Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • kl isi 6 p. 53-61
  • N’ihi Gịnị Ka Anyị Ji Aka Nká, Na-anwụkwa Anwụ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • N’ihi Gịnị Ka Anyị Ji Aka Nká, Na-anwụkwa Anwụ?
  • Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • NKATA ARỤRỤALA
  • ỤZỌ E SI GAA N’IHU NA NKATA AHỤ A KPARA
  • ỤZỌ MMEHIE NA ỌNWỤ SI GBASAA
  • LEZIE ANYA MAKA ỤZỌ AGHỤGHỌ SETAN!
  • Ì Kweere n’Ezie na Ekwensu Dị Adị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Jisọs Na-azọpụta—N’ụzọ Dị Aṅaa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Gịnị Bụ Mmehie Ahụ Adam na Iv Mere?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Gịnị Bụ Nzube Chineke Maka Ụwa?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
kl isi 6 p. 53-61

Isi nke 6

N’ihi Gịnị Ka Anyị Ji Aka Nká, Na-anwụkwa Anwụ?

1. Gịnị ka ndị ọkà mmụta sayensị na-enwebeghị ike ịkọwa banyere ndụ ụmụ mmadụ?

NDỊ ọkà mmụta sayensị amaghị ihe mere ụmụ mmadụ ji aka nká, na-anwụkwa anwụ. O yiri ka mkpụrụ ndụ anyị hà kwesịrị ịnọgide na-abụ ndị a na-eme ka ha dị ọhụrụ nakwa ka ànyị kwesịrị ịdị ndụ ebighị ebi. Akwụkwọ bụ́ Hyojun Soshikigaku (Nhazi nke Ozuzu Mkpụrụ Ndụ) na-asị: “Ọ bụ nnukwute ihe omimi bụ́ ụzọ ịka nká nke mkpụrụ ndụ si bụrụ nke e jikọrọ ya na ịka nká na ọnwụ nke mmadụ.” Ọtụtụ ndị ọkà mmụta sayensị kwere na e nwere njedebe “ebumpụta ụwa, nke dị n’ime ahụ” nye ndụ. Ì chere na ha ziri ezi?

2. Gịnị ka ụfọdụ meworo n’ihi ọdịdị na-adịghị adịgide adịgide ma ọlị nke ndụ?

2 Ụmụ mmadụ achọsiwo ike mgbe nile ibi ogologo ndụ, ọbụna na ha anwawo inweta anwụghị anwụ. Kemgbe narị afọ nke anọ T.O.A., ọgwụ ndị a haziri n’echiche nke ime ka anwụghị anwụ kwe nnweta dọọrọ mmasị ndị oké ozu China. Ụfọdụ ndị mesịrị chịa alaeze ukwu China nwalere ihe ndị a sị na ha bụ mmiri ọgwụ nke ndụ​—⁠bụ́ ndị e ji mercury mepụta⁠—​wee nwụọ! Gburugburu ụwa, ndị mmadụ kwenyere na ọnwụ abụghị ọgwụgwụ nke ịdị adị ha. Ndị Buddha, Hindu, Alakụba, na ndị ọzọ nwechara olileanya na-egbukepụ egbukepụ nke ndụ mgbe a nwụsịrị. N’ime Krisendọm, ọtụtụ na-eche echiche nke ndụ obi ụtọ nke eluigwe mgbe a nwụsịrị.

3. (a) N’ihi gịnị ka ndị mmadụ ji achọsi ndụ agwụghị agwụ ike? (b) Ajụjụ ndị dị aṅaa banyere ọnwụ ka ọ dị mkpa ka a zaa?

3 Echiche nke obi ụtọ mgbe a nwụsịrị na-egosi ọchịchọ maka ndụ agwụghị agwụ. “Mgbe ebighị ebi ka O tinyeworo n’obi ha,” ka Bible na-ekwu banyere echiche nke ebighị ebi nke Chineke kụnyere n’ime anyị. (Eklisiastis 3:11) O kenyere n’ime ụmụ mmadụ mbụ atụmanya nke na ha pụrụ ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ụwa. (Jenesis 2:​16, 17) Mgbe ahụ, n’ihi gịnị ka ụmụ mmadụ ji anwụ anwụ? Olee otú e si webata ọnwụ n’ime ụwa? Ihe ọmụma Chineke na-amụkwasị ìhè n’ajụjụ ndị a.​—⁠Abụ Ọma 119:105.

NKATA ARỤRỤALA

4. Olee otú Jisọs si mee ka a mata omempụ ahụ kpatara ọnwụ mmadụ?

4 Omempụ na-agbalị ikpuchi ihe ndị pụrụ ịgba ya àmà. Nke a abụwokwa eziokwu banyere onye kpatara otu mpụ nke wetaworo ọnwụ ọtụtụ ijeri mmadụ. Ọ rụgharịwo ọnọdụ isi iji kpuchie ọnwụ ụmụ mmadụ dị ka ihe omimi. Jisọs Kraịst mere ka a mata omempụ nke a mgbe Ọ gwara ndị na-achọ igbu Ya: “Unu onwe unu sitere ná nna unu, bụ́ ekwensu, ọ bụkwa ihe na-agụ nna unu ka unu na-achọ ime. Onye ahụ bụ ogbu mmadụ site na mbụ, o guzoghịkwa n’eziokwu, n’ihi na eziokwu adịghị n’ime ya.”​—⁠Jọn 8:​31, 40, 44.

5. (a) Gịnị bụ mmalite nke onye ahụ ghọrọ Setan Ekwensu? (b) Gịnị ka okwu ndị bụ́ “Setan” na “Ekwensu” pụtara?

5 Ee, Ekwensu bụ ajọ “ogbu mmadụ.” Bible na-ekpughe na ọ bụ onye n’ezie, ọ bụghị nnọọ ihe ọjọọ dị n’obi mmadụ. (Matiu 4:​1-⁠11) Ọ bụ ezie na e kere ya dị ka mmụọ ozi nke ezi omume, “o guzoghịkwa n’eziokwu.” Lee ka o si kwesị ekwesị na a kpọrọ ya Setan Ekwensu! (Mkpughe 12:9) A na-akpọ ya “Setan,” ma ọ bụ “onye nguzogide,” n’ihi na o megidewo ma guzogide Jehova. A na-akpọkwa omempụ a “Ekwensu,” nke pụtara “onye nkwutọ,” n’ihi na o jiriwo nkwulu nye echiche na-ezighị ezi banyere Chineke.

6. N’ihi gịnị ka Setan ji nupụ isi megide Chineke?

6 Gịnị kwaliri Setan inupụ isi megide Chineke? Anyaukwu. O ji anyaukwu nwee agụụ maka ofufe Jehova na-anata site n’aka ụmụ mmadụ. Ekwensu ajụghị ọchịchọ ịnara ofufe dị otú ahụ, bụ́ nke dịịrị nanị Onye Okike ahụ n’ụzọ ziri ezi. (Tụlee Ezikiel 28:​12-⁠19.) Kama nke ahụ, mmụọ ozi ahụ nke ghọrọ Setan zụlitere ọchịchọ anyaukwu a ruo mgbe ọ tụụrụ ime ma mụpụta mmehie.​—⁠Jemes 1:​14, 15.

7. (a) Gịnị na-akpata ọnwụ mmadụ? (b) Gịnị bụ mmehie?

7 Anyị akọwapụtawo onye omekome ahụ mpụ o mere dubaworo n’ọnwụ ụmụ mmadụ. Ma gịnị bụ isi ihe kpatara ọnwụ ụmụ mmadụ? Bible na-asị: “Ihe ọgbụgba nke ọnwụ bụ mmehie.” (1 Ndị Kọrint 15:56) Gịnịkwa bụ mmehie? Iji ghọta okwu a, ka anyị tụlee ihe ọ pụtara n’asụsụ ndị mbụ nke Bible. Ngwaa Hibru na Grik a na-asụgharịkarị “imehie” pụtara “ihie” n’echiche nke ihie ụzọ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ma ọ bụ erughị otu ihe mgbaru ọsọ. Olee ihe ọ̀tụ̀tụ̀ nke anyị nile na-ehie ụzọ na ya? Ihe ọ̀tụ̀tụ̀ nke nrubeisi zuru okè nye Chineke. Otú ọ dị, olee otú e si webata mmehie n’ime ụwa?

ỤZỌ E SI GAA N’IHU NA NKATA AHỤ A KPARA

8. Olee otú Setan si nwaa inweta ofufe ụmụ mmadụ?

8 Setan ji nlezianya kpaa nkata nke o chere ga-eduje na ya ịchị ụmụ mmadụ nile na ịnara ofufe ha. O kpebiri inunye di na nwunye mbụ bụ́ mmadụ, Adam na Iv, imehie megide Chineke. Jehova enyewo nne na nna anyị mbụ ihe ọmụma nke gaara eduje ná ndụ ebighị ebi. Ha maara na Onye Okike ha dị mma n’ihi na o debewo ha n’ubi Iden mara mma. Adam karịsịa nwere mmetụta nke ịdị mma nke Nna eluigwe ya mgbe Chineke nyere ya nwunye mara mma nke na-enye aka. (Jenesis 1:26, 29; 2:7-⁠9, 18-⁠23) Mmadụ abụọ mbụ ahụ ịnọgide na-adị ndụ dabeere ná nrubeisi nye Chineke.

9. Olee iwu Chineke nyere mmadụ mbụ ahụ, n’ihi gịnịkwa ka nke a ji bụrụ nke ezi uche dị na ya?

9 Chineke nyere Adam iwu, sị: “Mkpụrụ nke sitere n’osisi nile ọ bụla nke ubi a a gbara ogige ka ị ga na-eri eri: ma mkpụrụ nke sitere n’osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ, gị erila mkpụrụ sitere na ya: n’ihi na n’ụbọchị ị ga-eri mkpụrụ sitere na ya ị ghaghị ịnwụ anwụ.” (Jenesis 2:​16, 17) Dị ka Onye Okike, Jehova Chineke nwere ikike isetịpụ ụkpụrụ omume na ịkọwa ihe bụ ezi ihe na ihe bụ ihe ọjọọ maka ndị o kere. Iwu ya bụ nke ezi uche dị na ya n’ihi na Adam na Iv nweere onwe ha iri mkpụrụ sitere n’osisi ndị ọzọ nile n’ogige ahụ. Ha pụrụ igosipụta ekele ha maka ịchịisi ziri ezi nke Jehova site n’irube isi n’iwu a kama iji mpako na-esetịpụ ụkpụrụ omume ndị nke ha.

10. (a) Olee otú Setan si jekwuru ụmụ mmadụ iji dọrọ ha gaa n’akụkụ nke ya? (b) Ihe dịgasị aṅaa ka Setan nyere echiche ya na Jehova bu n’obi? (ch) Gịnị ka i chere banyere mwakpo Setan wakporo Chineke?

10 Ekwensu mere atụmatụ ịdọpụ ụmụ mmadụ mbụ ahụ n’ebe Chineke nọ. Iji raba ha n’ịkwado ya, Setan ghara ụgha. Na-eji agwọ eme ihe, dị nnọọ ka onye ọkà n’ịtụgharị ụda olu na-eji ihe na-enweghị ndụ eme ihe, Ekwensu jụrụ Iv: “Ọ̀ ga-abụ ezie na Chineke sịrị, Unu erila mkpụrụ sitere n’osisi ọ bụla nke ubi a a gbara ogige?” Mgbe Iv kwupụtara iwu Chineke nyere, Setan kwuru, sị: “Ọ dịghị ọnwụ unu na-aghaghị ịnwụ.” Mgbe ahụ o nyere nghọta na Jehova bu ihe ọjọọ n’obi site n’ịsị: “Chineke maara na n’ụbọchị unu ga-eri mkpụrụ sitere na ya, mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya unu, unu ewee dị ka Chineke, na-ama ezi ihe na ihe ọjọọ.” (Jenesis 3:​1-⁠5) Ekwensu si otú ahụ nye echiche nke na Chineke na-egbochi ihe ọma. Lee aha ajọ nkwulu nke a bụ n’ebe Nna eluigwe anyị nke eziokwu, nke na-ahụ n’anya, bụ́ Jehova nọ!

11. Olee otú Adam na Iv si ghọọ ndị nkwado Setan?

11 Iv lere osisi ahụ anya ọzọ, mkpụrụ ya yikwara ugbu a ihe na-adọrọ nnọọ mmasị. Ya mere o weere mkpụrụ ya rie. E mesịa, di ya ma ụma sonyere ya n’omume mmehie nke a nke inupụrụ Chineke isi. (Jenesis 3:6) Ọ bụ ezie na e duhiere Iv, ma ya ma Adam kwadochara atụmatụ Setan ịchị agbụrụ mmadụ. Ya bụ, ha ghọrọ ndị nkwado ya.​—⁠Ndị Rom 6:16; 1 Timoti 2:14.

12. Gịnị si ná nnupụisi mmadụ megide Chineke pụta?

12 Adam na Iv aghaghị iche ihe ndị sitere n’omume ha ihu. Ha adịghị ka Chineke, na-enwe ihe ọmụma pụrụ iche. Kama nke ahụ, ihere mere ha, ha wee zoo onwe ha. Jehova tara Adam ụta n’ihi ihe o mere wee kwupụta ọmụma ikpe nke a: “N’ọsụsọ ihu gị ka ị ga-eri nri, ruo mgbe ị ga-alata n’ala; n’ihi na e siri na ya wepụta gị; n’ihi na ájá ka ị bụ, ọ bụkwa ájá ka ị ga-alata.” (Jenesis 3:19) “N’ụbọchị” nne na nna anyị mbụ riri mkpụrụ sitere n’osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ, Chineke mara ha ikpe, ha nwụọkwa n’anya ya. Mgbe ahụ a chụpụrụ ha na Paradaịs, ha wee malite ịgbada gaa n’ọnwụ nkịtị.

ỤZỌ MMEHIE NA ỌNWỤ SI GBASAA

13. Olee otú mmehie si gbasaa ruo agbụrụ mmadụ nile?

13 O yiri ka ọ gaworo Setan nke ọma n’atụmatụ ya ịnara ofufe mmadụ. Otú ọ dị, ọ pụghị idebe ndị na-efe ya ndụ. Mgbe mmehie malitere ịrụ ọrụ n’ahụ di na nwunye mbụ ahụ, ha apụkwaghị ibufere ụmụ ha izu okè. Dị ka ihe a kanyere n’elu nkume, a kabanyesiri mmehie ike n’ime mkpụrụ ndụ ebumpụta ụwa nke nne na nna anyị mbụ. N’ihi ya, ha pụrụ ịmụpụta nanị ụmụ na-ezughị okè. Ebe ọ bụ na a tụụrụ ime ụmụ ha nile mgbe Adam na Iv mehiesịrị, ụmụ ha ketara mmehie na ọnwụ.​—⁠Abụ Ọma 51:5; Ndị Rom 5:12.

14. (a) Ònye ka anyị pụrụ iji tụnyere ndị na-agọnarị mmehie ha? (b) Olee otú e si mee ka ndị Israel mara banyere ọnọdụ mmehie ha?

14 Otú ọ dị, taa, ọtụtụ ndị adịghị eche na ha bụ ndị mmehie. N’akụkụ ụfọdụ nke ụwa, echiche nke mmehie e ketara eketa bụ ihe ọha mmadụ na-amaghị. Ma nke ahụ abụghị ihe nnwapụta nke na mmehie adịghị adị. Nwa okoro ihu ya ruru unyi pụrụ ịzọrọ na ya dị ọcha, a pụkwara ime ka o kwere ihe dị iche nanị mgbe o lere anya n’enyo. Ndị Israel oge ochie yiri nwatakịrị dị otú ahụ mgbe ha natara Iwu Chineke site n’aka onye amụma Ya bụ́ Mosis. Iwu ahụ mere ka o doo anya na mmehie dị. “M gaghị amaworị mmehie, ma ọ bụrụ na esiteghị m n’aka iwu mara ya,” ka Pọl onyeozi na-akọwa. (Ndị Rom 7:​7-⁠12) Dị ka nwa okoro ahụ na-ele anya n’enyo, site n’iji Iwu ahụ lee onwe ha anya, ndị Israel pụrụ ịhụ na ha adịghị ọcha n’anya Jehova.

15. Gịnị ka a na-ekpughe site n’ileba anya n’enyo nke Okwu Chineke?

15 Site n’ileba anya n’enyo nke Okwu Chineke na ịrịba ụkpụrụ ya nile ama, anyị pụrụ ịhụ na anyị ezughị okè. (Jemes 1:​23-⁠25) Dị ka ihe atụ, tụlee ihe Jisọs Kraịst gwara ndị na-eso ụzọ ya banyere ịhụ Chineke na ndị agbata obi ha n’anya, dị ka e dekọrọ ya na Matiu 22:​37-⁠40. Lee ka ụmụ mmadụ si ehie ụzọ n’akụkụ ndị a ọtụtụ mgbe! Ọtụtụ adịghị enwetụdị mmetụta nke akọ na uche n’ihi ịda ada n’igosi ịhụnanya maka Chineke ma ọ bụ maka ndị agbata obi ha.​—⁠Luk 10:​29-⁠37.

LEZIE ANYA MAKA ỤZỌ AGHỤGHỌ SETAN!

16. Gịnị ka anyị pụrụ ime iji zere ịdaba n’atụmatụ Setan, n’ihi gịnịkwa ka nke a ji sie ike?

16 Setan na-achọ ime anyị ka anyị mara ụma mee mmehie. (1 Jọn 3:8) È nwere ụzọ ọ bụla isi gbochie ịdaba n’atụmatụ ya nile? Ee, ma nke a na-achọ ka anyị lụso ọchịchọ nile nke mmehie a ma ụma eme ọgụ. Nke a adịghị mfe n’ihi na ọchịchọ ime mmehie nke dị n’ime anyị site n’ọmụmụ dị ike nke ukwuu. (Ndị Efesọs 2:3) Ọ dị Pọl mkpa ịgbasi mgba ike. N’ihi gịnị? N’ihi na mmehie bi ebi n’ime ya. Ọ bụrụ na anyị chọrọ nnwapụta Chineke, anyị onwe anyị kwa aghaghị ịlụso ọchịchọ ime mmehie dị n’ime anyị ọgụ.​—⁠Ndị Rom 7:14-⁠24; 2 Ndị Kọrint 5:10.

17. Gịnị na-eme ka ọgụ megide ọchịchọ mmehie anyị sikwuo ike?

17 Ebe Setan na-anọgide na-achọ ohere iji raba anyị n’imebi iwu Chineke, ọgụ anyị megide mmehie adịghị mfe. (1 Pita 5:8) N’igosi nchegbu maka ndị Kraịst ibe ya, Pọl sịrị: “Ana m atụ egwu, ma ò nwere ụzọ ọ bụla a ga-emebi uche unu ka unu pụọ n’afọ ofufo na ịdị ọcha nke dị n’ebe Kraịst nọ, dị ka agwọ ahụ weere aghụghọ ya ghọgbuo Iv.” (2 Ndị Kọrint 11:3) Setan na-eji ụzọ aghụghọ ndị yiri nke ahụ eme ihe taa. Ọ na-agbalị ịkụnye mkpụrụ nke inwe obi abụọ banyere ịdị mma Jehova na abamuru nke irube isi n’ihe Chineke nyere n’iwu. Ekwensu na-anwa iji ọchịchọ mmehie ndị anyị ketara eketa eme ihe na ime ka anyị gbasoo ụzọ nke mpako, anyaukwu, ịkpọasị, na ịkpa ókè.

18. Olee otú Setan si eji ụwa akwalite mmehie?

18 Otu n’ime ihe ndị Ekwensu ji emegide anyị bụ ụwa, nke na-atọgbọ n’ike ya. (1 Jọn 5:19) Ọ bụrụ na anyị adịghị elezi anya, ndị rụrụ arụ na-adịghị akwụwa aka ọtọ n’ụwa nke dị anyị gburugburu ga-arụgide anyị ịbanye n’ụzọ mmehie nke na-emebi ụkpụrụ omume Chineke. (1 Pita 4:​3-⁠5) Ọtụtụ na-elelị iwu Chineke na ọbụna na-eleghara mkpali nile nke akọ na uche ha anya, na-emesị mee ya ka ọ gharakwa ịdị na-enwe mmetụta. (Ndị Rom 2:14, 15; 1 Timoti 4:​1, 2) Ụfọdụ na-eji nwayọọ nwayọọ nakwere ụzọ nke ọbụna akọ na uche ha na-ezughị okè na-adịghị ekwebu ha ịgbaso.​—⁠Ndị Rom 1:​24-⁠32; Ndị Efesọs 4:​17-⁠19.

19. N’ihi gịnị ka ọ na-ezughị ezu nanị ibi ndụ dị ọcha?

19 Ibi ndụ dị ọcha bụ oké ihe n’ụwa a. Otú ọ dị, iji mee ihe na-atọ Onye Okike anyị ụtọ, a chọrọ ihe karịrị nke ahụ. Anyị aghaghịkwa inwe okwukwe na Chineke ma nwee mmetụta nke ibu ọrụ n’ebe ọ nọ. (Ndị Hibru 11:6) “Onye matara ime ihe ọma, ma o meghị ya, ọ bụụrụ onye ahụ mmehie,” ka Jemes onye na-eso ụzọ dere. (Jemes 4:17) Ee, ịkpachara anya na-eleghara Chineke na ihe ndị o nyere n’iwu anya bụ n’onwe ya otu ụdị nke mmehie.

20. Olee otú Setan pụrụ isi gbochie gị ime ihe ziri ezi, ma gịnị ga-enyere gị aka iguzogide nrụgide ndị dị otú ahụ?

20 O yikarịrị nnọọ ka Setan ọ̀ ga-akpalite mmegide ná nchụso ị na-achụso ihe ọmụma Chineke site n’ọmụmụ Bible gị. E ji ezi obi na-enwe olileanya na ị gaghị ekwe ka nrụgide ndị dị otú ahụ gbochie gị ime ihe ziri ezi. (Jọn 16:2) Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị ọchịchị nwere okwukwe na Jisọs n’oge ozi ya, ha ekwupụtaghị ya n’ihi na ha tụrụ egwu ịbụ ndị ọha mmadụ ha jụrụ. (Jọn 12:​42, 43) N’obi ọjọọ Setan na-agbalị imenye onye ọ bụla na-achọ ihe ọmụma Chineke ụjọ. Otú ọ dị, i kwesịrị icheta ma nwee ekele mgbe nile maka ihe ndị magburu onwe ha Jehova meworo. Ị pụrụ ọbụna inwe ike inyere ndị mmegide aka inweta otu obi ekele ahụ.

21. Olee otú anyị pụrụ isi merie ụwa na ọchịchọ mmehie ndị nke onwe anyị?

21 Ruo ogologo oge anyị bụ ndị na-ezughị okè, anyị ga na-eme mmehie. (1 Jọn 1:8) Ka o sina dị, anyị nwere enyemaka n’ịlụ ọgụ a. Ee, o kwere omume inwe mmeri n’ọgụ anyị megide ajọ onye ahụ, bụ́ Setan Ekwensu. (Ndị Rom 5:21) Ná ngwụsị nke ozi elu ala Jisọs, ọ gbara ụmụazụ ya ume n’okwu ndị a: “N’ụwa unu na-enwe mkpagbu: ma nweenụ obi ike; Mụ onwe m emeriwo ụwa.” (Jọn 16:33) Ọbụna nye ụmụ mmadụ na-ezughị okè, o kwere omume imeri ụwa site n’enyemaka Chineke. Setan enweghị ike n’ahụ ndị na-eguzogide ya ma ‘na-edo onwe ha n’okpuru Chineke.’ (Jemes 4:7; 1 Jọn 5:18) Dị ka anyị ga-ahụ, Chineke ewepụtawo ụzọ isi pụọ n’agbụ nke mmehie na ọnwụ.

NWALEE IHE ỌMỤMA GỊ

Ònye bụ Setan Ekwensu?

N’ihi gịnị ka ụmụ mmadụ ji aka nká, na-anwụkwa anwụ?

Gịnị bụ mmehie?

Olee otú Setan si adọba ndị mmadụ ná mmehie a ma ụma eme megide Chineke?

[Foto dị na peeji nke 54]

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya