Izi Ihe Chineke Megide Ozizi Ndị Mmụọ Ọjọọ
“Ụfọdụ ga-ewezụga onwe ha n’ebe okwukwe anyị dị, na-aṅa ntị ndị mmụọ na-eduhie eduhie na ozizi nke ndị mmụọ ọjọọ.”—1 TIMOTI 4:1.
1. Agha dị aṅaa ka ndị Kraịst nọ n’etiti ya?
KA E were na i biri ndụ gị dum n’ebe a na-alụ agha. Olee ihe ọ ga-adị ka ya ị laba ụra na-anụ ụda égbè ma teta na-anụ ụda ihe agha dị iche iche? N’ụzọ dị mwute, n’akụkụ ụfọdụ nke ụwa, nke ahụ bụ́ n’ezie otú ndị mmadụ si ebi ndụ. Otú ọ dị, n’ụzọ ime mmụọ, ndị Kraịst nile na-ebi ndụ otú a. Ha nọ n’etiti oké ibu agha nke na-aga n’ihu ihe dị ka 6,000 afọ ma bụrụ nke siwanyeworo ike n’ụbọchị anyị. Gịnị ka agha ogologo nke a bụ? Ọgụ nke eziokwu megide ụgha, nke izi ihe Chineke megide ozizi ndị mmụọ ọjọọ. Ọ bụghị ikwubiga okwu ókè ịkpọ ya—ma ọ dịghị ihe ọzọ n’ihi ihe otu akụkụ ya na-ebu agha na-eme—agha kasị obi ọjọọ na nke kasị eweta ọnwụ n’akụkọ ihe mere eme nke ihe a kpọrọ mmadụ.
2. (a) Dị ka Pọl kwuru, akụkụ abụọ dị aṅaa na-emegiderịta onwe ha? (b) Gịnị ka Pọl bu n’uche n’ikwu “okwukwe anyị”?
2 Pọl onyeozi kpọtụrụ akụkụ abụọ nke esemokwu ahụ aha mgbe o degaara Timoti akwụkwọ, sị: “Ma mmụọ nsọ na-ekwuwa okwu sị, na n’oge ikpeazụ ụfọdụ ga-ewezụga onwe ha n’ebe okwukwe anyị dị, na-aṅa ntị ndị mmụọ na-eduhie eduhie na ozizi nke ndị mmụọ ọjọọ.” (1 Timoti 4:1) Rịba ama na ozizi ndị mmụọ ọjọọ ga-enwe mmetụta karịsịa “n’oge ikpeazụ.” Dị ka e lere ya anya site n’ụbọchị Pọl, anyị na-ebi n’oge dị otú ahụ. Rịbakwa ama ihe na-emegide ozizi ndị mmụọ ọjọọ, ya bụ “okwukwe anyị.” N’ebe a, “okwukwe anyị” nọchitere anya izi ihe Chineke, nke dabeere n’okwu sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke nke dị n’ime Bible. Okwukwe dị otú ahụ na-enye ndụ. Ọ na-akụziri onye Kraịst ime uche Chineke. Ọ bụ eziokwu ahụ nke na-eduba ná ndụ ebighị ebi.—Jọn 3:16; 6:40.
3. (a) Gịnị na-eme ndị nwụrụ n’agha ahụ dị n’etiti eziokwu na ụgha? (b) Ònye nọ n’azụ ozizi ndị mmụọ ọjọọ?
3 Onye ọ bụla dapụrụ n’okwukwe anyị ga-atụfu ndụ ebighị ebi. Ha bụ ndị agha riri. Lee nnọọ ihe mfu ọ bụ mmadụ ikwe ka e duhie ya site n’ozizi ndị mmụọ ọjọọ! (Matiu 24:24) Olee otú anyị nile n’otu n’otu ga-esi zere ịbụ ndị agha riri? Ọ bụ site n’ịjụ nkụzi ụgha nile ndị a kpam kpam, nke na-emezu nanị nzube nke “onye isi ndị mmụọ ọjọọ,” Setan bụ́ Ekwensu. (Matiu 12:24) Dị ka a pụrụ ikwu ya, ozizi nile nke Setan bụ ụgha, ebe ọ bụ na Setan bụ ‘nna ụgha.’ (Jọn 8:44) Tụlee otú o si jiri ụgha n’ụzọ dị akọ duhie nne na nna anyị mbụ.
E Kpughee Ozizi Ndị Mmụọ Ọjọọ
4, 5. Olee ụgha Setan ghaara Iv, n’ihi gịnịkwa ka nke ahụ ji bụrụ oké ihe ọjọọ?
4 E dekọrọ ihe ndị ahụ mere n’ime Bible na Jenesis 3:1-5. N’iji agwọ mee ihe, Setan bịakwutere nwanyị ahụ bụ́ Iv ma jụọ ya, sị: “Ọ̀ ga-abụ ezie na Chineke sịrị, unu erila mkpụrụ sitere n’osisi ọ bụla nke ubi a a gbara ogige?” Ajụjụ ahụ yiri ihe na-adịghị emerụ ahụ, ma lee ya anya ọzọ. “Ọ ga-abụ ezie?” Setan mere ka o nwere ijuanya, dị ka ọ na-achọ ịsị, ‘N’ihi gịnị ka Chineke ga-eji kwuo ihe dị otú ahụ?’
5 N’obi ọcha ya, Iv gosiri na otú ahụ ka ọ dị. Ọ matara izi ihe Chineke n’okwu a, na Chineke agwaworị Adam na ha ga-anwụ ma ọ bụrụ na ha erie site n’osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ. (Jenesis 2:16, 17) O doro anya na ajụjụ Setan kpaliri mmasị ya, ya mere ọ ṅara ntị ka ọ kpọrọ okwu aha: “Agwọ wee sị nwanyị, Ọ dịghị ọnwụ unu na-aghaghị ịnwụ.” Lee nnọọ ihe ọjọọ ọ bụ ikwu! Setan boro Jehova, bụ́ Chineke nke eziokwu, Chineke nke ịhụnanya, Onye Okike, ebubo nke ịghara ụmụ Ya bụ mmadụ ụgha!—Abụ Ọma 31:5; 1 Jọn 4:16; Mkpughe 4:11.
6. Olee otú Setan si maa ịdịmma na ọkaaka Jehova aka?
6 Ma Setan kwuru karịa nke ahụ. Ọ gara n’ihu, sị: “N’ihi na Chineke maara na n’ụbọchị unu ga-eri mkpụrụ sitere na ya, mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya unu, unu ewee dị ka Chineke, na-ama ezi ihe na ihe ọjọọ.” Dị ka Setan kwuru, Jehova Chineke—onye nyeworo nne na nna anyị mbụ ihe n’ụba—chọrọ ịnapụ ha ihe dị ebube. Ọ chọrọ igbochi ha ịdị ka ndị bụ chi. Otú a, Setan mara ịdịmma Chineke aka. Ọ kwalitekwara mmụọ imeju agụụ onwe onye na ịma ụma lefuru iwu Chineke anya, na-asị na ime ihe n’ụzọ dị otú a ga-eweta abamuru. Ya bụ na Setan mara ịchịisi Chineke n’ebe ihe O kere n’onwe ya nọ aka, na-ekwu na Chineke enweghị ikike ịkpa ókè n’ihe mmadụ na-eme.
7. Olè mgbe mbụ a nụrụ ozizi ndị mmụọ ọjọọ, oleekwa otú ha si nwee myirịta taa?
7 Site n’okwu ndị ahụ nke Setan, a malitere ịnụ ozizi ndị mmụọ ọjọọ. Ajọ ozizi ndị a ka nọgidere na-akwalite ụkpụrụ asọpụrụghị Chineke ndị yiri ya. Dị nnọọ ka o mere n’ogige Iden, Setan, onye ndị mmụọ ndị ọzọ nupụrụ isi sonyeere ugbu a, ka nọgidere na-ama ikike Chineke nwere iguzobe ụkpụrụ ndị a ga-eji mee ihe aka. Ọ ka na-emegide ịchịisi Jehova ma na-agbalị ịrụgide ndị mmadụ ka ha nupụrụ Nna ha nke eluigwe isi.—1 Jọn 3:8, 10.
