Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ụzọ E Si Eme Ka Nkekọ Alụmdi Na Nwunye Sie ike
    Ụlọ Nche—1993 | Ọgọst 15
    • Ọbụna ma nke ahụ mee, Jisọs adịghị atụ aro ịgba alụkwaghịm site n’aka ndị na-ekwesịghị ntụkwasị. Ọ bụ ihe dịịrị onye nke aka ya dị ọcha ịtụle ihe ndị pụrụ isi na ya pụta wee kpebie ma ọ chọrọ ịgba alụkwaghịm. Ndị nwunye na-eche echiche ịgba alụkwaghịm n’ihe ndabere Akwụkwọ Nsọ nke a pụkwara ịchọ ịtụle okwu Chineke mgbe o kpere nwanyị mbụ ahụ ikpe maka mmehie ya. Tinyere ikpe ọnwụ ahụ, Chineke gwara Iv hoo haa, sị: “N’ebe di gị nọ ka ọchịchọ gị ga-adị, ya onwe ya ga-achịkwa gị.” (Jenesis 3:16) Akwụkwọ bụ́ Commentary on the Old Testament, nke C. F. Keil na F. Delitzsch dere, na-akọwa “ọchịchọ” nke a dị ka “agụụ siri ike nke yiri nnọọ ọrịa.” A pụrụ ikweta na ọchịchọ nke a esichaghị ike otú ahụ n’ime nwunye ọ bụla, ma mgbe nwunye aka ya dị ọcha na-atụle ịgba alụkwaghịm, ọ ga-abụrụ ya amamihe ịtụle mkpa mmetụta uche nke ụmụ nwanyị ketara site n’aka Iv. Otú ọ dị, ebe ịkwa iko n’akụkụ nke onye ikpe mara pụrụ iduga n’onye nke aka ya dị ọcha ibute ọrịa ndị a na-ebusa site ná mmekọahụ, gụnyere AIDS, ụfọdụ ekpebiwo ịgba alụkwaghịm dị ka Jisọs kọwara.

  • Ụzọ E Si Eme Ka Nkekọ Alụmdi Na Nwunye Sie ike
    Ụlọ Nche—1993 | Ọgọst 15
    • Ikpe ọmụma Jehova kwupụtara n’isi Adam na Iv bukwara amụma ihe ọzọ ná nsogbu ndị ga-ebilite. Banyere mmekọrịta ya na di ya, Jehova gwara Iv, sị: “Ya onwe ya ga-achịkwa gị.” Ọtụtụ ndị bụ di taa, dị ka Isao a kpọtụrụ aha n’isiokwu mbụ anyị, na-achị ndị nwunye ha n’ụzọ obi ọjọọ n’echeghị echiche banyere mmetụta nwunye ha. N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ ndị bụ nwunye na-enwe ọchịchọ maka mmasị di ha. Mgbe a na-emezughị ọchịchọ ahụ, ndị bụ nwunye pụrụ ịchọ iji ike nweta mmasị ahụ ma mee ihe n’ụzọ ịchọ ọdịmma onwe onye nanị. Ebe ọtụtụ ndị bụ di na-achị achị, ọtụtụ ndị nwunye bụrụkwa ndị na-enwe ọchịchọ, ịchọ ọdịmma onwe onye na-ejupụta, udo na-efepụkwa. N’otu akwụkwọ isiokwu ya bụ́ “Ụzọ E Si Enyocha Ịgba Alụkwaghịm nke Taa,” Shunsuke Serizawa sịrị: “Ọ bụrụ na anyị elelịa ịdị ike dị ná mkpọrọgwụ isiokwu a nke ‘ime ihe onye chọrọ,’ ya bụ, idebe mmasị ndị nke onwe onye n’ọnọdụ mbụ, ọ ga-aghọ na mberede ihe na-agaghị ekwe omume inyocha ịgba alụkwaghị m ndị e nwere taa.”

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya