ABỤ NKE 130
Na-agbaghara Ndị Ọzọ
Nke E Biri Ebi
1. Jehova jio-biọma
Si n’aka Jizọs hazie
K’a gbapụta ’madụ niile,
Kan-sogbu niile kwụsị.
Ọ bụrụ n’anyị chegharịa,
Rịọkwa ya k’ọ gbaghara,
Anyị ma n’ọ g’agbaghara
N’ihià-jà Jizọs chụrụ.
2. Anyị n’agbaghara
Ụmụnna mejọr’anyị,
Jehova g’agbaghar’anyị.
Ọ bụ Chi n’em’ebere.
Ha mejọọ, k’anyị n’edi ya.
Ebula iwe n’obi.
N’agbalị n’asọpụrụ ha,
Hụkwa ha niile n’anya.
3. K’anyị n’em’ebere.
K’anyị niile mụta ya.
Ọ g’eme k’anyị bụr’enyi.
Ọgbakọ g’adị n’udo.
Jehova hụr’anyị n’anya.
Anyị gbalịa ṅomie ya,
Ọ g’eme k’anyị si n’obi
Gbaghara ’madụ niile.
(Gụọkwa Mat. 6:12; Efe. 4:32; Kọl. 3:13.)