Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ihe Mere Ihe Ọjọọ Ka Ji Dịrị
    Ụlọ Nche—2007 | Septemba 15
    • Bible gwara anyị ihe merenụ. Setan bụ́ Ekwensu ji agwọ bịakwute Iv ma jụọ ya, sị: “Ọ̀ ga-abụ ezie na Chineke sịrị, Unu erila mkpụrụ sitere n’osisi ọ bụla nke ubi a a gbara ogige?” Mgbe Iv gwara ya iwu Chineke nyere ha, Setan gwara Iv, sị: “Ọ dịghị ọnwụ unu na-aghaghị ịnwụ: n’ihi na Chineke maara na n’ụbọchị unu ga-eri mkpụrụ sitere na ya, mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya unu, unu ewee dị ka Chineke, na-ama ezi ihe na ihe ọjọọ.” N’ihi ya, osisi ahụ bịara yie ihe mara nnọọ mma nye Iv nke mere ka “o were ụfọdụ n’ime mkpụrụ ya, rie.” Bible kwukwara, sị: “O nyekwa di ya, tinyere onwe ya, o wee rie.” (Jenesis 3:1-6) Ma Adam ma Iv si otú ahụ jiri ikike ha nwere ikpebiri onwe ha ihe ha ga-eme mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi ma mee mmehie site n’inupụrụ Chineke isi.

      Ị̀ ghọtara otú ihe ahụ merenụ dịruru ná mkpa? Ekwensu gbaghara ihe Chineke gwara Adam. Okwu Setan pụtara na enyemaka Jehova adịghị Adam na Iv mkpa iji kpebiere onwe ha ihe ga-abara ha uru na ihe ga-aghọ ha ahịa. N’ihi ya, ihe iseokwu ahụ Setan welitere mere ka e nwewe obi abụọ ma ọ̀ bụ Jehova ka o ruuru ịchị ụmụ mmadụ. Ya mere, ihe iseokwu gbara ọkpụrụkpụ Setan welitere bụ ma ọ̀ bụ Jehova kwesịrị ịchị ụmụ mmadụ. Olee ihe ezi Chineke ahụ mere banyere ihe iseokwu ahụ?

  • Ihe Mere Ihe Ọjọọ Ka Ji Dịrị
    Ụlọ Nche—2007 | Septemba 15
    • Ihe dị ka puku afọ isii agafeela kemgbe Setan kwuru na ọ bụghị Chineke ka o ruuru ịchị ụmụ mmadụ. Gịnị ka ihe ndị merela n’oge ndị gara aga gosirila? Tụlee akụkụ abụọ nke ebubo ahụ Setan boro Chineke. Setan gwara Iv hoo haa, sị: “Ọ dịghị ọnwụ unu na-aghaghị ịnwụ.” (Jenesis 3:4) Setan kpọrọ nnọọ Jehova onye ụgha site n’ịgwa Adam na Iv na ọ dịghị ọnwụ ha ga-anwụ ma ọ bụrụ na ha erie mkpụrụ osisi ahụ a machibidoro iwu. Nke a bụ nnọọ ajọ ebubo! Ọ bụrụ na Chineke ekwughị eziokwu n’okwu a, olee otú a ga-esi tụkwasị ya obi n’ihe ọ bụla ọzọ? Otú ọ dị, olee ihe oge gafeworonụ gosirila?

      Adam na Iv malitere ịrịa ọrịa, inwe ihe mgbu, ịka nká ma mesịa nwụọ. Bible kwuru, sị: “Ụbọchị nile nke Adam dị ndụ wee bụrụ [narị afọ itoolu na iri atọ]: o wee nwụọ.” (Jenesis 3:19; 5:5) Adam bufekwara ụmụ mmadụ nile mmehie na ọnwụ. (Ndị Rom 5:12) Oge gafeworonụ egosiwo na Setan bụ “onye ụgha, bụrụkwa nna nke ụgha,” o gosikwara na Jehova bụ “Chineke nke eziokwu.”—Jọn 8:44; Abụ Ọma 31:5.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya