“Mgbe E Mesịrị O Nyekwa Di Ya Ụfọdụ”
ADAM ọ̀ nọ ya mgbe agwọ ahụ gwara Iv okwu wee rafuo ya gaa n’inupụrụ Chineke isi? Bible egosighị nke a. Jenesis 3:6 [NW] kọrọ na Iv “wee malite iwere mkpụrụ ya na iri ya. Mgbe e mesịrị o nyekwa di ya ụfọdụ mgbe ya na ya nọ.” Otú ọ dị, nsụgharị Bible ụfọdụ na-enye echiche dị iche na nke a. Nsụgharị King James Version dere ya n’ụzọ dị otú a: “O wee were mkpụrụ osisi ahụ, riekwa, nyekwa di ya bụ́ onye ya na ya nọ, o wee riekwa.”
Ngwaa okwu Hibru ahụ a sụgharịrị ịbụ “nye” dị n’ọnọdụ okwu nke na-ezuchaghị okè, e jikọtakwara ya na ụdị pụrụ iche nke okwu njikọ ahụ bụ “kwa” [Hibru, waw], wee si otú a na-egosi otu ihe nke sochiri ibe ya n’ụzọ ezi uche dị na ya. Ya mere, nsụgharị New World Translation ji, ọ bụghị nanị “kwa” sụgharịa ebe dị iche iche waw pụtara, bụ́ nke na-ejikọta ihe omume dị iche iche ndị dị na Jenesis 3:6, kama o jikwa okwu njikọ ndị ọzọ mee ihe ndị dị ka “n’ihi nke a,” “ya mere,” na “mgbe e mesịrị.” Otú a, New World Translation nwere ihe ndabere siri ike iji sụgharịa ya dị ka e depụtara ya n’elu.
Adam ọ̀ gaara nnọọ agbachi nkịtị mgbe mkparịta ụka ahụ na-aga n’ihu n’etiti nwunye ya na agwọ ahụ, na-ege ntị n’okwu ụgha nile na okwu nkwutọ nile nke onye nnupụisi ahụ a na-adịghị ahụ anya nke nọ n’azụ agwọ ahụ na-ekwu? Ọ bụ ihe na-akpali mmasị ịhụ na onye Germany bụ ọkà mmụta Bible bụ J. P. Lange jụrụ echiche nke a wee kwuo, sị: “O siri ike iche nnọọ na nwoke ahụ nọ ya n’oge ọnwụnwa ahụ na-aga n’ihu, ọbụna na ọ gbachiri nkịtị.” N’ịkọwakwa okwu ahụ bụ “bụ́ onye ya na ya nọ,” onye Juu na-enye nkọwa, bụ́ B. Jacob hotara na ọ “[pụtaghị] onye ya na ya guzo (mgbe ihe omume ahụ bu ụzọ na-aga n’ihu ma ọ bụ mgbe ọ na-eri mkpụrụ osisi ahụ).”
Nkwurịta okwu nke Iv na agwọ ahụ gosiri na di ya agwaworị ya ihe banyere iwu Chineke ka ha ghara iri mkpụrụ sitere n’osisi ahụ. (Jenesis 3:3) Ya mere, dị ka onye bụ isi nke Iv, Adam arụzuwo ibu ọrụ ahụ. Ekwensu lefuuru ndokwa ọbụbụisi ahụ Chineke mere anya, wee jiri akọ jiri eziokwu ahụ nke bụ na Iv nọ nanị ya wee mee ihe. Nwanyị ahụ mesịrị zaghachi, sị: “Agwọ ahụ rafuru m, m wee rie.” (Jenesis 3:13) A rafuru Iv n’ihi na o kweere n’okwu ụgha, ma nke a emeghị ka mmehie ya bụrụ ihe ziri ezi. Ihe nlereanya ịdọ aka ná ntị nke a na-egosi na anyị apụghị inwe ihe ngọpụ ọ bụla iji mee ihe bụ ihe ọjọọ n’anya Jehova.—1 Timoti 2:14.