Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Jehova Bụ “Onye Na-ekpughe Ihe Nzuzo”
    Ụlọ Nche—2012 | Jun 15
    • 4. Ole ndị bụ mkpụrụ nwaanyị ahụ, gịnịkwa ka mkpụrụ ahụ ga-arụ?

      4 Obere oge ka Adam na Iv nupụchara isi n’Iden, Jehova kwere nkwa na otu “nwaanyị” ga-enwe “mkpụrụ.”a (Gụọ Jenesis 3:15.) Mkpụrụ ahụ ga-emecha gwepịa agwọ ahụ, bụ́ Setan, isi. Jehova mechara mee ka a mata na mkpụrụ ahụ ga-esi n’ezinụlọ Ebreham, na ọ ga-esi ná mba Izrel, na ọ ga-abụ onye Juda, bụrụkwa nwa nwa Eze Devid. (Jen. 22:15-18; 49:10; Ọma 89:3, 4; Luk 1:30-33) Onye bụ́ isi sekpụ ntị ná mkpụrụ ahụ bụ Jizọs Kraịst. (Gal. 3:16) Ndị so ya bụrụ mkpụrụ ahụ bụ Ndị Kraịst e tere mmanụ. (Gal. 3:26-29) Ọ bụ Jizọs na ndị a e tere mmanụ ga-achị n’Alaeze Chineke, nke bụ́ ọchịchị Chineke ga-eji zọpịa Setan.—Luk 12:32; Rom 16:20.

      5, 6. (a) Ọchịchị ole kpara ike n’ụwa ka Daniel na Jọn kwuru banyere ha? (b) Gịnị ka isi anụ ọhịa ahụ e kwuru okwu ya ná Mkpughe nọchiri anya ya?

      5 Amụma mbụ ahụ e buru n’Iden kwuru na Setan ga-enwe “mkpụrụ.” Mkpụrụ Setan ga-ebuso mkpụrụ nwaanyị ahụ iro, ma ọ bụ kpọọ ya asị. Ole ndị bụ mkpụrụ agwọ ahụ? Ọ bụ ndị niile kpọrọ Chineke asị ma na-emegide ndị ya otú ahụ Setan na-eme. Kemgbe ụwa, Setan ahaziela mkpụrụ ya ka ọ bụrụ ọchịchị ma ọ bụ alaeze dị iche iche. (Luk 4:5, 6) Ma ọ bụ naanị alaeze ole na ole bụ ndị kpagburu ndị Chineke, ya bụ, ndị Izrel oge ochie ma ọ bụ ọgbakọ Ndị Kraịst e tere mmanụ. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị buru ihe a n’obi? Ọ bụ n’ihi na ọ ga-eme ka anyị ghọta ihe mere ọhụụ Daniel na Jọn ji kwuo banyere naanị ọchịchị asatọ kpara ike n’ụwa.

  • Jehova Bụ “Onye Na-ekpughe Ihe Nzuzo”
    Ụlọ Nche—2012 | Jun 15
    • 7. Gịnị ka isi nke mbụ ahụ nọchiri anya ya, gịnịkwa mere anyị ji kwuo otú ahụ?

      7 Isi nke mbụ nke anụ ọhịa ahụ nọchiri anya Ijipt. Maka gịnị? Ọ bụ maka na Ijipt bụ mba mbụ chịrị ụwa nke kpọrọ ndị Chineke asị ma lụso ha ọgụ. Chineke kwere Ebreham nkwa na a ga-esi n’ezinụlọ ya nweta mkpụrụ nwaanyị ahụ. Ndị Izrel bụ ụmụ Ebreham. Mgbe ha bi n’Ijipt, ha mụbara, ndị Ijipt malitekwara imegbu ha. Setan chọrọ igbukpọ ndị Chineke tupu a mụọ mkpụrụ ahụ. Olee otú o si chọọ ime ya? O mere ka Fero nye iwu ka e gbuo nwa ọhụrụ Izrel ọ bụla bụ́ nwoke. Jehova kụghasịrị ihe ahụ Fero chọrọ ime ma napụta ndị ya n’ohu ha na-agba n’Ijipt. (Ọpụ. 1:15-20; 14:13) Jehova mechara nye ndị Izrel Ala Nkwa ahụ.

      8. Gịnị ka isi nke abụọ ahụ nọchiri anya ya, gịnịkwa ka ọ gbalịrị ime?

      8 Isi nke abụọ nke anụ ọhịa ahụ nọchiri anya Asiria. Alaeze ukwu ahụ gbalịkwara igbukpọ ndị Chineke. N’eziokwu, Jehova si n’aka Asiria taa alaeze ebo iri Izrel ahụhụ n’ihi na ha nọ na-ekpere arụsị, na-enupụkwara Chineke isi. Ma, Asiria gbalịrị ibibi Jeruselem. O nwere ike ịbụ na Setan chọrọ igbukpọ ezinụlọ ndị eze na Jeruselem, bụ́ ebe a ga-emecha mụọ Jizọs. Jehova achọghị ka e bibie Jeruselem. Ọ bụ ya mere o ji bibie ndị agha Asiria ma zọpụta ndị ya.—2 Eze 19:32-35; Aịza. 10:5, 6, 12-15.

  • Jehova Bụ “Onye Na-ekpughe Ihe Nzuzo”
    Ụlọ Nche—2012 | Jun 15
    • 13 Jehova ji Alaeze Ukwu Midia na Peshia merie Babịlọn ma mee ka ndị Izrel laghachi n’ala ha, otú ahụ o buru n’amụma. (2 Ihe 36:22, 23) Ma, alaeze ahụ mechara gbalịa ibibi ndị Chineke. Akwụkwọ Baịbụl bụ́ Esta kọrọ otú praịm minista ndị Peshia, bụ́ Heman, si kpaa nkata igbu ndị Juu niile n’alaeze ukwu ahụ n’ụbọchị a kara aka. Ma, Jehova zọpụtara ndị ya ọzọ n’aka ndị bụ́ mkpụrụ Setan. (Esta 1:1-3; 3:8, 9; 8:3, 9-14) N’ihi ya, Midia na Peshia bụ isi nke anọ nke anụ ọhịa ahụ e kwuru okwu ya ná Mkpughe.

  • Jehova Bụ “Onye Na-ekpughe Ihe Nzuzo”
    Ụlọ Nche—2012 | Jun 15
    • 16. Gịnị ka Antiokọs nke Anọ mere?

      16 Mgbe ndị Gris merichara Peshia, ha chịrị ndị Izrel. N’oge ahụ, ndị Juu alaghachila n’Ala Nkwa ahụ, wughachikwa ụlọ nsọ dị na Jeruselem. Ha ka bụ ndị Chineke, ụlọ nsọ ahụ ha wughachiri ka bụkwa ebe ha nọ na-efe Chineke. Ma, ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ narị afọ abụọ tupu a mụọ Kraịst, Gris nke bụ́ isi nke ise nke anụ ọhịa ahụ, lụsoro ndị Chineke ọgụ. Antiokọs nke Anọ, bụ́ otu n’ime ndị ọchịagha ahụ ketara alaeze Alegzanda, rụrụ ebe a na-achụrụ arụsị àjà n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem ma kwuo na a ga-egbu onye ọ bụla kpere okpukpe ndị Juu. Mkpụrụ Setan alusowakwala ndị Chineke ọgụ! Ma n’oge na-adịghị anya, alaeze ọzọ nọchiri Gris ma chịwa ụwa. Olee alaeze ga-abụ isi nke isii nke anụ ọhịa ahụ?

  • Jehova Bụ “Onye Na-ekpughe Ihe Nzuzo”
    Ụlọ Nche—2012 | Jun 15
    • 17. Olee otú isi nke isii nke anụ ọhịa ahụ si soro mezuo amụma dị na Jenesis 3:15?

      17 Rom bụ mba na-achị ụwa mgbe Jọn hụrụ anụ ọhịa ahụ n’ọhụụ. (Mkpu. 17:10) Rom bụ isi nke isii nke anụ ọhịa ahụ, o sokwa mezuo amụma ahụ dị na Jenesis 3:15. Setan ji ndị ọchịchị Rom merụọ mkpụrụ ahụ ahụ́ “n’ikiri ụkwụ.” Olee otú o si mee ya? Ha kpere Jizọs ikpe n’ihi ebubo ụgha e boro ya na ọ na-agba ọchịchị ha mgba okpuru, mechaakwa gbuo ya. (Mat. 27:26) Ma, ahụ́ e merụrụ Jizọs lara n’oge na-adịghị anya n’ihi na Jehova kpọlitere ya.

      18. (a) Olee mba ọhụrụ Jehova họọrọ ịbụ ndị ya, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị? (b) Olee otú mkpụrụ nke agwọ ahụ si ka na-ebuso mkpụrụ nwaanyị ahụ iro mgbe ọnwụ Jizọs gachara?

      18 Ndị ndú okpukpe Izrel na ndị Rom gbakọtara aka kpaa nkata igbu Jizọs, ọtụtụ ndị Izrel jụkwara ya. N’ihi ya, Jehova jụrụ mba Izrel. (Mat. 23:38; Ọrụ 2:22, 23) Ọ họọrọ mba ọhụrụ ga-abụ ndị ya, ya bụ, “Izrel nke Chineke.” (Gal. 3:26-29; 6:16) Mba ahụ bụ ọgbakọ nke Ndị Kraịst e tere mmanụ, nke ma ndị Juu ma ndị Jentaịl nọ na ya. (Efe. 2:11-18) Mgbe ọnwụ Jizọs na mbilite n’ọnwụ ya gachara, mkpụrụ nke agwọ ahụ ka nọ na-akpọ mkpụrụ nwaanyị ahụ asị ma na-alụso ya ọgụ. Ndị Rom gbalịrị ugboro ugboro ikpochapụ ọgbakọ Ndị Kraịst, nke so bụrụ mkpụrụ nwaanyị ahụ.c

  • Jehova Bụ “Onye Na-ekpughe Ihe Nzuzo”
    Ụlọ Nche—2012 | Jun 15
    • a Nwaanyị ahụ nọchiri anya nzukọ Chineke yiri nwunye ya, nke ndị nọ na ya bụ ndị mmụọ ozi nọ n’eluigwe.—Aịza. 54:1; Gal. 4:26; Mkpu. 12:1, 2.

  • Jehova Bụ “Onye Na-ekpughe Ihe Nzuzo”
    Ụlọ Nche—2012 | Jun 15
    • c Ọ bụ ezie na Rom bibiri Jeruselem n’afọ 70 O.A., mbibi ahụ esoghị mezuo Jenesis 3:15. N’oge ahụ, mba Izrel abụkwaghị ndị Chineke họọrọ.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya