Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbq isiokwu 159
  • Ụmụ Anụmanụ Hà Na-aga Eluigwe?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụmụ Anụmanụ Hà Na-aga Eluigwe?
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Baịbụl kwuru
  • Ụmụ anụmanụ hà nwere mkpụrụ obi?
  • Mkpụrụ obi ọ̀ na-anwụ anwụ?
  • Ụmụ anụmanụ hà na-eme mmehie?
  • Ọ̀ dị mma ịrụsa ụmụ anụmanụ arụrụala?
  • Ụmụ Anụmanụ
    Teta!—2015
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Ịrụsa Anụmanụ Arụrụala—Ọ̀ Dị Njọ?
    Teta!—1998
  • Ọ̀ Dị Njọ Iri Anụ?
    Teta!—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
ijwbq isiokwu 159
Nkịta

Ụmụ Anụmanụ Hà Na-aga Eluigwe?

Ihe Baịbụl kwuru

Baịbụl kwuru na n’ime ihe niile Chineke kere dị n’ụwa, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole ga-aga eluigwe. (Mkpughe 14:​1, 3) Ihe mere ha ji aga eluigwe bụ ka ha soro Jizọs chịa dị ka eze na ndị nchụàjà. (Luk 22:​28-30; Mkpughe 5:​9, 10) A ga-akpọlite imirikiti ụmụ mmadụ ndị ọzọ ka ha biri na paradaịs n’ụwa a.​—Abụ Ọma 37:​11, 29.

O nweghị ebe ọ bụla na Baịbụl e kwuru okwu eluigwe ebe nkịta ma ọ bụ anụmanụ ndị ọzọ ndị mmadụ ji mere enyi na-aga ma ha nwụọ. E nwekwara ezigbo ihe mere na Baịbụl ekwughị ụdị ihe ahụ. Ụmụ anụmanụ agaghị emeli ihe ndị ga-eme ka ha ruo eruo ịbụ “ndị a kpọrọ òkù ịga eluigwe.” (Ndị Hibru 3:1) Ihe ndị so n’ihe mmadụ ga-eme ka o ruo eruo ịga eluigwe bụ ịmata Chineke na Jizọs nke ọma, inwe okwukwe, na irubere Chineke isi. (Matiu 19:17; Jọn 3:16; 17:3) Ọ bụ naanị ụmụ mmadụ ka Chineke kere ka ha nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi.​—Jenesis 2:​16, 17; 3:​22, 23.

Tupu ihe ọ bụla e kere n’ụwa enwee ike ịga eluigwe, a ga-akpọliterịrị ya n’ọnwụ. (1 Ndị Kọrịnt 15:42) Baịbụl kọrọ otú e si kpọlite ọtụtụ ndị n’ọnwụ. (1 Ndị Eze 17:​17-24; 2 Ndị Eze 4:​32-37; 13:​20, 21; Luk 7:​11-15; 8:​41, 42, 49-56; Jọn 11:​38-44; Ọrụ Ndịozi 9:​36-42; 20:​7-12) Ma e nweghị nke n’ime ha bụ anụmanụ, ha niile bụcha mmadụ.

  • Ụmụ anụmanụ hà nwere mkpụrụ obi?

  • Mkpụrụ obi ọ̀ na-anwụ anwụ?

  • Ụmụ anụmanụ hà na-eme mmehie?

  • Ọ̀ dị mma ịrụsa ụmụ anụmanụ arụrụala?

Ụmụ anụmanụ hà nwere mkpụrụ obi?

Mba. Baịbụl kwuru na ụmụ mmadụ nakwa ụmụ anụmanụ bụ mkpụrụ obi. (Ọnụ Ọgụgụ 31:28) Mgbe e kere nwoke mbụ bụ́ Adam, e nyeghị ya mkpụrụ obi kama ọ ‘ghọrọ mkpụrụ obi dị ndụ.’ (Jenesis 2:7) Ihe abụọ Chineke ji kee mkpụrụ obi bụ: “ájá si n’ala” na “ume ndụ.”

Mkpụrụ obi ọ̀ na-anwụ anwụ?

Ee, Baịbụl kwuru na mkpụrụ obi na-anwụ anwụ. (Levitikọs 21:11; Ezikiel 18:20) Ma ụmụ mmadụ ma ụmụ anụmanụ nwụọ, ha na-alaghachi n’ájá. (Ekliziastis 3:​19, 20) N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ha adịghịzi ndụ.a

Ụmụ anụmanụ hà na-eme mmehie?

Mba. Ime mmehie pụtara mmadụ ịda iwu Chineke n’otú o si chee echiche, lee ihe anya, ma ọ bụ mee ihe. Tupu ihe e kere eke emee mmehie, ọ ga-enwerịrị ike ikpebi ime ihe dị mma ma ọ bụ ihe dị njọ, ma ụmụ anụmanụ agaghị emeli ụdị ihe a. Ha anaghị eche echiche, kama ha na-eme ihe ọ bụla batara ha n’obi n’obere oge ha na-adịru ndụ. (2 Pita 2:12) Oge ahụ gwụ, ha anwụọ n’agbanyeghị na ha emeghị mmehie.

Ọ̀ dị mma ịrụsa ụmụ anụmanụ arụrụala?

Mba. Chineke nyere ụmụ mmadụ ike ịchị na ilekọta ụmụ anụmanụ ma ọ bụghị ịrụsa ha arụrụala. (Jenesis 1:28; Abụ Ọma 8:​6-8) Chineke ji ndụ anụmanụ ọ bụla kpọrọ ihe, ma nke obere ụmụ nnụnụ. (Jona 4:11; Matiu 10:29) Ọ gwara ndị na-efe ya ka ha na-elekọta ụmụ anụmanụ.​—Ọpụpụ 23:12; Diuterọnọmi 25:4; Ilu 12:10.

Amaokwu Baịbụl ndị kwuru gbasara ụmụ anụmanụ

Jenesis 1:28: “Chineke gọzikwara [nwoke na nwaanyị mbụ], Chineke wee sị ha: ‘Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba ma jupụta ụwa, meekwanụ ka ọ dịrị n’okpuru unu, ka azụ̀ ndị dị n’oké osimiri na anụ ufe nke eluigwe na ihe ọ bụla e kere eke dị ndụ nke na-agagharị n’elu ala nọrọkwa n’okpuru unu.’”

Ihe ọ pụtara: Chineke mere ka ụmụ mmadụ nwee ikike n’ebe ụmụ anụmanụ nọ.

Ọnụ Ọgụgụ 31:28: “Nata ndị agha ahụ, bụ́ ndị gara agha ahụ, otu mkpụrụ obi n’ime narị mkpụrụ obi ise ọ bụla n’etiti ndị mmadụ na ehi na ịnyịnya ibu na ewu na atụrụ, ka ha bụrụ ụtụ.”

Ihe ọ pụtara: Ma mmadụ ma anụmanụ bụ mkpụrụ obi.

Ilu 12:10: “Onye ezi omume na-elekọta mkpụrụ obi anụ ụlọ ya.”

Ihe ọ pụtara: Ndị ezigbo mmadụ na-elekọta ụmụ anụmanụ, ma anụ ndị ha ji mere enyi.

Matiu 10:29: “Ọ̀ bụ na a dịghị ere nza abụọ otu mkpụrụ ego nke ga-azụtali naanị ihe dị nta? Ma o nweghị otu n’ime ha ga-ada n’ala, Nna unu aghara ịma.”

Ihe ọ pụtara: Chineke maara anụmanụ niile, na-elekọtakwa ha, ọbụnadị ụmụ obere nnụnụ.

a Ị chọọ ịmatakwu banyere nke a, gụọ isi nke 6 n’akwụkwọ bụ́ Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya