Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbq isiokwu 82
  • Baịbụl na Sayensị Hà Na-ekwu Otu Ihe?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Baịbụl na Sayensị Hà Na-ekwu Otu Ihe?
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Baịbụl kwuru
  • È nwere ihe Baịbụl kwuru na-adabaghị n’ihe ndị sayensị chọpụtara?
  • Ihe Baịbụl Kọwaara Anyị
    Teta!—2021
  • Ihe Ndị Ọkà Mmụta Sayensị Chọpụtarala Ọ̀ Na-emegide Ihe E Dere na Jenesis?
    Teta!—2006
  • Otú E Si Kee Ihe
    Teta!—2014
  • Ọ̀ Bụ Akụkọ Ifo Ka Ọ̀ Bụ Eziokwu?
    Teta!—2008
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
ijwbq isiokwu 82
Ụwa, planet dị iche iche, kpakpando, iberibe snoo, na akwụkwọ ndụ. Ndị sayensị na-amụ gbasara ihe ndị a Chineke kere

Baịbụl na Sayensị Hà Na-ekwu Otu Ihe?

Ihe Baịbụl kwuru

Ee. Ha na-ekwu otu ihe. Ọ bụ eziokwu na Baịbụl abụghị akwụkwọ sayensị, ihe ọ bụla o kwuru gbasara sayensị na-adaba n’ihe ndị sayensị chọpụtara. Legodị ihe ụfọdụ gosiri na sayensị na Baịbụl na-ekwu otu ihe nakwa na ihe Baịbụl kwuru dị ezigbote iche n’ihe ọtụtụ ndị kweere n’oge a na-ede Baịbụl.

  • Eluigwe na ụwa nwere oge ha malitere ịdị. (Jenesis 1:1) Ma, ihe a na-akọ n’ọtụtụ akụkọ ifo ndị oge ochie bụ na eluigwe na ụwa nọkatara dịrị, ọ bụghị na e kere ha eke. Ndị Babịlọn kweere na chi ndị mere ka eluigwe na ụwa dịrị si n’oké osimiri abụọ. A na-akọkwa n’akụkọ ifo ndị ọzọ na eluigwe na ụwa si n’otu nnukwu àkwá pụta.

  • Ọ bụ Chineke nyere iwu ndị na-achị ihe ndị dị n’eluigwe nakwa n’ụwa, ọ bụghị chi ọzọ dị iche iche. (Job 38:33; Jeremaya 33:25) Ma, ihe a na-akọ n’ebe niile n’ụwa bụ na ihe niile gbasara ụmụ mmadụ dị chi dị iche iche n’aka nakwa na chi ndị a na-emesi ha ike mgbe ụfọdụ.

  • Ọ dịghị ihe e kokwasịrị ụwa na ya. (Job 26:7) Ọtụtụ ndị oge ochie kweere na ụwa dị larịị nakwa na e nwere otu nnukwu anụmanụ bu ya. Anụmanụ a nwere ike ịbụ atụ ma ọ bụkwanụ mbe mmiri.

  • Anwụ na-amịrị mmiri si n’oké osimiri nakwa n’ebe ndị ọzọ gaa n’ígwé. E mechaakwa mmiri ahụ dị n’ígwé ezoo. Ya zowe, o nwere ike ịbụ snoo ma ọ bụ akụ́ mmiri ígwé ma ọ bụkwanụ mmiri ozuzo nkịtị ma sọbazie n’osimiri nakwa n’iyi dị iche iche. (Job 36:27, 28; Ekliziastis 1:7; Aịzaya 55:10; Emọs 9:6) Ndị Grik oge ochie chere na mmiri dị n’osimiri si n’oké osimiri dị n’ime ala. Ihe a ka ndị mmadụ nọ na-eche ruo n’ihe dị ka narị afọ atọ gara aga.

  • Ugwu nwere ike ịdị taa, echi ọ gaghịzi adị. Mmiri tochibukwara ugwu ndị e nwere taa. (Abụ Ọma 104:6, 8) Ma, ihe a na-akọ n’ọtụtụ akụkọ ifo bụ na ọ bụ chi dị iche iche kere ugwu ha adịrị otú ha dị taa.

  • Ịdị ọcha na-eme ka ahụ́ dị mmadụ mma. Ụfọdụ n’ime iwu ndị e nyere ụmụ Izrel bụ gbasara ihe ndị ha ga-asa ma ha metụ ozu aka, ịkpọpụ ndị bu ọrịa na-efe efe iche ruo mgbe ha gbakere, nakwa ikpochi nsị mmadụ nyụrụ ájá. (Levitikọs 11:28; 13:1-5; Diuterọnọmi 23:13) Ma n’oge e nyere ndị Izrel iwu ndị ahụ, ndị Ijipt na-eme ihe dị iche. Ọ na-abụ onye merụọ ahụ́, ha agwakọta nsị mmadụ na ihe ndị ọzọ tee n’ebe onye ahụ merụrụ ahụ́.

È nwere ihe Baịbụl kwuru na-adabaghị n’ihe ndị sayensị chọpụtara?

Anyị leruo ihe Baịbụl kwuru anya, anyị ga-achọpụta na e nweghị. Ugbu a, ka anyị leba anya n’ihe Baịbụl kwuru ụfọdụ ndị chere na ha adabaghị n’ihe ndị sayensị chọpụtara:

Ụgha: Baịbụl kwuru na Chineke ji ụbọchị isii nkịtị kee eluigwe na ụwa.

Eziokwu: Baịbụl kwuru na Chineke kere eluigwe na ụwa ná mmalite. O nweghị oge ọ kpọrọ aha. (Jenesis 1:1) Ihe ọzọkwa bụ na mgbe Jenesis isi mbụ kwuru gbasara ụbọchị dị iche iche e kere ihe, o kwughị awa ole ụbọchị ndị ahụ bụ. Baịbụl kwudịrị na oge niile o were iji kee ma eluigwe ma ụwa bụ otu ‘ụbọchị.’—Jenesis 2:4.

Ụgha: Baịbụl kwuru na e bu ụzọ kee ahịhịa na osisi dị iche iche. Mgbe e kechara ha, e keziri anyanwụ ka o nwee ike na-enyere ha aka ịna-eme nke ọma.—Jenesis 1:11, 16.

Eziokwu: Baịbụl kwuru na e bu ụzọ kee anyanwụ, nke bụ́ otu n’ime kpakpando ndị dị ‘n’eluigwe,’ tupu e kee ahịhịa na osisi dị iche iche. (Jenesis 1:1) Ìhè anyanwụ rutere n’ụwa ‘n’ụbọchị’ nke mbụ, ya bụ, n’oge na-abụghị ụbọchị nkịtị e kere ihe. Ka ọ na-erule ‘n’ụbọchị’ nke atọ, mbara ígwé agbachapụla, ìhè anyanwụ maliteziri inyere ahịhịa na osisi aka ịna-eme nke ọma. (Jenesis 1:3-5, 12, 13) Ọ bụzi ka oge na-aga ka anyanwụ pụtara otú onye nọ n’ụwa nweziri ike ịna-ahụ ya nke ọma.—Jenesis 1:16.

Ụgha: Baịbụl kwuru na anyanwụ na-agba ụwa gburugburu.

Eziokwu: Ekliziastis 1:5 sịrị: “Anyanwụ na-awa, anyanwụ na-adakwa;Ọ na-emekwa ngwa ngwa laghachi n’ebe o si awa.” Mana, ihe ebe a na-ekwu bụ ihe ọ dị onye nọ n’ụwa ka anyanwụ ọ̀ na-eme. Taakwa, ndị mmadụ ka na-ekwu na anyanwụ na-awa ma ọ bụkwanụ na ọ na-ada, n’agbanyeghị na ha ma na ọ bụ ụwa na-agba anyanwụ gburugburu.

Ụgha: Baịbụl kwuru na ụwa dị larịị.

Eziokwu: “N’ebe ụwa sọtụrụ” e kwuru gbasara ya na Baịbụl apụtaghị na ụwa dị mbadamba ma nwee ebe o jedebere. (Ihe e dere n’ala ala peeji Ọrụ Ndịozi 1:8). Kama, ọ pụtara ‘ebe kacha anya n’ụwa’ ma ọ bụ ụwa niile.—Aịzaya 11:12; Luk 13:29.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya