Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lr isi 32 p. 167-171
  • Otú E Si Chebe Jizọs

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú E Si Chebe Jizọs
  • Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Na-agụ Kpakpando Abịa Leta Jizọs
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Jisọs na Ndị Na-agụ Kpakpando
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Ịgbanahụ Onye Ọchịchị Aka Ike
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Jehova Chebere Jizọs
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
lr isi 32 p. 167-171

ISI NKE 32

Otú E Si Chebe Jizọs

MGBE ụfọdụ Jehova na-eme ihe n’ụzọ dị ịtụnanya iji chebe ụmụaka nakwa ndị na-apụghị ichebe onwe ha. Ọ bụrụ na ị gaa mkpagharị n’ime ime obodo, ị pụrụ ịhụ otu ụzọ Jehova na-esi eme nke a. Ma, ná mmalite, i nwere ike ị gaghị aghọta n’ezie ihe na-emenụ.

Ị hụrụ otu nnụnụ ka o feere bịa bere n’ala n’ebe dị gị nso. Ọ dị ka ò merụrụ ahụ́. Mgbe ị chọrọ ịgaru ya nso, o jisiri ike megharịa nku ya wee gbapụ. Ka ị na-eso nnụnụ ahụ, ọ nọgidere na-agbanahụ gị. Mgbe ahụ, na mberede, nnụnụ ahụ fepụrụ. Ọ dịghị ihe ọ bụla mere ya na nku! Ị̀ ma ihe nnụnụ ahụ na-eme?—

N’akụkụ ebe ahụ nnụnụ ahụ fedatara n’ala n’ebe dị gị nso, ụmụ ya zoro n’ime ọhịa. Ụjọ ji nne nnụnụ ahụ na i nwere ike ịhụ ha ma merụọ ha ahụ́. N’ihi ya, o mere ka a ga-asị na o merụrụ ahụ́ wee rara gị pụọ. Ị̀ ma onye pụrụ ichebe anyị otú nne nnụnụ si echebe ụmụ ya?— N’ime Bible, e ji Jehova tụnyere nnụnụ a na-akpọ ugo, bụ́ nke na-enyere ụmụ ya aka.—Deuterọnọmi 32:11, 12.

[Foto dị na peeji nke 167]

Olee otú nne nnụnụ a si echebe ụmụ ya?

Nwa dịkarịsịrị oké ọnụ ahịa nke Jehova bụ Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya, bụ́ Jizọs. Mgbe Jizọs nọ n’eluigwe, ọ bụ mmụọ dị ike dịkwa ka Nna ya. Ọ pụrụ ilekọta onwe ya. Ma mgbe a mụrụ Jizọs dị ka nwa ọhụrụ n’ụwa, ọ pụghị ichebe onwe ya. Nchebe dị ya mkpa.

Iji mezuo uche Chineke maka ya n’ụwa, Jizọs aghaghị itolite ma ghọọ nwoke zuru okè, onye tozuru etozu. Otú ọ dị, Setan gbalịrị igbu Jizọs tupu nke ahụ emee. Mgbalị ndị e mere iji gbuo Jizọs mgbe ọ bụ nwata na ụzọ dị iche iche Jehova si chebe ya bụ akụkọ na-adọrọ mmasị. Ị̀ ga-achọ ịnụ ya?—

Ntakịrị oge mgbe a mụsịrị Jizọs, Setan mere ka ihe yiri kpakpando pụta na mbara igwe n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa. Ndị ikom a na-akpọ ndị na-agụ kpakpando, bụ́ ndị na-amụ kpakpando, sooro kpakpando ahụ gaa ọtụtụ narị kilomita ruo Jeruselem. N’ebe ahụ, ha jụrụ ajụjụ ebe a ga-amụ onye ahụ nke gaje ịbụ eze ndị Juu. Mgbe ha jụrụ ndị ikom maara ihe Bible kwuru banyere nke a, ha zara ha, sị: “Na Betlehem.”—Matiu 2:1-6.

[Foto dị na peeji nke 168]

Mgbe ndị a na-agụ kpakpando letasịrị Jizọs, olee ịdọ aka ná ntị Chineke nyere ha nke chebere Jizọs?

Mgbe Herọd, bụ́ eze ọjọọ nke nọ na Jeruselem, nụrụ banyere eze ọhụrụ a a mụrụ n’oge na-adịbeghị anya n’obodo Betlehem nke dị nso, ọ gwara ndị ahụ na-agụ kpakpando, sị: ‘Gaanụ chọta nwatakịrị ahụ, mgbe ahụ bịaghachinụ kọọrọ m.’ Ị̀ ma ihe mere Herọd ji chọọ ịma ebe a ga-achọta Jizọs?— Ọ bụ n’ihi na Herọd nwere anyaụfụ, ọ chọkwara igbu ya!

Olee otú Chineke si chebe Ọkpara ya?— Mgbe ndị ahụ na-agụ kpakpando chọtara Jizọs, ha nyere ya onyinye dị iche iche. Mgbe e mesịrị, Chineke dọrọ ndị ahụ na-agụ kpakpando aka ná ntị ná nrọ ka ha ghara ịgaghachi na nke Herọd. Ya mere, ha si ụzọ ọzọ lawa n’agaghachighị Jeruselem. Mgbe Herọd chọpụtara na ndị ahụ na-agụ kpakpando alaala, nnukwute iwe were ya. Ya mere, iji gbuo Jizọs, Herọd kwuru ka e gbuo ụmụ ọhụrụ nile na-erubeghị afọ abụọ nọ na Betlehem! Ma, tupu mgbe ahụ, a kpọrọwo Jizọs pụọ.

Ị̀ ma otú e si kpọpụ Jizọs?— Mgbe ndị ahụ na-agụ kpakpando lawara, Jehova dọrọ di Meri, bụ́ Josef, aka ná ntị ka o bilie gbaga Ijipt. O nweghị ihe Herọd, bụ́ ajọ mmadụ, ga-eme Jizọs n’ebe ahụ. Ọtụtụ afọ mgbe e mesịrị, mgbe Meri na Josef si Ijipt kpọrọ Jizọs laghachi, Chineke dọrọ Josef aka ná ntị ọzọ. Ọ gwara ya ná nrọ ka ọ kwaga Nazaret, bụ́ ebe ihe ọ bụla na-agaghị eme Jizọs.—Matiu 2:7-23.

[Foto dị na peeji nke 169]

Olee otú e si zọpụta obere nwa bụ́ Jizọs ọzọ?

Ị̀ hụrụ otú Jehova si chebe Ọkpara ya?— Ònye ka ị ga-asị na o yiri ụmụ nnụnụ ahụ nne ha zoro n’ime ọhịa ma ọ bụ na o yiri Jizọs mgbe ọ bụ obere nwa? Ọ̀ bụ na i yighị ha?— E nwere ndị chọkwara imerụ gị ahụ́. Ị̀ ma ndị ha bụ?—

Bible na-ekwu na Setan yiri ọdụm na-ebigbọ ebigbọ, nke chọrọ iri anyị. Dịkwa nnọọ ka ọdụm na-achọkarị ijide ụmụ obere anụmanụ, ọtụtụ mgbe Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya na-achọ ịnwụde ụmụaka. (1 Pita 5:8) Ma, Jehova ka Setan ike. Ọ pụrụ ichebe ụmụ ya ma ọ bụ mezie ihe ọjọọ ọ bụla Setan mere ha.

Ì chetara n’Isi nke 10 nke akwụkwọ a ihe Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya na-agbalị ime ka anyị mee?— Ee, ha na-agbalị ime ka anyị nwee ụdị mmekọahụ Chineke sịrị na o zighị ezi. Ma, olee ndị nanị kwesịrị ịdị na-enwe mmekọahụ?— Ee, ọ bụ mmadụ abụọ bụ́ nwoke na nwanyị, ndị toruworo ogo mmadụ, ndị bụ́ di na nwunye.

Otú ọ dị, ọ dị mwute ikwu na ụfọdụ ndị toro eto na-enwe mmasị ka ha na ụmụaka nwee mmekọahụ. Mgbe ha so ụmụaka nwee mmekọahụ, ụmụ okoro na ụmụaka ndị nwanyị pụrụ ịmalite ime ihe ọjọọ ndị ha mụtara site n’aka ndị a toworo eto. Ha na-amalitekwa iji akụkụ ahụ́ ha e ji enwe mmekọahụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Nke ahụ bụ ihe mere n’obodo Sọdọm, ogologo oge gara aga. Bible na-ekwu na ndị bi n’ebe ahụ, ‘ma okorobịa ma agadi,’ gbalịrị iso ndị ikom bịara ileta Lọt nwee mmekọahụ.—Jenesis 19:4, 5.

Ya mere, dị nnọọ ka nchebe dị Jizọs mkpa, otú ahụ ka ọ dịkwa mkpa ka e chebe gị pụọ n’aka ndị toworo eto—ọbụnakwa pụọ n’aka ụmụaka ndị ọzọ—ndị pụrụ ịgbalị ime ka gị na ha nwee mmekọahụ. Dị ka ha na-emekarị, ha ga na-eme nnọọ ka hà bụ ndị enyi gị. Ha pụrụ ọbụna ikwe nkwa inye gị ihe ma ọ bụrụ na i kwe ha nkwa na ị gaghị akọrọ ndị ọzọ ihe ha chọrọ ka gị na ha mee. Ma, ndị a na-achọ nanị ọdịmma ha dị ka Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya, ha na-achọkwa nanị obi ụtọ nke ha. Ha na-agbalịkwa inweta obi ụtọ a site n’iso ụmụaka na-enwe mmekọahụ. Nke a jọgburu onwe ya!

Ị̀ ma ihe ha nwere ike ime iji mee onwe ha obi ụtọ?— Ha pụrụ ịgbalị ịhịa gị aka n’akụkụ ahụ́ i ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwanyị. Ma ọ bụ, ha pụrụ ọbụna iwere akụkụ ahụ́ ha ji bụrụ nwoke ma ọ bụ ha ji bụrụ nwanyị na-echitụ na nke gị. Ma, i kwesịghị ikwe ma ọlị ka onye ọ bụla jiri amụ gị ma ọ bụ ọtụ gị na-egwuri egwú. Ọbụnadị nwanne gị ma ọ bụ nne gị ma ọ bụ nna gị. Akụkụ ahụ́ gị ndị a bụ nanị gị ka ha dịịrị.

[Foto dị na peeji nke 171]

Gịnị ka i kwesịrị ikwu ma ọ bụ mee ma ọ bụrụ na mmadụ anwaa imetụ gị aka n’ụzọ na-adịghị mma?

Olee otú ị pụrụ isi chebe ahụ́ gị pụọ n’aka ndị na-eme ụdị ihe ọjọọ a?— Nke mbụ, ekwela ka onye ọ bụla jiri akụkụ ahụ́ i ji bụrụ nwoke ma ọ bụ akụkụ ahụ́ i ji bụrụ nwanyị na-egwuri egwú. Ọ bụrụ na mmadụ anwaa ime ya, gwa ya n’olu dara ụda, n’ụzọ na-egosi na ị naghị egwu egwu, sị: “Kwụsị ya! Aga m akọrọ ndị ọzọ ihe ị na-eme m!” Ọ bụrụkwa na onye ahụ asị na ọ bụ gị mere ya ji na-eme ya, ekwela ihe onye ahụ kwuru. Ọ bụghị eziokwu. Gaa kọọrọ ya onye ọzọ, n’agbanyeghị onye onye ahụ na-eme gị ihe ahụ bụ! I kwesịrị ime otú ahụ, ọ bụrụgodị na ọ sị na ihe unu abụọ na-eme bụ ihe nzuzo nke ọ bụ nanị gị na ya ga-ama. Ọ bụrụgodị na onye ahụ ekwe nkwa inye gị onyinye ndị mara mma ma ọ bụ yie gị egwu, i kwesịrị isi n’ebe ọ nọ pụọ ma kọọrọ onye ọzọ ihe ọ na-eme gị.

Atụla egwu, kama kpachara anya. Mgbe ndị mụrụ gị dọrọ gị aka ná ntị banyere ndị mmadụ ma ọ bụ ebe ndị pụrụ ịdị ize ndụ nye gị, i kwesịrị ige ha ntị. Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, ị ga-eme ka onye ọjọọ ghara inwe ohere iji mee gị ihe ọjọọ ọ bụla.

Gụọ banyere ichebe onwe gị pụọ ná mmekọahụ na-ezighị ezi, na Jenesis 39:7-12; Ilu 4:14-16; 14:15, 16; 1 Ndị Kọrint 6:18; nakwa na 2 Pita 2:14.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya