-
Otú A Ga-esi Bibie Ụwa AỤlọ Nche—2012 | Septemba 15
-
-
15. A lụchaa agha Amagedọn, gịnị ka a ga-eme Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya?
15 Setan ga-ebu ụzọ hụ ka e kpochapụrụ nzukọ ya kpamkpam n’ụwa. A ga-elebaziri Setan anya. Jọn kọrọ ihe ga-emenụ. (Gụọ Mkpughe 20:1-3.) Jizọs Kraịst, bụ́ “mmụọ ozi . . . ji mkpịsị ugodi nke abis,” ga-ejide Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya, tụba ha n’ime abis, hapụkwa ha ebe ahụ ruo otu puku afọ. (Luk 8:30, 31; 1 Jọn 3:8) Ọ bụ otú ahụ ka Jizọs ga-esi malite igwepịa isi agwọ ahụ.c—Jen. 3:15.
-