Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 2/1 p. 21-26
  • Tụkwasị Jehova na Okwu Ya Obi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Tụkwasị Jehova na Okwu Ya Obi
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Zere Ịtụkwasị Obi n’Amamihe Ụwa
  • Lụsoo Omume Inwe Obi Abụọ Ọgụ
  • Ịgbaso Nduzi Jehova n’Alụmdi na Nwunye
  • Ndị Ntorobịa—Ṅaanụ Ntị n’Okwu Chineke
  • Ndị Ntorobịa—Gịnị Ka Unu Na-achụso?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Ì Mewo Ka Eziokwu ahụ Bụrụ nke Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Ekwela Ka Inwe Obi Abụọ Bibie Okwukwe Gị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Otú Di na Nwunye Bụ́ Ndị Kraịst Ga-esi Na-ebi n’Udo
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 2/1 p. 21-26

Tụkwasị Jehova na Okwu Ya Obi

“Ndị maara aha Gị ga-atụkwasị Gị obi.”—ABỤ ỌMA 9:10.

1. N’ihi gịnị ka anyị ka pụrụ iji nwee ntụkwasị obi na Jehova na Okwu ya n’oge anyị?

N’ỤWA nke oge a, ọkpụkpọ òkù ahụ nke ịtụkwasị Chineke na Okwu ya, bụ́ Bible, obi pụrụ iyi ihe amamihe na-adịghị na ya na ihe na-enweghị isi. Ma, amamihe Chineke ka bụkwa eziokwu. Onye Okike nke nwoke na nwanyị bụ Onye Malitere alụmdi na nwunye na ezinụlọ, ọ makwaara mkpa anyị nile nke ọma karịa onye ọ bụla ọzọ. Dị nnọọ ka mkpa ndị bụ isi nke ụmụ mmadụ na-agbanwebeghị, otú a ka ụzọ ndị bụ isi nke isi gboo mkpa ndị ahụ na-agbanwebeghị. Ndụmọdụ Bible nke amamihe dị na ya, ọ bụ ezie na e dere ya ọtụtụ narị afọ gara aga, ka na-enye nduzi kasị mma maka ihe ịga nke ọma n’ịdị ndụ na n’ịgwọta nsogbu dị iche iche. Ịṅa ya ntị na-arụpụta obi ụtọ dị ukwuu—ọbụna n’ime ụwa wara anya, nke nkà mmụta sayensị nke anyị na-ebi n’ime ya!

2. (a) Mkpụrụ ọma dị aṅaa ka irubere iwu Chineke isi rụpụtaworo ná ndụ ndị Jehova? (b) Gịnị ọzọkwa ka Jehova na-ekwe ndị na-erubere ya na Okwu ya isi ná nkwa?

2 Ịtụkwasị Jehova obi na itinye ụkpụrụ nile nke Bible n’ọrụ na-eweta uru ndị pụtara ìhè kwa ụbọchị. A na-ahụ ihe àmà nke a ná ndụ nke ọtụtụ nde Ndịàmà Jehova n’ụwa nile bụ́ ndị nweworo nkweta siri ike na obi ike nke itinye ndụmọdụ Bible n’ọrụ. Nye ha, ịtụkwasị Onye Okike na Okwu ya obi aghọwo ihe e tinyere n’ebe kwesịrị ekwesị. (Abụ Ọma 9:9, 10) Irubere iwu nile nke Chineke isi emewo ka ha bụrụ ndị ka mma mgbe a bịara n’ihe banyere ịdị ọcha, ịkwụwa aka ọtọ, ịdị uchu, ịkwanyere ndụ na ihe onwunwe ndị ọzọ ùgwù, na imeru ihe n’ókè n’ihe oriri na ihe ọṅụṅụ. O dujewo n’ịhụnanya na ọzụzụ kwesịrị ekwesị n’ime ezinụlọ—inwe àgwà ilekọta ndị ọbịa, ndidi, ebere, na ịdị na-agbaghara—nakwa n’ọtụtụ ihe ndị ọzọ. Ruo n’ókè dị ukwuu ha enwewo ike izere mkpụrụ ọjọọ nke iwe, ịkpọasị, igbu ọchụ, anya ụfụ, egwu, umengwụ, mpako, ịgha ụgha, nkwutọ, ịkwa iko aghara aghara, na omume rụrụ arụ. (Abụ Ọma 32:10) Ma Chineke na-eme ihe karịrị nanị ikwe nkwa ezi ihe ịbịara ndị na-edebe iwu ya nile. Jisọs sịrị na ndị na-agbaso ụzọ ndị Kraịst ga-anata “[otu narị] ugbu a n’oge a, . . . nne, na ụmụ, na ubi, ha na nsogbu; [ha] ga-anatakwa ndụ ebighị ebi n’oge nke na-abịa.”—Mak 10:29, 30.

Zere Ịtụkwasị Obi n’Amamihe Ụwa

3. N’ịnọgide na-atụkwasị Jehova na Okwu ya obi, nsogbu ndị dị aṅaa na-eche ndị Kraịst ihu mgbe ụfọdụ?

3 Otu nsogbu ụmụ mmadụ na-ezughị okè nwere bụ na ha na-ewerekarị ihe Chineke chọrọ dị ka ihe na-adịchaghị mkpa ma ọ bụ na-echezọ ya. N’ụzọ dị mfe ha na-amalite iche na ha kasị mara ihe ma ọ bụ na amamihe sitere n’aka ndị nwere ọgụgụ isi nke ụwa nke a karịrị nke Chineke, na ọ dị ọhụrụ karị. Ndị ohu Chineke pụkwara ịzụlite àgwà a, ebe ha na-ebi n’ime ụwa a. N’ihi ya, n’ịgbatịpụ ọkpụkpọ òkù ịhụnanya ahụ ige ntị na ndụmọdụ ya, Nna anyị nke eluigwe na-agụnyekwa ịdọ aka ná ntị ndị kwesịrị ekwesị: “Nwa m, echezọla iwu m; ma ka obi gị chebe ihe nile m nyere n’iwu: n’ihi na ụbọchị ndụ nke dị ogologo, na ọtụtụ afọ nke ndụ, na udo, ka ha ga-atụkwasịrị gị. Tụkwasị Jehova obi gị nile, adaberekwala ná nghọta gị: n’ụzọ gị nile mara Ya, Ya onwe ya ga-emekwa ka okporo ụzọ gị nile zie ezie. Abụla onye maara ihe n’anya gị onwe gị; tụọ egwu Jehova, wee si n’ihe ọjọọ wezụga onwe gị.”—Ilu 3:1, 2, 5-7.

4. Ruo n’ókè ha aṅaa ka “amamihe nke ụwa nke a” gbasaruru, n’ihi gịnịkwa ka o ji bụrụ “ihe nzuzu n’ebe Chineke nọ”?

4 A pụrụ inweta amamihe ụwa a n’ụba, sitekwa n’ọtụtụ ebe. E nwere ọtụtụ ụlọ akwụkwọ, ‘ime ọtụtụ akwụkwọ enweghịkwa ọgwụgwụ.’ (Eklisiastis 12:12) Ugbu a ihe ahụ a kpọrọ ụzọ awara awara ihe ọmụma nke kọmputa na-ekwe nkwa inye ihe ọmụma a na-akparaghị ókè n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’isiokwu ọ bụla. Ma inwe ihe ọmụma a nile emeghị ka ụwa mara ihe karị ma ọ bụ gwọta nsogbu ya nile. Kama nke ahụ, ọnọdụ ụwa na-akawanye njọ kwa ụbọchị. N’ụzọ kwere nghọta, Bible na-agwa anyị na “amamihe nke ụwa nke a bụ ihe nzuzu n’ebe Chineke nọ.”—1 Ndị Kọrint 3:19, 20.

5. Ịdọ aka ná ntị ndị dị aṅaa ka Bible na-enye banyere “amamihe nke ụwa nke a”?

5 N’ụbọchị ikpeazụ ndị a, ọ bụ nnọọ ihe a ga-atụ anya ya na onye isi nduhie, Setan bụ́ Ekwensu, ga-enupụta ụgha dị ukwuu ná mgbalị ime ka a ghara ịtụkwasị obi n’ịbụ eziokwu nke Bible. Ndị na-akatọ Bible ewepụtawo ọtụtụ akwụkwọ na-akọ nkọ̀ ndị na-ama izi ezi nke Bible na ịbụ nke a pụrụ ịdabere na ya aka. Pọl dọrọ onye Kraịst ibe ya aka ná ntị, sị: “Biko Timoti, na-eche ihe ahụ e nyere gị n’aka idebe, na-eze okwu efu nile nke e merụrụ emerụ nke ihe ahụ a na-akpọ ihe ọmụma n’ụzọ ụgha, ha na nguzogide ya nile; bụ́ ihe ọmụma nke ụfọdụ kwupụtara wee hie n’ihe banyere okwukwe anyị.” (1 Timoti 6:20, 21) Bible gara n’ihu na-adọ aka ná ntị, sị: “Lezienụ anya ka onye ọ bụla ghara iwere ịhụ amamihe n’anya na aghụghọ efu nke ya bụrụ onye na-ezu unu n’ohi, ịhụ amamihe n’anya nke dị ka ihe ozizi mmadụ nyere idebe, dị ka ozizi mbụ nke ụwa, ma ọ dịghị ka Kraịst si dị.”—Ndị Kọlọsi 2:8.

Lụsoo Omume Inwe Obi Abụọ Ọgụ

6. N’ihi gịnị ka ịnọ na nche ji dị mkpa iji gbochie obi abụọ ịgbanye mkpọrọgwụ n’obi?

6 Atụmatụ ọzọ dị aghụghọ nke Ekwensu bụ ịkụnye obi abụọ n’uche mmadụ. Ọ mụ anya mgbe nile ịhụ adịghị ike ụfọdụ n’okwukwe na iji ya eme ihe. Onye ọ bụla nke na-enwe obi abụọ kwesịrị icheta na onye na-akpata obi abụọ dị otú ahụ bụ onye ahụ sịrị Iv: “Ọ̀ ga-abụ ezie na Chineke sịrị, Unu erila mkpụrụ sitere n’osisi ọ bụla nke ubi a a gbara ogige?” Ozugbo Onye Ọnwụnwa ahụ kụbanyere obi abụọ n’uche ya, nzọụkwụ ọzọ bụ ịghara ya ụgha, bụ́ nke o kwetara. (Jenesis 3:1, 4, 5) Iji zere okwukwe anyị ịbụ nke obi abụọ bibiri dị ka o bibiri nke Iv, ọ dị anyị mkpa ịnọ na nche. Ọ bụrụ na ntakịrị obi abụọ banyere Jehova, Okwu ya, ma ọ bụ nzukọ ya amalitewo ịdị n’obi gị, mee ihe ngwa ngwa iji wepụ ya tupu ọ ghọọ ihe pụrụ ibibi okwukwe gị.—Tụlee 1 Ndị Kọrint 10:12.

7. Gịnị ka a pụrụ ime iji wepụsịa obi abụọ nile?

7 Gịnị ka a pụrụ ime? Ọzọkwa, azịza ya bụ ịtụkwasị Jehova na Okwu ya obi. “Ọ bụrụ na amamihe fọdụụrụ onye ọ bụla n’ime unu inwe, ya rịọ n’aka Chineke, Onye na-enye mmadụ nile n’afọ ofufo, n’ataghịkwa ụta; a ga-ewerekwa ya nye ya. Ma ya rịọ n’okwukwe, ghara inwe obi abụọ: n’ihi na onye nwere obi abụọ yiri ebili mmiri nke oké osimiri mgbe ifufe na-efegharị ya, a na-atụlikwa ya elu.” (Jemes 1:5‚ 6; 2 Pita 3:17‚ 18) Ya mere ikpegara Jehova ekpere sitere n’obi bụ nzọụkwụ mbụ. (Abụ Ọma 62:8) Ya mere, egbula oge n’ịrịọ maka enyemaka site n’aka ndị nlekọta na-ahụ n’anya n’ime ọgbakọ. (Ọrụ 20:28; Jemes 5:14, 15; Jud 22) Ha ga-enyere gị aka ịchọpụta ihe kpatara obi abụọ gị nile, nke pụrụ ịbụ n’ihi mpako ma ọ bụ echiche ụfọdụ na-ezighị ezi.

8. Olee otú echiche ndapụ n’ezi ofufe si amalitekarị, gịnịkwa bụ ngwọta ya?

8 Ịgụ ma ọ bụ ige ntị n’echiche nke ndị si n’ezi ofufe dapụ ma ọ bụ nkà ihe ọmụma ụwa ò webatawo obi abụọ ndị yiri nsí? N’ụzọ amamihe, Bible na-adụ ọdụ, sị: “Na-anụ ọkụ n’obi iche onwe gị n’ihu mmadụ dị ka onye Chineke nwapụtaworo, onye ọrụ nke ihere na-apụghị ime ya, onye na-ekwuzi okwu nke eziokwu ahụ. Ma na-eze okwu efu nile e merụrụ emerụ: n’ihi na ha ga-aga karị n’ihu n’asọpụrụghị Chineke, okwu ha ga-abụkwa ọnyá na-aba aba dị ka gangrene.” (2 Timoti 2:15-17) Ọ bụ ihe na-adọrọ mmasị ịmara na ọtụtụ ndị dapụworo n’ezi ofufe malitere n’ụzọ ọjọọ site n’ibu ụzọ na-eme mkpesa banyere otú ha chere e si na-emeso ha ná nzukọ Jehova. (Jud 16) Ịchọta ihe dị njọ ná nkweta dị iche iche bịara n’ikpeazụ. Dị nnọọ ka onye na-awa ahụ si eme ngwa igbubipụ ọnyá gangrene, mee ngwa isi n’uche gị wepụsịa omume ime mkpesa ọ bụla, enweghị afọ ojuju n’ụzọ e si eme ihe n’ọgbakọ ndị Kraịst. (Ndị Kọlọsi 3:13, 14) Gbubipụ ihe ọ bụla nke na-afụnye ọkụ n’obi abụọ ndị ahụ.—Mak 9:43.

9. Olee otú usoro ọchịchị Chineke dị mma ga-esi nyere anyị aka ịnọgide na-enwe ahụ ike n’okwukwe?

9 Rapagidesie ike n’ebe Jehova na nzukọ ya dị. Jiri iguzosi ike n’ihe ṅomie Pita, bụ́ onye kwuru n’ụzọ mkpebisi ike, sị: “Onyenwe anyị, Ònye ka anyị ga-ejekwuru? I nwere okwu nke ndụ ebighị ebi.” (Jọn 6:52, 60, 66-68) Nwee usoro dị mma nke ịmụ Okwu Jehova iji nọgide na-eme ka okwukwe gị sie ike, dị ka ọta ukwu, nke nwere ike “imenyụ akụ̀ ụta nile na-enwu ọkụ nke ajọ onye ahụ.” (Ndị Efesọs 6:16) Nọgide na-arụsi ọrụ ike n’ozi ndị Kraịst, na-esoro ndị ọzọ ekerịta ozi Alaeze ahụ n’ịhụnanya. Kwa ụbọchị, jiri ekele tụgharịa uche n’otú Jehova siworo gọzie gị. Nwee ekele na ị maara eziokwu ahụ. Ime ihe ndị a nile n’ezi usoro ime ihe ndị Kraịst ga-enyere gị aka inwe obi ụtọ, ịtachi obi, na ịnọgide n’enweghị obi abụọ.—Abụ Ọma 40:4; Ndị Filipaị 3:15, 16; Ndị Hibru 6:10-12.

Ịgbaso Nduzi Jehova n’Alụmdi na Nwunye

10. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa karịsịa ilegara Jehova anya maka nduzi n’alụmdi na nwunye ndị Kraịst?

10 N’idokwa ka nwoke na nwanyị bikọọ ọnụ dị ka ndị lụrụ di na nwunye, Jehova zubere ọ bụghị nanị imejupụta ụwa n’ụzọ ntụsara ahụ kamakwa itinyekwu ihe n’obi ụtọ ha. Otú ọ dị, mmehie na ezughị okè ewebatawo nsogbu ndị siri ike ná mmekọrịta alụmdi na nwunye. A gụpụghị ndị Kraịst n’ihe ndị a ebe ọ bụ na ha onwe ha bụkwa ndị na-ezughị okè ma na-enwe nrụgide nile nke ndụ a na-adị n’oge a. Ma, ruo n’ókè ha tụkwasịruru Jehova na Okwu ya obi, ndị Kraịst pụrụ inwe ezi ihe ịga nke ọma n’alụmdi na nwunye na n’ịzụlite ụmụaka ha. Ohere adịghị n’alụmdi na nwunye ndị Kraịst maka omume na akparamàgwà ndị ụwa. Okwu Chineke na-adụ anyị ọdụ, sị: “Ka ịlụ di na nwunye bụrụ ihe a na-asọpụrụ n’etiti unu nile, ka ihe ndina unu bụrụkwa ihe a dịghị emerụ emerụ: n’ihi na Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko ikpe, ha na ndị na-akwa iko, bụ́ ndị ikom nwere nwunye na ndị inyom nwere di.”—Ndị Hibru 13:4.

11. N’idozi nsogbu alụmdi na nwunye, gịnị ka ma di ma nwunye kwesịrị ịmata?

11 Alụmdi na nwunye nke a lụrụ dị ka ndụmọdụ Bible si dị nwere ọnọdụ ịhụnanya, ibu ọrụ, na ịnọ ná ntụkwasị obi. Ma di ma nwunye na-aghọta ma na-akwanyere ụkpụrụ ịbụisi ùgwù. Mgbe ihe isi ike bilitere, ha na-abụkarị n’ihi nleghara anya ụfọdụ n’itinye ndụmọdụ Bible n’ọrụ. N’idozi nsogbu jụrụ ịla kpam kpam, ọ dị mkpa na ma di ma nwunye ahụ ga-eji obi eziokwu lekwasị anya n’ihe bụ nsogbu n’ezie ma gbasoo ihe ndị kpatara ya mgba kama ihe ndị na-egosi na e nwere nsogbu. Ọ bụrụ na mkparịta ụka ndị e nwere na nso nso a dujere ná ntakịrị ma ọ bụ enweghị nkwekọrịta ma ọlị, di na nwunye ahụ pụrụ ịrịọ maka enyemaka eleghị mmadụ anya n’ihu site n’aka onye nlekọta na-ahụ n’anya.

12. (a) Ná nsogbu ndị dị aṅaa a na-ahụkarị n’alụmdi na nwunye ka Bible na-enye ndụmọdụ? (b) N’ihi gịnị ka e ji nwee mkpa n’akụkụ ma di ma nwunye ahụ ime ihe n’ụzọ nke Jehova?

12 Nsogbu ahụ ò metụtara nkwurịta okwu, ịkwanyere mmetụta ibe ha ùgwù, ịkwanyere ịbụ isi ùgwù, ma ọ bụ otú e si na-eme mkpebi? Ò metụtara ịzụlite ụmụaka, ma ọ bụ inwe echiche ziri ezi n’ihe banyere mkpa mmekọahụ? Ka ọ̀ bụ atụmatụ mmefu ego nke ezinụlọ, ntụrụndụ, mkpakọrịta, ma nwunye ọ̀ ga na-arụ ọrụ, ka ọ bụ ebe unu ga-ebi? Ihe ọ sọkwara nsogbu ahụ bụrụ, Bible na-enye okwu ndụmọdụ bara uru kpọmkwem site n’iwu dị iche iche ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ site n’ụkpụrụ dị iche iche. (Matiu 19:4, 5, 9; 1 Ndị Kọrint 7:1-40; Ndị Efesọs 5:21-23, 28-33; 6:1-4; Ndị Kọlọsi 3:18-21; Taịtọs 2:4, 5; 1 Pita 3:1-7) Mgbe ma di ma nwunye zeere ịdị na-achọ ka e meere ya ihe ga-abara nanị ya onwe ya uru ma kwe ka ịhụnanya gosipụta onwe ya n’ụzọ zuru ezu n’alụmdi na nwunye ha, ọ na-arụpụta obi ụtọ ka ukwuu. A ghaghị inwe ọchịchọ na-erikpu erikpu n’akụkụ nke ma di ma nwunye ime mgbanwe ndị dị mkpa, ime ihe n’ụzọ nke Jehova. “Onye nwere uche n’okwu Chineke ga-achọta ezi ihe: ọzọ, onye na-atụkwasị Jehova obi, onye ihe na-agara nke ọma ka ọ bụ.”—Ilu 16:20.

Ndị Ntorobịa—Ṅaanụ Ntị n’Okwu Chineke

13. N’ihi gịnị ka ọ na-ejighị adịrị ndị ntorobịa bụ́ ndị Kraịst mfe itolite ma nwee okwukwe siri ike na Jehova na Okwu ya?

13 Ọ dịghịrị ndị ntorobịa bụ ndị Kraịst mfe itolite ma sie ike n’okwukwe ebe ajọ ụwa gbara ha gburugburu. Otu ihe kpatara ya bụ na “ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ,” bụ́ Setan bụ́ Ekwensu. (1 Jọn 5:19) Onye iro a dị njọ, nke pụrụ ime ka ihe dị njọ yie ihe dị mma, na-awakwasị ndị ntorobịa. Àgwà nke mụ onwe m tupu ndị ọzọ, ọchịchọ ọdịmma onwe onye, ọchịchọ maka ihe ndị rụrụ arụ na nke obi ịta mmiri, na nchụso gafere ókè nke ihe ụtọ—ihe ndị a nile jikọtara aka ghọọ otu ụzọ iche echiche zuru ebe nile, nke jupụtara ebe nile nke a kọwara n’ime Bible dị ka “mmụọ ahụ nke na-arụsi ọrụ ike n’ime ụmụ nke ekwenyeghị ekwenye ugbu a.” (Ndị Efesọs 2:1-3) Setan ejiriwo aghụghọ kwalite “mmụọ” nke a n’akwụkwọ ọgụgụ ụlọ akwụkwọ, n’ihe dị ukwuu n’ime egwú ndị e nwere, n’egwuregwu, na n’ụdị ntụrụndụ ndị ọzọ. Ọ dị ndị mụrụ ụmụ mkpa ịmụrụ anya iji gbochie mmetụta ndị dị otú ahụ site n’inyere ụmụaka ha aka itolite na-atụkwasị Jehova na Okwu ya obi.

14. Olee otú ndị na-eto eto pụrụ isi ‘gbanarị agụụ ihe ọjọọ na-agụ nwa okorobịa’?

14 Pọl nyere enyi ya bụ nwa okorobịa bụ́ Timoti okwu ndụmọdụ nna, sị: “Na-agbanarị agụụ ihe ọjọọ na-agụ nwa okorobịa, na-agbasokwa ezi omume, okwukwe, ịhụnanya, udo, gị na ndị na-akpọku Onyenwe anyị site n’obi dị ọcha.” (2 Timoti 2:22) Ọ bụ ezie na ọ bụghị ‘agụụ nile na-agụ nwa okorobịa’ dịcha njọ n’onwe ha, ndị ntorobịa kwesịrị ‘ịgbanarị’ ha n’ụdị na ha ekwesịghị ikwe ka ihe ndị a ghọọ ihe na-echu ha ụra, na-ahapụ ntakịrị oge, ma ọ bụrụ na ọ dị nke a hapụrụ, maka nchụso nke Chineke. Ịfụli uru ahụ, egwuregwu, egwú, ntụrụndụ, ihe omume ntụrụndụ, na njem, ọ bụ ezie na ha adịchaghị njọ n’onwe ha, pụrụ ịbụ ọnyà ma ọ bụrụ na ha aghọọ oké ihe ná ndụ. Gbanarị kpam kpam mkparịta ụka na-enweghị ezi ihe ọ na-arụpụta, igbugharị oge, mmasị na-adịghị mma ná mmekọahụ, ịnọ nkịtị na inwe ike ọgwụgwụ, na ime mkpesa banyere ndị mụrụ gị aghọtaghị gị.

15. Olee ihe ndị pụrụ ime mgbe mmadụ nọ nanị ya n’ụlọ bụ́ nke pụrụ iso kpata onye ntorobịa ibi ụdị ndụ abụọ?

15 Ọbụna mgbe mmadụ nọ nanị ya n’ụlọ, ihe ize ndụ pụrụ ịdịrị ndị ntorobịa. Ọ bụrụ na a na-ekiri ihe ngosi TV na vidio ndị na-egosi omume rụrụ arụ ma ọ bụ ime ihe ike, a pụrụ ịkụnye ọchịchọ ime ihe ọjọọ. (Jemes 1:14, 15) Bible na-adụ ọdụ, sị: “Unu ndị na-ahụ Jehova n’anya, kpọọnụ ihe ọjọọ asị.” (Abụ Ọma 97:10; 115:11) Jehova maara ma ọ̀ dị onye na-anwa ibi ụdị ndụ abụọ. (Ilu 15:3) Ndị ntorobịa bụ́ ndị Kraịst, legharịanụ anya n’ime ọnụ ụlọ unu. Ị̀ mapanyere foto nke ndị na-eme egwuregwu ma ọ bụ ndị na-eti egwú na-eme omume rụrụ arụ n’ájá, ka ị̀ mapanyere ihe ndị dị mma ndị bụ ezi ihe ncheta? (Abụ Ọma 101:3) N’ime ebe ị na-ekosa uwe gị, ì nwere uwe ndị kwesịrị ekwesị, ka ụfọdụ n’ime uwe gị hà na-egosi ụdị uwe ndị gabigara ókè nke ụwa a? N’ụzọ ndị dị aghụghọ Ekwensu pụrụ ịmata gị n’ọnyà ma ọ bụrụ na ị daba n’ọnwụnwa nke idetụ ihe ọjọọ ire. Bible na-adụ ọdụ n’ụzọ amamihe, sị: “Nweenụ anya udo, na-echenụ nche: onye ahụ nke na-ekuru unu gaa ikpe, bụ́ ekwensu, dị ka ọdụm na-agbọ ụja, ọ na-ejegharị, na-achọ onye ọ ga-elomi.”—1 Pita 5:8.

16. Olee otú ndụmọdụ Bible pụrụ isi nyere onye ntorobịa aka ime ka onye ọ bụla dị mkpa nwee obi ụtọ n’ebe ọ nọ?

16 Bible na-agwa gị ka i chee mkpakọrịta gị nche. (1 Ndị Kọrint 15:33) Ndị gị na ha na-akpakọrịta kwesịrị ịbụ ndị na-atụ egwu Jehova. Ekwela ka nrụgide ndị ọgbọ merie gị. (Abụ Ọma 56:11; Ilu 29:25) Na-erubere ndị mụrụ gị na-atụ egwu Chineke isi. (Ilu 6:20-22; Ndị Efesọs 6:1-3) Legara ndị okenye anya maka nduzi na agbamume. (Aịsaịa 32:1, 2) Tụkwasị uche na anya gị n’àgwà na ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ. Chọọ ohere maka inwe ọganihu ime mmụọ na ikere òkè n’ihe omume ọgbakọ. Mụta ụzọ isi jiri aka gị na-eme ihe. Sie ike ma nwee ahụ ike n’okwukwe, mgbe ahụkwa ị ga-anwapụta na ị bụ onye dị mkpa n’ezie—onye ruru eru inweta ndụ n’ụwa ọhụrụ Jehova! Nna anyị nke eluigwe ga-enwe obi ụtọ banyere gị, nne na nna gị n’elu ala ga-enwe obi ụtọ n’ebe ị nọ, ụmụnna gị ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ ndị Kraịst ga-abụkwa ndị ị gbara ume. Ọ bụ nke ahụ dị mkpa!—Ilu 4:1, 2, 7, 8.

17. Uru ndị dị aṅaa na-abịara ndị na-atụkwasị Jehova na Okwu ya obi?

17 N’okwu uri, e nyere onye ọbụ abụ ahụ ike mmụọ nsọ ide, sị: “[Jehova] agaghị egbochi ezi ihe n’ebe ndị na-ejegharị n’izu okè nọ. Jehova nke usuu nile nke ndị agha, onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ ahụ bụ nke na-atụkwasị obi na Gị.” (Abụ Ọma 84:11, 12) Ee, obi ụtọ na ihe ịga nke ọma, ọ bụghị ndakpọ olileanya na ọdịda, bụ ihe ga-abịara ndị nile na-atụkwasị Jehova na Okwu ya, bụ́ Bible, obi.—2 Timoti 3:14, 16, 17.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

◻ N’ihi gịnị ka ndị Kraịst na-ekwesịghị iji tụkwasị obi ha ‘n’amamihe nke ụwa nke a’?

◻ Gịnị ka e kwesịrị ime ma ọ bụrụ na mmadụ na-enwe obi abụọ?

◻ Olee otú ime ihe n’ụzọ nke Jehova si eweta ihe ịga nke ọma na obi ụtọ n’alụmdi na nwunye?

◻ Olee otú Bible si enyere ndị ntorobịa aka ‘ịgbanarị agụụ ihe ọjọọ na-agụ nwa okorobịa’?

[Foto dị na peeji nke 23]

Ndị Kraịst na-echigharịkwuru Jehova na Okwu ya, ka ha na-ajụ “amamihe nke ụwa nke a” dị ka ihe nzuzu

[Foto dị na peeji nke 25]

Ezinụlọ ndị na-atụkwasị Jehova na Okwu ya obi na-enwe ihe ịga nke ọma na obi ụtọ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya