Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbq isiokwu 52
  • Oleedị ihe Chineke bu n’obi kee anyị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Oleedị ihe Chineke bu n’obi kee anyị?
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Baịbụl kwuru
  • Gịnị Ka Chineke Bu n’Obi Kee Anyị?
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Ajụjụ nke Mbụ: Gịnị Mere I Ji Kee M?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Gịnị Na-eme Ka Ndụ Nwee Ezi Nzube?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Ị Ga-abụli Enyi Jehova
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
ijwbq isiokwu 52

Olee Ihe Chineke Bu n’Obi Kee Anyị?

Ihe Baịbụl kwuru

E nwere ụzọ ọzọ e nwekwara ike isi jụọ ajụjụ a. Dị ka ihe atụ, Gịnị ka Chineke chọrọ ka m jiri ndụ m mee?” Ihe Baịbụl kwuru na-egosi na ihe Chineke bu n’obi kee anyị bụ ka anyị na ya bụrụ enyi. Legodị ihe ndị a Baịbụl kwuru.

  • Ọ bụ Chineke kere anyị. Baịbụl kwuru, sị: “Ọ bụ [Chineke] kere anyị, ọ bụghị anyị kere onwe anyị.”​—Abụ Ọma 100:3; Mkpughe 4:11.

  • Chineke nwere ihe o bu n’obi kee ihe ọ bụla o kere. O nwekwara ihe o bu n’obi kee ụmụ mmadụ.​—Aịzaya 45:18.

  • Chineke kere anyị ka “mkpa ime mmụọ” na-akpa anyị. Otu ihe so ná mkpa ime mmụọ anyị bụ ịmata ihe mere Chineke ji kee anyị. (Matiu 5:3) Chineke chọkwara ka anyị mata ihe ahụ.​—Abụ Ọma 145:16.

  • Otu ihe anyị ga-eme iji gboo mkpa ime mmụọ anyị bụ imete Chineke enyi. Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ndị nwere ike iche na anyị agaghị emeteli Chineke enyi, ma Baịbụl na-agwa anyị, sị: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.”​—Jems 4:8; 2:23.

  • Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịbụ enyi Chineke, anyị ga-eme ihe ọ chọrọ ka anyị mee. Baịbụl gwara anyị ihe Chineke chọrọ ka anyị mee n’Ekliziastis 12:13. Ọ sịrị: “Tụọ egwu ezi Chineke, debekwa ihe o nyere n’iwu. N’ihi na ọ bụ ya bụ ọrụ dum dịịrị mmadụ.”

  • N’ọdịnihu, Chineke ga-ewepụ ahụhụ ma mee ka ndị enyi ya, ya bụ, ndị niile na-efe ya nweta ndụ ebighị ebi. N’oge ahụ, anyị ga-amatakwu ihe mere Chineke ji kee mmadụ.​—Abụ Ọma 37:10, 11.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya