Ihe Mere Okwu Banyere Iden Ji Gbasa Gị
OTU n’ime ihe ndị kacha eju anya ndị ọkà mmụta kwuru mere ha ji arụ akụkọ Iden ụka bụ na amaokwu ndị ọzọ dị na Baịbụl akwadoghị ya. Dị ka ihe atụ, Paul Morris, bụ́ Prọfesọ Na-akụzi Ihe Banyere Okpukpe, dere, sị: “E nweghị ebe ọzọ a kọrọ banyere Iden na Baịbụl.” Ọtụtụ ndị a sịrị bụ́ ndị ọkachamara nwere ike ikwenyere ihe ahụ o kwuru, ma ọ bụghị eziokwu.
Nke bụ́ eziokwu bụ na Baịbụl kwuru banyere Iden, Adam, Iv, na agwọ ahụ ọtụtụ ugboro.a Ma, ihe na-ezighị ezi ndị ọkà mmụta ole na ole kwuru enweghị ihe ha bụ ma ejiri ha tụnyere ihe ka njọ na ihe ka emebi ihe a na-ekwu. Ndị ndú okpukpe na ndị na-akatọ Baịbụl ikwu na akụkọ ndị ahụ a kọrọ na Jenesis banyere ogige Iden emeghị eme bụ nnọọ ịgba Baịbụl ụkwụ. Olee otú o si bụrụ otú ahụ?
Mmadụ agaghị aghọtali ihe e kwuru n’ebe ndị ọzọ na Baịbụl ma ó bughị ụzọ ghọta ihe mere n’Iden. Dị ka ihe atụ, e dere Okwu Chineke inyere anyị aka ịmata azịza nke ajụjụ ndị kacha mkpa ụmụ mmadụ na-ajụ. Ugboro ugboro, ihe Baịbụl zara banyere ajụjụ ndị ahụ metụtara ihe mere n’Iden. Ka anyị tụlee ihe atụ ụfọdụ.
● Olee ihe mere anyị ji aka nká ma na-anwụ anwụ? E kere Adam na Iv ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi ma ha nọgide n’okpuru Jehova. Naanị ihe ga-eme ka ha nwụọ bụ inupụrụ ya isi. N’ụbọchị ahụ ha nupụrụ isi, ha malitere ịnwụ. (Jenesis 2:16, 17; 3:19) Ha ezukwaghị okè, naanị ihe ha nwezikwara ike ibufere ụmụ ha bụ mmehie na ezughị okè. N’ihi ya, Baịbụl kọwara, sị: “Mmehie si n’aka otu mmadụ bata n’ụwa, ọnwụ esikwa ná mmehie bata, ọnwụ wee si otú ahụ gbasaa ruo mmadụ niile n’ihi na ha niile mehiere.”—Ndị Rom 5:12.
● Olee ihe mere Chineke ji kwere ka ajọ omume dịrị? N’ogige Iden, Setan kpọrọ Chineke onye ụgha nke na-ezoro ndị o kere eke ihe ọma. (Jenesis 3:3-5) O si otú ahụ kwuo na otú Jehova si achị ezighị ezi. Adam na Iv họọrọ iso Setan; n’ihi ya, ha jụkwara ọbụbụeze Jehova ma si otú ahụ kwuo na mmadụ nwere ike ikpebiri onwe ya ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. Ebe ikpe ziri ezi na amamihe Jehova zuru okè, ọ maara na e nwere naanị otu ụzọ isi gosi na ihe ahụ Setan kwuru abụghị eziokwu, ya bụ, ikwe ka oge gafee, nye ụmụ mmadụ ohere ịchị onwe ha otú ha họọrọ. Aka Setan na-etinye n’ọchịchị ha so kpata ajọ omume sirila na ya pụta, nke ahụ ejirikwala nwayọọ nwayọọ gosi otu eziokwu gbara ọkpụrụkpụ: Mmadụ agaghị achịli onwe ya n’enwetaghị enyemaka Chineke.—Jeremaya 10:23.
● Olee ihe bụ́ nzube Chineke maka ụwa? Otú Jehova si kee ogige Iden gosiri na ọ chọrọ ka ụwa maa mma. Iji mee ka ụwa niile maa mma otú ahụ, ihe niile dị na ya ana-arụkọkwa ọrụ, Chineke nyere Adam na Iv ọrụ ịmụju ụwa ma ‘mee ka ọ dịrị n’okpuru’ ha. (Jenesis 1:28) Ya mere, nzube Chineke maka ụwa bụ ka ọ bụrụ paradaịs nke ezinụlọ ụmụ Adam na Iv nke zuru okè ma dịrị n’otu bi na ya. Ọtụtụ ihe e kwuru na Baịbụl bụ otú Chineke ga-esi mezuo nzube mbụ ya ahụ.
● Olee ihe mere Jizọs Kraịst ji bịa n’ụwa? Nnupụisi Adam na Iv n’ogige Iden wetaara ha na ụmụ ha niile amamikpe ọnwụ, ma n’ihi ịhụnanya Chineke, o mere ka e nwee olileanya. O zitere Ọkpara ya n’ụwa ka o nye ihe Baịbụl kpọrọ ihe mgbapụta. (Matiu 20:28) Olee ihe nke ahụ pụtara? Jizọs bụ “Adam ikpeazụ”; o mere ihe Adam na-emelighị. Jizọs nọgidere na-abụ mmadụ zuru okè site n’ịnọgide na-erubere Jehova isi. O nyeziri ndụ ya dị ka àjà, ma ọ bụ ihe mgbapụta, bụ́ nke ga-eme ka e nwee ike ịgbaghara ụmụ mmadụ niile kwesịrị ntụkwasị obi mmehie ha, ha emechaakwa nwee ike ibi ụdị ndụ ahụ Adam na Iv biri n’Iden tupu ha emehie. (1 Ndị Kọrịnt 15:22, 45; Jọn 3:16) Jizọs si otú ahụ mee ka e jide n’aka na nzube Jehova nke bụ́ ime ka ụwa ghọọ paradaịs yiri Iden ga-emezurịrị.b
Nzube Chineke adịghị inyoghi inyoghi, ọ bụghịkwa echiche nkà mmụta okpukpe na-edoghị anya. O doro anya. Dị nnọọ ka ogige Iden bụ ebe dịrị adị n’ụwa nke ụmụ anụmanụ na ụmụ mmadụ biri na ya, nkwa Chineke maka ọdịnihu ga-eme eme, ọ ga-emekwa n’oge na-adịghị anya. Nkwa ndị a hà ga-eru gị aka? Ọ dị gị n’aka karịchaa. Chineke chọrọ ka nkwa a ruo mmadụ niile ọ ga-ekwe mee aka, ma ndị birila ndụ ọjọọ.—1 Timoti 2:3, 4.
Ka Jizọs nọ n’ọnụ ọnwụ, ọ gwara otu nwoke nke ndụ ya gbanwere kpamkpam. Nwoke ahụ bụbu onye omekome; ọ maara na ya kwesịrị ọnwụ. Ma, ọ chọrọ ka Jizọs kasie ya obi ma mee ka o nwee olileanya. Olee ihe Jizọs kwuru? “Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.” (Luk 23:43) Ọ bụrụ na Jizọs ga-achọ ịhụ onye ahụ bụ́bu onye omekome n’ebe ahụ—ka a kpọlite ya n’ọnwụ ma nye ya ohere ịdị ndụ ebighị ebi na paradaịs yiri Iden—ọ́ gaghị achọ ka gị onwe gị nwetakwa otu ohere ahụ? Ọ chọrọ! Nna ya chọkwara! Ọ bụrụ na ị chọrọ ịdị ndụ mgbe nke ahụ ga-eme, mee ihe niile i nwere ike ime iji mụta banyere Chineke, bụ́ onye kere ogige Iden.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Dị ka ihe atụ, gụọ Jenesis 13:10; Diuterọnọmi 32:8; 2 Samuel 7:14; 1 Ihe E Mere 1:1; Aịzaya 51:3; Ezikiel 28:13; 31:8, 9; Luk 3:38; Ndị Rom 5:12-14; 1 Ndị Kọrịnt 15:22, 45; 2 Ndị Kọrịnt 11:3; 1 Timoti 2:13, 14; Jud 14; na Mkpughe 12:9.
b Iji matakwuo banyere àjà mgbapụta Kraịst, gụọ isi nke 5 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 10]
AMỤMA NKE JIKỌTARA BAỊBỤL
“M ga-emekwa ka iro dịrị n’etiti gị na nwaanyị ahụ nakwa n’etiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya. Ọ ga-egwepịa gị isi, ị ga-emerụkwa ya ahụ́ n’ikiri ụkwụ.”—Jenesis 3:15.
Nke ahụ bụ amụma mbụ dị na Baịbụl, nke Chineke buru n’Iden. Ole ndị bụ ndị anọ ahụ a kpọrọ aha na ya: nwaanyị ahụ, mkpụrụ ya, agwọ ahụ, na mkpụrụ ya? Olee otú “iro” ahụ e buru n’amụma si mezuo?
AGWỌ AHỤ
Setan bụ́ Ekwensu.—Mkpughe 12:9.
NWAANYỊ AHỤ
Nzukọ Jehova dị n’eluigwe nke ndị nọ na ya bụ ndị mmụọ ozi. (Ndị Galeshia 4:26, 27) Aịzaya kwuru banyere “nwaanyị” ahụ, kwuo na ọ ga-amụta otu mba ime mmụọ n’ọdịnihu.—Aịzaya 54:1; 66:8.
MKPỤRỤ NKE AGWỌ AHỤ
Ndị họọrọ ime uche Setan. —Jọn 8:44.
MKPỤRỤ NKE NWAANYỊ AHỤ
Onye bụ́ isi na ya bụ Jizọs Kraịst, onye si ná nzukọ Jehova nke a na-anaghị ahụ anya dị n’eluigwe bịa n’ụwa. Ndị ọzọ so ná “mkpụrụ” ahụ bụ ụmụnna ime mmụọ Kraịst, bụ́ ndị ha na ya ga-eso chịa n’eluigwe. Ndị Kraịst ahụ e tere mmanụ bụ mba ime mmụọ, bụ́ “Izrel nke Chineke.”—Ndị Galeshia 3:16, 29; 6:16; Jenesis 22:18.
AHỤ́ A GA-EMERỤ YA N’IKIRI ỤKWỤ
Ahụ́ a ga-emerụ Mesaya ahụ, ma ọ ga-ala ala. Setan mere ka e gbuo Jizọs n’ụwa. A kpọlitere Jizọs n’ọnwụ.
NGWEPỊA A GA-EGWEPỊA YA N’ISI
Ngwepịa a ga-egwepịa Setan nke ga-akpatara ya ọnwụ. Jizọs ga-egbu Setan ruo mgbe ebighị ebi. Ọbụna tupu mgbe ahụ, Jizọs ga-emezi ihe Setan malitere imebi n’Iden.—1 Jọn 3:8; Mkpughe 20:10.
Ị chọọ ịhụ ebe a tụlere isiokwu bụ́ isi nke Baịbụl ná mkpirikpi, gụọ broshuọ bụ́ Baịbụl—Gịnị Ka Ọ Na-ekwu? nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
[Foto dị na peeji nke 11]
Adam na Iv tara ahụhụ n’ihi mmehie ha