-
Gịnị Mere Chineke Ji Hapụ Ụmụ Mmadụ Ka Ha Na-ata Ahụhụ?Ụlọ Nche—2014 | Jenụwarị 1
-
-
Sarah: Ama m. M mụtara ya na Sọnde skul mgbe m dị obere. Chineke gwara ha erila mkpụrụ osisi ahụ, ha akpọchie ntị rie ya.
-
-
Gịnị Mere Chineke Ji Hapụ Ụmụ Mmadụ Ka Ha Na-ata Ahụhụ?Ụlọ Nche—2014 | Jenụwarị 1
-
-
Mary: Ị gụtara ya. Ka anyị leruo amaokwu ndị ahụ anya. Ihe mbụ anyị gụtara bụ na agwọ gwara Iv okwu. Ebe ọzọ na Baịbụl kwuru na ọ bụ Setan bụ́ Ekwensu ji agwọ ahụ gwa Iv okwu.c Setan jụrụ Iv ajụjụ gbasara iwu Chineke nyere ha banyere otu osisi dị n’ubi ahụ. Gịnị ka Chineke gwara Adam na Iv na ọ bụ ihe ga-eme ha ma ha rie mkpụrụ si n’osisi ahụ?
Sarah: Ọ gwara ha na ha ga-anwụ.
Mary: Gbam! Mgbe Iv zachara Setan azịza ahụ, Setan boro Chineke ebubo. Ọ gwara Iv, sị: “Unu agaghị anwụ ma ọlị.” Setan kpọrọ Chineke onye ụgha.
Sarah: Anụtụbeghị m ihe a i kwuru.
Mary: Okwu Setan kpatara mgbe o boro Chineke ebubo na ọ bụ onye ụgha abụghị ihe a ga-edozili ngwa ngwa. Ị̀ ghọtara ihe mere o ji dị otú ahụ?
Sarah: Mba. O dochaghị m anya.
Mary: Ka m meere gị ihe atụ ga-eme ka ị ghọta ihe m na-ekwu. Ka e were ya na otu ụbọchị, abịakwutere m gị, sị gị na m ka gị ike. Olee otú ị ga-esi egosi m na ihe m kwuru abụghị eziokwu?
Sarah: M nwere ike ịsị gị, ‘Ngwanụ ka anyị nwaa, ka anyị mata mbe abụọ nke bụ́ oké.’
Mary: I kwutere ya. I nwere ike ịchọta ihe dị ezigbo arọ, kwuzie ka a mara onye ga-ebuli ya n’ime anyị abụọ. Ọ gaghị ewe oge a mata mbe abụọ nke bụ́ oké.
Sarah: Aghọtala m ihe ị na-ekwu.
Mary: Ma, ọ bụrụkwanụ na ihe m gwara gị bụ na ị bụ onye ụgha? Otú a ga-esi achọpụta ma ihe m kwuru ọ̀ bụ eziokwu ga-adịzi iche.
Sarah: Ọọ ya. Ọ ga-adị iche.
Mary: A naghị eji ọkpụkpụ aka amata ma mmadụ ọ̀ bụ onye ụgha ka ọ̀ bụ na ọ bụghị.
Sarah: Nke ahụ bụ eziokwu.
Mary: Naanị otú a ga-esi amata ma ihe m kwuru ọ̀ bụ eziokwu bụ ikwe ka oge gafee ka ndị mmadụ lewe anyị abụọ, jirizie aka ha mata onye bụ́ onye ụgha.
Sarah: Aghọtawala m ihe ị na-ekwu.
Mary: Legodị anya n’ebe ndị ahụ anyị gụrụ na Jenesis. Setan ò kwuru na ya ka Chineke ike?
Sarah: Mba.
Mary: Ọ gaghị ewe Chineke oge igosi na ya ka ya ike. Ma, kama ikwu na ya ka Chineke ike, Setan sịrị na ihe Chineke kwuru abụghị eziokwu. E nwere ike ịsị na ọ gwara Iv, sị: ‘Chineke ghaara unu ụgha. Ọọ mụnwa na-agwa unu eziokwu.’
-