọdụ mbụ, Ndịàmà na-eto eto n’ọtụtụ mba anarawo ọmụmụ ihe dị iche iche iji kwadebe onwe ha maka ọrụ nwa oge dị ka ndị ndekọ ego, ndị nkà ọrụ, ndị nkụzi, ndị nsụgharị, ndị ntụgharị okwu ma ọ bụ n’ọrụ ọzọ nke ga-akwado ha nke n’ụzọ zuru ezu n’ọrụ ha bụ isi nke bụ ọrụ ọsụ ụzọ. (Matiu 6:33) Ọtụtụ ndị ntorobịa ndị a emesịwo bụrụ ndị nlekọta na-agagharị agagharị ma ọ bụ ndị ọrụ afọ ofufo na Betel.

      Ndị Maara Akwụkwọ, Dị n’Otu

      20. Nkewa dị aṅaa n’ụwa bụ nke na-enweghị ọnọdụ n’etiti ndị Jehova?

      20 N’etiti ndị Jehova, ma ọrụ mmadụ ọ̀ bụ nke ọfịs, nke ájá ájá, ọrụ ugbo, ma ọ bụ ijere ndị ọzọ ozi, ọ dị mmadụ nile mkpa ịbụ ezi ndị mmụta nke Bible na ndị nkụzi dị irè. Nkà mmadụ nile nwetara n’ịgụ ihe, ịmụ ihe, na ịkụzi ihe na-ewepụ nkewa nke ụwa na-eme n’etiti ndị ọrụ ọkpụkpụ aka na ndị ọfịs. Nke a na-akpata ịdị n’otu na nkwanyerịta ùgwù nke a na-ahụ karịsịa n’etiti ndị ọrụ afọ ofufo n’ezinụlọ Betel nile na n’ebe Watch Tower Society na-ewu ihe owuwu, ebe àgwà ime mmụọ dị iche iche bụ ihe kasị mkpa na nke a chọrọ n’aka onye ọ bụla. N’ebe a, ndị ọrụ ọfịs nweworo ahụmahụ ji ọṅụ soro ndị ọrụ ọkpụkpụ aka nwere nkà na-arụkọ ọrụ, ha nile na-egosipụta mmasị ịhụnanya otu onye n’ebe ibe ya nọ.—Jọn 13:34, 35; Ndị Filipaị 2:1-4.

      21. Gịnị kwesịrị ịbụ ebumnuche ndị Kraịst na-eto eto?

      21 Ndị nne na nna, duzienụ ụmụ unu gaa n’ihe mgbaru ọsọ nke ịbụ ndị bara uru so n’òtù ụwa ọhụrụ ahụ! Ndị Kraịst na-eto eto, jirinụ ohere agụmakwụkwọ ndị unu nwere mee ihe dị ka ihe iji kwadebe onwe unu maka ijidekwu ihe ùgwù unu nke ijere Jehova ozi n’ụzọ zuru ezu karị! Dị ka ndị e ziri ihe, ka unu nile nwapụta ịbụ ndị òtù a kwadebere nke ọma nke òtù ụmụ mmadụ nke ọchịchị Chineke ma ugbu a ma ruo mgbe ebighị ebi ‘n’ime “ụwa ọhụrụ” Chineke kwere ná nkwa.—2 Pita 3:13; Aịsaịa 50:4; 54:13; 1 Ndị Kọrint 2:13.

      [Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

      a Leekwa Ụlọ Nche nke March 1, 1976, peji nke 158-160.

      Nwalee Ike Ncheta Gị

      ◻ N’ihi gịnị ka ezi ndị Kraịst ji nwee mmasị n’agụmakwụkwọ?

      ◻ Echiche ndị gabigara ókè dị aṅaa banyere agụmakwụkwọ ka ezi ndị Kraịst ga-ezere?

      ◻ Ihe ize ndụ dị aṅaa nke inwetakwu agụmakwụkwọ ka e kwesịrị ichebara echiche, nlezianya dị aṅaa ka e kwesịkwara inwe?

      ◻ Nkewa dị aṅaa n’ụwa bụ nke na-enweghị ọnọdụ n’etiti ndị Jehova?

      [Foto dị na peeji nke 16]

      Site n’ịdị uchu n’ịmụ ihe, ndị Kraịst na-eto eto pụrụ ịbụ ndị bara uru karị so n’òtù ụwa ọhụrụ ahụ

      [Foto dị na peeji nke 19]

      Ịnarakwu agụmakwụkwọ, ma a họrọ ya, kwesịrị ịbụ nke ọchịchọ ijere Jehova ozi n’ụzọ ka mma kpaliri

  • Nwoke nke Gụrụ Akwụkwọ
    Ụlọ Nche—1992 | Nọvemba 1
    • Nwoke nke Gụrụ Akwụkwọ

      “LEENỤ ọkpụkpọ unu, ụmụnna m, na ọ dịghị ọtụtụ ndị maara ihe dị ka anụ ahụ si mara ihe, ọ dịghị ọtụtụ ndị ike, ọ dịghị ọtụtụ ndị a mazuuru aha ha, ka a kpọrọ.” (1 Ndị Kọrint 1:26) Dị ka okwu ndị a na-egosi, e nwere ihe ize ndụ dị n’ịbami abami n’amamihe ụwa ma ọ bụ inwe ọkwá dị elu n’etiti ọha mmadụ. Ihe ndị dị otú ahụ pụrụ ịbụ ihe ndọghachi azụ ná mmadụ ịnakwere ozi ọma.—Ilu 16:5; Mak 10:25.

      Ka o sina dị, n’ụbọchị Pọl, ụfọdụ ndị maara ihe n’ụzọ anụ ahụ nakweere eziokwu, otu n’ime ha bụkwa Pọl n’onwe ya. Dị ka onye gụrụ akwụkwọ nke ọma na onye o yiri ka o si n’ezinụlọ a ma ama, Pọl bụ onye nkwusa ozi ọma na-anụ ọkụ n’obi. O si otú a gosi na ndị ihe gaziiri n’ụwa nke a pụrụ ijere Jehova ozi ma ọ bụrụ na obi ha ziri ezi. Ha pụrụ ọbụna iji ikike ụwa ndị ha nwere mee ihe n’ozi Jehova.—Luk 16:9.

      Onye Tasọs

      A mụrụ Pọl na Tasọs, ‘obodo a maara aha ya,’ dị ka o mesịrị kọwaa ya. (Ọrụ 21:39) Ma eleghị anya ọ bụ n’ebe ahụ ka ọ nọ mụta asụsụ dị iche iche—karịsịa bụrụ ọkà na Grik—bụ́ nke bara oké uru n’ọrụ ije ozi ala ọzọ ya. Ndụ na Tasọs gaara ekpughewo Pọl ọ bụghị nye nanị ụzọ ndị Juu kamakwa nye ọdịnala ndị Jentaịl, ahụmahụ nke o jiri mee ihe n’afọ ndị sochiri dị ka onyeozi nke mba ndị ọzọ. Ọ maara otú e si akọwapụta eziokwu ahụ n’ụzọ ha pụrụ ịghọta. (1 Ndị Kọrint 9:21) Dị ka ihe atụ, tụlee okwu ọ gwara ndị Atens nke a kọrọ n’Ọrụ Ndị Ozi, isi nke 17. N’ebe ahụ, o jiri nkà zoo aka n’okwu dị iche iche banyere okpukpe ndị Atens na ọbụna otu nhota okwu site n’otu onye ọbụ abụ ha ná nkwusa ya nke eziokwu.

      Nwa Amaala Rom

      Pọl nwere ihe ụwa ọzọ bara uru. Ọ bụ nwa amaala Rom, o jikwara nke a mee ihe iji gbasakwuo ozi ọma ahụ. Na Filipaị, e tiri ya na ndị so ya ihe ma tụọ ha mkpọrọ n’ekpeghị ha ikpe. Imeso nwa amaala Rom nke a megidere iwu, mgbe Pọl mekwara ka ndị isi mara eziokwu nke a, ha nyere ya ohere ịnọgide ma jeere ọgbakọ dị ebe ahụ ozi tupu ọ hapụ maka ebe ọzọ ọ na-aga.—Ọrụ 16:37-40.

      E mesịa, mgbe o guzo n’ihu Gọvanọ Festus, Pọl jiri ịbụ nwa amaala Rom ya mee ihe bara uru iji kpọkuo Siza. Otú a, o mere ngọpụ maka ozi ọma ahụ n’ihu onye ọchịchị kasị elu n’Alaeze Ukwu Rom.—Ọrụ 25:11, 12; Ndị Filipaị 1:7.

      Pọl nwetara ọzụzụ n’ụzọ ime ihe eme, bụ́ nke mesịrị baa uru. A kụziiri ya ịkpa ákwà ụlọikwuu, ma eleghị anya n’aka nna ya. N’ihi nke a, ọ pụrụ ịkwado onwe ya n’ije ozi ahụ mgbe ọ na-enweghị ego. (Ọrụ 18:1-3) O nwetakwara agụmakwụkwọ siri ike n’okpukpe. A zụlitere ya dị ka “onye Farisii, nwa ndị Farisii.” (Ọrụ 23:6) N’ezie, ọ mụrụ ihe n’ụkwụ Gameliel, otu n’ime ndị a kasị na-akwanyere ùgwù n’etiti ndị nkụzi ndị Juu. (Ọrụ 22:3) Agụmakwụkwọ dị otú ahụ, ma eleghị anya, nke a pụrụ iji tụnyere ezigbo agụmakwụkwọ mahadum n’oge a, na-enye echiche nke na ezinụlọ ya bụ nnọọ ndị a ma ama.

      Echiche Ziri Ezi

      Ntolite na ọzụzụ Pọl nwetara nyere ọdịnihu mara mma n’okpukpe ndị Juu. Ọ gaara enwewo ihe ịga nke ọma n’okpukpe ndị Juu. Otú ọ dị, ozugbo ọ nakweere na Jisọs bụ Mesaịa ahụ, ihe mgbaru ọsọ ndị Pọl nwere gbanwere. Mgbe ọ na-edegara ndị Filipaị akwụkwọ, o depụtara ihe ụwa ndị o ritere na mbụ wee sị: “Ihe ọ bụla nke baara m uru, ihe ndị a ka m gụrụ n’ihe iyi n’ihi Kraịst anyị. Ee, tụkwasịkwa, ana m agụkwa ihe nile n’ihe iyi n’ihi ọkịka nke ọmụma Kraịst Jisọs, bụ́ Onyenwe m.”—Ndị Filipaị 3:7, 8.

      Nwoke nke a gụrụ akwụkwọ eleghị anya n’azụ n’ụzọ inwe akpịrị maka ihe ọ gaara enwe ike iji agụmakwụkwọ ụwa ya mee; o jighịkwa “oké mmụta akwụkwọ” ya emere ndị ọzọ nganga. (Ọrụ 26:24; 1 Ndị Kọrint 2:1-4) Kama nke ahụ, site n’itinye okwukwe zuru ezu na Jehova Chineke, o zoro aka n’olileanya ndị o nwere na mbụ, sị: “Ebe m na-echezọ ihe nile dị n’azụ, na-esetịpụkwa aka n’ebe ihe nile dị n’ihu dị, ana m agbakwuru oké ịgba ọsọ ka m wee nata ihe mgbata n’ọsọ nke ọkpụkpọ dị elu nke Chineke n’ime Kraịst Jisọs.” (Ndị Filipaị 3:13, 14) Pọl jiri ihe ime mmụọ kpọrọ ihe.

      Ka o sina dị, Pọl jiri ọzụzụ mbụ ahụ o nwetara mee ihe n’ozi Jehova. Mgbe o kwuru banyere ndị Juu sị, “Ana m agbara ha àmà na ha na-anụ ọkụ n’obi n’ebe Chineke nọ,” o kwuru okwu site n’ahụmahụ onwe ya. (Ndị Rom 10:2) Dị ka onye Farisii n’ezie, o nwere ịnụ ọkụ n’obi n’ezie maka Chineke na maka Akwụkwọ Nsọ. Mgbe Pọl ghọsịrị onye Kraịst, a gwakọtara ịnụ ọkụ n’obi ya na ezi ihe ọmụma, ọ pụkwara iji agụmakwụkwọ o nwetara ná mmalite mee ihe maka nzube nke dị n’ezi omume. N’akwụkwọ Ndị Hibru, dị ka ihe atụ, o jiri oké ihe ọmụma ya nke akụkọ ihe mere eme ndị Israel na ofufe ụlọ nsọ gosipụta ọkaaka nke usoro ndị Kraịst.

      Taa ụfọdụ ndị maara ihe n’ụzọ anụ ahụ anarawokwa ozi ọma ahụ. Ndị nwere ụdị iru eru nile nke agụmakwụkwọ, nakwa ndị nọ n’ụdị ọrụ na nkà nile, anakwerewo eziokwu ahụ ma jiri ọzụzụ ha nwere na mbụ mee ihe n’ozi Jehova. Ka o sina dị, n’agbanyeghị ókè agụmakwụkwọ ụwa ha nwere na mbụ, ndị Kraịst adịghị echefu ma ọlị eziokwu ahụ bụ na iru eru ndị dị mkpa bụ ndị nke ime mmụọ. Ndị a bụ “ihe ndị ka mkpa” n’ihi na ha pụrụ iduga anyị ná ndụ ebighị ebi.—Ndị Filipaị 1:10.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya