-
“Ghọọnụ Ndị Na-eṅomi Chineke”Ụlọ Nche—2008 | Ọktoba 1
-
-
Okwu Chineke dụrụ ezigbo Ndị Kraịst ọdụ, sị: “Ya mere, ghọọnụ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ n’anya.” (Ndị Efesọs 5:1) Okwu a na-egosi nke ọma na Chineke nwere obi ike n’ebe ndị na-efe ya ofufe nọ. Olee otú nke a si bụrụ eziokwu? Jehova bụ́ Chineke kere mmadụ n’onyinyo Ya, dị ka oyiyi Ya si dị. (Jenesis 1:26, 27) Ya mere, Chineke kere ụmụ mmadụ ka ha nwee àgwà yiri nke ya.a N’ihi ya, mgbe Baịbụl dụrụ Ndị Kraịst ọdụ ka ha ‘ghọọ ndị na-eṅomi Chineke,’ o yiri ka à ga-asị na Jehova na-asị ha: ‘Ama m na unu ga-emeli ya. Ama m na n’agbanyeghị na unu ezughị okè, unu nwere ike ịdịtụ ka m.’
-
-
“Ghọọnụ Ndị Na-eṅomi Chineke”Ụlọ Nche—2008 | Ọktoba 1
-
-
a Ndị Kọlọsi 3:9, 10 na-egosi na okike e kere anyị n’onyinyo Chineke bụ n’àgwà. A gbara ndị na-achọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ ume ka ha yiri “mmadụ ọhụrụ,” bụ́ nke e mere “ka ọ dị ọhụrụ dị ka onyinyo nke Onye ahụ [ya bụ, Chineke] kere ya si dị.”
-