8. Gịnị ka Adam na Iv tụfuru n’Iden, ma olee otú e si nwapụta na Jehova kwuru eziokwu?
8 Ná nzute mbụ nke ọgụ dị n’etiti izi ihe Chineke na ozizi ndị mmụọ ọjọọ, Adam na Iv mere mkpebi na-ezighị ezi ma tụfuo olileanya ha nke ndụ ebighị ebi. (Jenesis 3:19) Ka ọtụtụ afọ gasịrị, ahụ ha malitekwa ịdakpọ, e mere ka o doo ha nnọọ anya onye ọ bụ ya kwuru okwu ụgha na onye gwara ha eziokwu laa azụ n’Iden. Otú ọ dị, ọtụtụ narị afọ tupu ha anwụọ n’echiche anụ ahụ, ha ghọrọ ndị mbụ nwụrụ n’ọgụ ahụ dị n’etiti eziokwu na ụgha mgbe a mara ha ikpe dị ka ndị na-ekwesịghị ịdị ndụ site n’aka Onye Okike ha, bụ́ Isi Iyi nke ndụ. Nke ahụ bụ mgbe ha nwụrụ n’echiche ime mmụọ.—Abụ Ọma 36:9; tụlee Ndị Efesọs 2:1.
Ozizi Ndị Mmụọ Ọjọọ Taa
9. Ruo ókè hà aṅaa ka ozizi nke ndị mmụọ ọjọọ dịruworo irè n’ime ọtụtụ narị afọ?
9 N’ime akwụkwọ Mkpughe, e buuru Jọn onyeozi n’ike mmụọ nsọ gaa “n’ụbọchị Onyenwe anyị,” nke malitere na 1914. (Mkpughe 1:10) N’oge ahụ e si n’eluigwe chụda Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya na gburugburu ụwa—oké ndọla azụ nye onye mmegide nke a nke Onye Okike Ukwu anyị. A nụghịkwa olu ya ọzọ n’eluigwe ka ọ na-ebo ndị na-ejere Jehova ozi ebubo mgbe nile. (Mkpughe 12:10) Otú ọ dị, olee ihe ịga nke ọma ozizi ndị mmụọ ọjọọ nweworo n’elu ụwa eri Iden? Ihe ndekọ ahụ na-asị: “E wee chụda dragọn ukwu ahụ, bụ́ agwọ ochie ahụ, onye a na-akpọ Ekwensu na Setan, onye na-eduhie ụwa nile mmadụ bi.” (Mkpughe 12:9) Ụwa dum adabawo n’ụgha Setan! Ọ bụghị ihe ijuanya na a kpọrọ Setan “onye isi ụwa nke a”!—Jọn 12:31; 16:11.
10, 11. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya si akpa ike taa?
10 Setan ọ̀ nakweere mmeri mgbe a chụpụsịrị ya n’eluigwe? Ọ dịghị ma ọlị! O kpebiri ibuso izi ihe Chineke na ndị rapagidere na ya agha. Ka a chụpụsịrị ya n’eluigwe, Setan gara n’ihu n’agha ya: “Dragọn ahụ [Setan] wee wesa nwanyị ahụ iwe, wee pụọ ibu agha megide mkpụrụ ya fọdụrụ, bụ́ ndị na-edebe ihe nile Chineke nyere n’iwu, ndị na-enwekwa àmà nke Jisọs.”—Mkpughe 12:17.
11 Tụkwasị n’ibuso ndị ohu Chineke agha, Setan ji akụkọ ụgha ya na-emejupụta ụwa, na-agbalịsi ike ijidesi ihe a kpọrọ mmadụ aka ike. N’ime otu ọhụụ ya nke Mkpughe nke ụbọchị Onyenwe anyị, Jọn onyeozi hụrụ anụ ọhịa atọ na-anọchite anya Setan n’ụzọ ihe atụ, nzukọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya nke elu ala, na ike ọchịchị ụwa na-achị n’oge anyị. Site n’ọnụ ha atọ, awọ wụpụtasịrị. Ole ihe ihe ndị a bụ ihe atụ ya? Jọn na-ede, sị: “Ha bụ mmụọ nke ndị mmụọ ọjọọ, na-eme ihe ịrịba ama dị iche iche; ndị na-apụkwuru ndị eze nke elu ụwa dum mmadụ bi, ime ka ha zukọọ ibu agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye pụrụ ime ihe nile.” (Mkpughe 16:14) N’ụzọ pụtara ìhè, ozizi ndị mmụọ ọjọọ na-arụsi ọrụ ike n’ụwa. Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ka na-ebu agha megide izi ihe Chineke, ha ga-anọgide na-eme otú ahụ ruo mgbe a manyere ha ịkwụsị site n’aka Jisọs Kraịst, Eze Mesaịa ahụ.—Mkpughe 20:2.
Ịmata Ozizi nke Ndị Mmụọ Ọjọọ
12. (a) N’ihi gịnị ka o ji kwe omume iguzogide ozizi nke ndị mmụọ ọjọọ? (b) Olee otú Setan si anwa inweta ihe ọ na-achọ n’ebe ndị ohu Chineke nọ?
12 Ụmụ mmadụ na-atụ egwu Chineke hà pụrụ iguzogide ozizi ndị mmụọ ọjọọ? N’ezie ha pụrụ, n’ihi ihe abụọ. Nke mbụ, n’ihi na izi ihe Chineke dị ike karị; nke abụọ, n’ihi na Jehova ekpughewo ụzọ aghụghọ nile nke Setan ka anyị wee nwee ike iguzogide ha. Dị ka Pọl onyeozi kwuru, “anyị abụghị ndị na-amaghị ihe nile ọ na-echepụta.” (2 Ndị Kọrint 2:11) Anyị maara na Setan na-eji mkpagbu eme ihe dị ka otu ụzọ isi mezuo nzube ya. (2 Timoti 3:12) Otú ọ dị, n’ụzọ dị aghụghọ nke ukwuu karị, ọ na-agbalị inwe mmetụta n’uche na n’obi nke ndị na-ejere Chineke ozi. O duhiere Iv ma tinye agụụ na-ezighị ezi n’obi ya. Ọ na-eme otu ihe ahụ taa. Pọl degaara ndị Kọrint akwụkwọ, sị: “Ana m atụ egwu, ma o nwere ụzọ ọ bụla a ga-emebi uche unu ka unu pụọ n’afọ ofufo na ịdị ọcha nke dị n’ebe Kraịst nọ, dị ka agwọ ahụ weere aghụghọ ya ghọgbuo Iv.” (2 Ndị Kọrint 11:3) Tụlee otú o siworo mebie echiche ihe a kpọrọ mmadụ n’ozuzu ya.
13. Ụgha ndị dị aṅaa ka Setan gwaworo ihe a kpọrọ mmadụ eri Iden?
13 Nye Iv, Setan boro Jehova ebubo ịgha ụgha ma sị na ụmụ mmadụ pụrụ ịdị ka chi ma ọ bụrụ na ha enupụrụ Onye Okike ha isi. Ọnọdụ mmehie ihe a kpọrọ mmadụ nọ na ya taa na-anwapụta na Setan, ọ bụghị Jehova, bụ onye ghara ụgha. Ụmụ mmadụ taa abụghị chi! Otú ọ dị, Setan ji ụgha ndị ọzọ sochie ụgha mbụ ahụ. O webatara echiche nke na mkpụrụ obi mmadụ adịghị anwụ anwụ. O si otú a chee n’ihu ihe a kpọrọ mmadụ ohere nke ịdị ka chi n’ụzọ ọzọ. Mgbe ahụ, na-adabere n’ozizi ụgha ahụ, ọ kwalitere nkụzi ọkụ ala mmụọ, pọgatrị, mgbaasị, na ife ndị nna ochie ofufe. Ụgha ndị a ka na-ejigide ọtụtụ nde mmadụ n’agbụ.—Deuterọnọmi 18:9-13.
14, 15. Gịnị bụ eziokwu banyere ọnwụ na olileanya mmadụ maka ọdịnihu?
14 Ma, ihe Jehova gwara Adam bụ nke bụ eziokwu. Adam nwụrụ mgbe o mehiere megide Chineke. (Jenesis 5:5) Mgbe Adam na ụmụ ya nwụrụ, ha ghọrọ mkpụrụ obi nwụrụ anwụ, nọrọ n’ọnọdụ amaghị ihe na arụghị ọrụ. (Jenesis 2:7; Eklisiastis 9:5, 10; Ezikiel 18:4) N’ihi iketa mmehie site n’aka Adam, mkpụrụ obi nile bụ́ mmadụ na-anwụ anwụ. (Ndị Rom 5:12) Otú ọ dị, laa azụ n’Iden, Jehova kwere nkwa ọbịbịa nke otu mkpụrụ nke ga-alụso ọrụ nile nke Ekwensu ọgụ. (Jenesis 3:15) Mkpụrụ ahụ bụ Jisọs Kraịst, Ọkpara Chineke mụrụ nanị ya. Jisọs nwụrụ n’enweghị mmehie, ndụ ya o jiri chụọ àjà ghọkwara ihe mgbapụta iji zụrụ ihe a kpọrọ mmadụ site n’ọnọdụ ịnwụ anwụ ha. Ndị ji nrubeisi gosipụta okwukwe na Jisọs nwere ohere inweta ndụ ebighị ebi ahụ Adam tụfuru.—Jọn 3:36; Ndị Rom 6:23; 1 Timoti 2:5, 6.
15 Ihe mgbapụta ahụ, ọ bụghị echiche dị inyoghị inyoghị nke na mkpụrụ obi na-alanarị ọnwụ, bụ ezi olileanya dịịrị ihe a kpọrọ mmadụ. Nke a bụ izi ihe Chineke. Ọ bụ eziokwu. Ọ bụkwa ngosipụta dị ebube nke ịhụnanya na amamihe Jehova. (Jọn 3:16) Lee aha obi ekele anyị kwesịrị inwe ịmụta eziokwu nke a ma bụrụ ndị e mere ka ha nwere onwe ha pụọ n’ozizi ndị mmụọ ọjọọ n’okwu ndị a!—Jọn 8:32.
16. Olee ihe ndị na-adịte anya a rụpụtara mgbe ụmụ mmadụ na-agbaso amamihe nke aka ha?
16 Site n’ụgha ndị ọ ghara n’ogige Iden, Setan gbara Adam na Iv ume inwe ọchịchọ nnwere onwe pụọ n’ebe Chineke nọ na ịdabere n’amamihe onwe ha. Taa, anyị na-ahụ ihe ndị ọ rụpụtara bụ́ ndị na-adịte anya ná mpụ, ihe isi ike akụ̀ na ụba, agha, na ajọ ahaghị nhata dị n’ụwa taa. Ka a sịkwa ihe mere Bible ji sị: “Amamihe nke ụwa nke a bụ ihe nzuzu n’ebe Chineke nọ”! (1 Ndị Kọrint 3:19) Ka o sina dị, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ na-eji nzuzu họrọ ịta ahụhụ kama ige izi ihe Jehova ntị. (Abụ Ọma 14:1-3; 107:17) Ndị Kraịst, ndị nabataworo izi ihe Chineke, na-ezere ịdaba n’ọnyà ahụ.
17. Olee ‘ihe a na-akpọ ihe ọmụma n’ụzọ ụgha’ nke Setan kwaliteworo, oleekwa mkpụrụ ndị ọ mịpụtaworo?
17 Pọl degaara Timoti akwụkwọ, sị: “Biko Timoti, na-eche ihe ahụ e nyere gị n’aka idebe, na-eze okwu efu nile nke e merụrụ emerụ nke ihe ahụ a na-akpọ ihe ọmụma n’ụzọ ụgha, ha na nguzogide ya nile; bụ́ ihe ọmụma nke ụfọdụ kwupụtara wee hie n’ihe banyere okwukwe anyị.” (1 Timoti 6:20, 21) “Ihe ọmụma” ahụ na-anọchitekwa anya ozizi ndị mmụọ ọjọọ. N’ụbọchị Pọl, o yiri ka ò zoro aka n’ebe echiche ndapụ n’ezi ofufe nke ụfọdụ nọ n’ime ọgbakọ na-akwalite. (2 Timoti 2:16-18) E mesịa, ihe ahụ a na-akpọ ihe ọmụma n’ụzọ ụgha, dị ka ozizi Gnostic na nkà ihe ọmụma ndị Gris, merụrụ ọgbakọ. N’ụwa taa, ozizi ekweghị na Chineke, amaghị ma Chineke ọ̀ dị, nchepụta evolushọn dị iche iche, na oké nkatọ nke Bible bụ ihe atụ dị iche iche nke ihe a na-akpọ ihe ọmụma n’ụzọ ụgha, dị ka echiche ndị na-ekwekọghị n’Akwụkwọ Nsọ nke ndị si n’ezi ofufe dapụ n’oge a na-akwalite. Mkpụrụ nke ihe a dum a na-akpọ ihe ọmụma n’ụzọ ụgha ka a na-ahụ ná nretọ nke omume, mgbasapụ nke asọpụrụghị ịbụ isi, emeghị ihe n’eziokwu, na ịchọ ọdịmma onwe onye nanị nke e ji mara usoro ihe Setan.
Ịrapagide n’Izi Ihe Chineke
18. Olè ndị taa na-achọ izi ihe Chineke?
18 Ọ bụ ezie na Setan anọwo na-eji ozizi ndị mmụọ ọjọọ na-emejupụta ụwa eri oge ahụ n’Iden, e nwewo mgbe nile ụfọdụ ndị chọrọ izi ihe Chineke. Ndị dị otú ahụ na-eru ọtụtụ nde taa n’ọnụ ọgụgụ. Ha gụnyere ndị fọdụrụ ná ndị Kraịst e tere mmanụ ndị nwere olileanya ahụ e ji n’aka nke iso Jisọs chịa achị n’Alaeze eluigwe ya na oké ìgwè mmadụ na-amụbawanye nke “atụrụ ọzọ” ahụ bụ́ ndị olileanya ha bụ iketa ógbè elu ụwa nke Alaeze ahụ. (Matiu 25:34; Jọn 10:16; Mkpughe 7:3, 9) Taa, a chịkọtawo ndị a n’otu nzukọ zuru ụwa ọnụ nke okwu Aịsaịa na-enwe mmezu ya n’ahụ ya: “Ụmụ gị nile ga-abụ ndị mmụta Jehova; udo nke ụmụ gị ga-abakwa ụba.”—Aịsaịa 54:13.
19. Olee ihe ịbụ onye Jehova ziri ihe gụnyere?
19 Ịbụ onye Jehova ziri ihe karịrị nanị ịmara ezi ozizi—ọ bụ ezie na nke ahụ dị mkpa. Jehova na-ezi anyị otú anyị ga-esi bie ndụ, otú anyị ga-esi tinye izi ihe Chineke n’ọrụ ná ndụ onwe anyị. Dị ka ihe atụ, anyị na-eguzogide ịchọ ọdịmma onwe onye nanị, omume rụrụ arụ, na mmụọ nke nnwere onwe, bụ́ ndị jupụtara n’ụwa gburugburu anyị. Anyị na-ahụ oké nchụso nke akụ̀ na ụba n’ụwa nke a dị ka ihe ọ bụ—ihe na-eweta ọnwụ. (Jemes 5:1-3) Ọ dịghị mgbe anyị na-echefu izi ihe Chineke e kwupụtara n’okwu ndị nke Jọn onyeozi bụ́: “Unu ahụla ụwa, ma ọ bụ ihe nke dị n’ụwa n’anya. Ọ bụrụ na onye ọ bụla ahụ ụwa n’anya, ịhụnanya nke Nna anyị adịghị n’ime ya.”—1 Jọn 2:15.
20, 21. (a) Gịnị ka Setan ji eme ihe ná mgbalị ya ime ka ụmụ mmadụ kpuo ìsì? (b) Olee ngọzi ndị na-abịara ndị rapagidere n’izi ihe Chineke?
20 Mmetụta nke ozizi ndị mmụọ ọjọọ n’ahụ ndị o ribidoro bụ nke a na-ahụ n’okwu ndị Pọl gwara ndị Kọrint: “[Setan] mere ka anya nke uche nke ndị na-ekweghị ekwe kpuo ìsì n’etiti ha, ka inye ìhè nke ozi ọma nke ebube Kraịst, Onye bụ onyinyo Chineke, wee ghara ịwakwasị ha.” (2 Ndị Kọrint 4:4) Setan ga-achọ ikpu ezi ndị Kraịst ìsì n’otu ụzọ a kwa. Laa azụ n’Iden, o jiri agwọ duhie otu n’ime ndị ohu Chineke. Taa, ọ na-eji ihe nkiri nke ime ihe ike ma ọ bụ omume rụrụ arụ na usoro ihe omume dị iche iche nke telivishọn eme ihe. Ọ na-eji redio, akwụkwọ ọgụgụ, na egwú eme ihe. Ngwá agha dị ike o ji eme ihe bụ mkpakọrịta ọjọọ. (Ilu 4:14; 28:7; 29:3) Na-amata mgbe nile ihe ihe ndị dị otú ahụ dị ka ha dị n’ezie—ngwá ọrụ na ozizi nke ndị mmụọ ọjọọ.
21 Cheta, okwu Setan n’Iden bụ ụgha; a nwapụtara okwu Jehova ịbụ eziokwu. Eri oge ochie ndị ahụ, otu ihe ahụ anọwo na-abụ eziokwu. A nwapụtawo Setan ịbụ onye ụgha mgbe nile, ma izi ihe Chineke adịghị mgbe ọ na-ahapụ ịbụ eziokwu. (Ndị Rom 3:4) Ọ bụrụ na anyị arapara n’Okwu Chineke, anyị ga-anọgide n’akụkụ ga-emeri n’agha ahụ dị n’etiti eziokwu na ụgha. (2 Ndị Kọrint 10:4, 5) Mgbe ahụ, ka anyị kpebisie ike ịjụ ozizi nile nke ndị mmụọ ọjọọ. N’ụzọ dị otú ahụ anyị ga-atachi obi ruo mgbe agha ahụ dị n’etiti eziokwu na ụgha ga-agwụ. Eziokwu ga-emeriworị. Setan ga-apụ n’anya, ọ bụkwa nanị izi ihe Chineke ka a ga-anụ n’ụwa.—Aịsaịa 11:9.
Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?
◻ Olee mgbe mbụ a nụrụ ozizi nke ndị mmụọ ọjọọ?
◻ Olee ụgha ụfọdụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ na-akwalite?
◻ N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Setan si arụsi ọrụ ike nke ukwuu taa?
◻ Gịnị ka Setan ji akwalite ozizi nke ndị mmụọ ọjọọ?
◻ Ngọzi ndị dị aṅaa dịịrị ndị rapagidere n’izi ihe Chineke?
[Foto dị na peeji nke 9]
A nụrụ ozizi nke ndị mmụọ ọjọọ nke mbụ ya n’ogige Iden
[Foto dị na peeji nke 10]
Izi ihe Chineke banyere ihe mgbapụta ahụ na Alaeze ahụ na-enye olileanya e nwere nanị ya maka ihe a kpọrọ mmadụ