Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 7/1 p. 8-13
  • Ọnọdụ Onye Bụ Nwanyị n’Akwụkwọ Nsọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọnọdụ Onye Bụ Nwanyị n’Akwụkwọ Nsọ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Onye E Kere dị ka Onye E Jikọrọ Ya Na Nwoke
  • Ọrụ Ezi Uche Dị na Ya nke Dịịrị Onye Bụ Nwanyị
  • Mmehie Mebiri Ọnọdụ nke Onye Bụ Nwanyị
  • Ndị Inyom n’Okpuru Iwu Mosis
  • Ndị Inyom Ndị Pụrụ Iche
  • Ndị Inyom n’Okpuru Okpukpe Ndị Juu
  • Ndị Inyom Kwesịrị Ntụkwasị Obi Ndị Nọ Na-echere Mesaịa ahụ
  • Chineke Ò Ji Ụmụ Nwaanyị Kpọrọ Ihe?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Olee Ọrụ Ụmụ Nwaanyị Na-arụ Iji Hụ na Nzube Jehova Mezuru?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Ọnọdụ Dị Ùgwù nke Ndị Inyom n’Etiti Ndị Ohu Chineke n’Oge Gboo
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Nwoke na Nwanyị Ọrụ Dị Ùgwù Onye nke Ọ Bụla n’Ime Ha Na-arụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 7/1 p. 8-13

Ọnọdụ Onye Bụ Nwanyị n’Akwụkwọ Nsọ

“Nke a ka a ga-akpọ Nwanyị, n’ihi na e wepụtara nke a n’ahụ nwoke.”—JENESIS 2:23.

1, 2. (a) Olee otú ụfọdụ ndị si na-eche na Bible si ele ndị inyom anya? (b) Iji kwuo ihe n’ụzọ ziri ezi, ntụle ihe abụọ dị aṅaa ka e kwesịrị ime, gịnịkwa ka otu akwụkwọ ihe ọmụma kwuru?

OLEE ụzọ Akwụkwọ Nsọ si ele ndị inyom anya? E nwere echiche dị iche iche banyere nke a. Otu akwụkwọ e bipụtara n’oge na-adịbeghị anya n’isiokwu ahụ kwuru, sị: “Otu echiche e nwere n’oge a bụ na Bible eledawo ndị inyom anya.” Ụfọdụ ndị na-ekwu na ma n’akụkụ ya nke Hibru ma n’akụkụ ya nke Grik, Bible na-emesi ndị inyom ike. Nke a ọ̀ bụ eziokwu?

2 Iji lee ihe anya n’ụzọ ziri ezi, o kwesịrị ekwesị ka e buru ụzọ nyochaa ụzọ e si emeso ụmụ nwanyị ihe n’oge Bible n’etiti ndị na-adịghị efe Jehova. Ná mba oge ochie ụfọdụ ndị na-efe ofufe chi nne, a na-asọpụrụ ndị inyom dị ka ndị bụ ihe nnọchianya nke ike ọmụmụ nwa. O yiri ka è debere ha n’ọnọdụ dị elu na Babylonia na Ijipt. Ma n’ebe ndị ọzọ, ihe agachaghịrị ha nke ọma otú ahụ. N’Asiria oge ochie, mmadụ pụrụ ịchụpụ nwunye ya mgbe ọ bụla ọ sọrọ ya, ọbụnakwa gbuo ya egbuo ma ọ bụrụ na ọ kwaa iko. Mgbe ọ bụla ọ hapụrụ ụlọ pụọ n’èzí, ọ ghaghị iyi ihe mkpuchi ihu. Na Gris na Rom, ọ bụ nanị ndị inyom bara ọgaranya, ndị ọtụtụ n’ime ha bụ ndị ashawo ha na ndị oké ozu na-emekọ, ma ọ bụ ndị akwụna nọ n’ọkwa dị elu, na-enwe ike ịga ụlọ akwụkwọ, nweekwa ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke nnwere onwe. N’ihi nke a, ọ bụ ihe na-enye obi ụtọ ịgụ n’akwụkwọ The New International Dictionary of New Testament Theology,a sị: “N’ụzọ na-eyighị ihe fọdụrụ n’ụwa (okpukpe) nke ebe ọwụwa anyanwụ, a maara ya [nwanyị n’Akwụkwọ nsọ Hibru] dị ka onye bụ mmadụ nakwa onyeibe nke nwoke.” E kwuru nke a nke ọma n’akwụkwọ ikpeazụ nke Akwụkwọ nsọ Hibru, ebe onye amụma Jehova kọwara nwunye mmadụ dị ka “onyeibe” [NW] ya, kwuokwa, sị: “Ka nwoke gharakwa ịghọgbu nwunye ọ lụtara n’okorobịa.”—Malakaị 2:14, 15.

Onye E Kere dị ka Onye E Jikọrọ Ya Na Nwoke

3 na nkọwa ala ala peji. (a) Mgbe o kesịrị Adam, ọrụ dị aṅaa ka Jehova nyere ya? (b) Ọ bụ ezie na o nwebeghị nwunye, gịnị bụ eziokwu n’ihe banyere Adam tupu e kee Iv, gịnị bụkwa eziokwu banyere “Adam ikpeazụ” ahụ, bụ́ Jisọs?

3 Dị ka Bible si kwuo, Jehova “weere ájá sitere n’ala” kee Adam ma debe ya n’ubi a gbara ogige nke Iden, ka o lekọta ya. Chineke kpọtaara Adam anụ ọhịa nile na anụ ufe nile ka o leruo ha anya wee kpọọ ha aha. N’ogologo oge dum o were Adam iji mezuo nke a, ọ bụ nanị ya nọ. Iji rụzuo ọrụ nile ọ nataworo n’aka Jehova ruo mgbe ahụ, o zuru okè, zuo ezu, ọ dịghị ihe kọrọ ya.b O nweghị “onye inyeaka kwesịịrị ya.”—Jenesis 2:7, 15, 19, 20.

4, 5. (a) Mgbe ọ na-adịkwaghị mma ka Adam nọrọ nanị ya, gịnị ka Jehova mere? (b) Ọrụ dị aṅaa nke ga-ewe ogologo oge ka Jehova nyere Adam na Iv, gịnịkwa ka nke a ga-achọ n’aka ha abụọ?

4 Otú ọ dị, mgbe oge ụfọdụ gasịworo, Jehova kwupụtara na “ọ dịghị mma ka mmadụ ahụ nọọ nanị ya,” o wee gaa n’ihu imepụtara Adam onye òtù ya nke ga-eso ya kere òkè n’ọrụ ndị chere ya n’ihu. O mere ka oké ụra dakwasị Adam, wepụta otu n’ime ọgịrịga ya, wee jiri ya mepụta nwanyị, bụ́ ‘ọkpụkpụ si n’ọkpụkpụ Adam na anụ ahụ si n’anụ ahụ ya.’ Ugbu a, Adam ga-enwe “onye inyeaka,” “onye kwesịịrị ya,” ma ọ bụ onye e jikọrọ ya na ya. “Chineke wee gọzie ha: Chineke wee sị ha, Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, jupụta ụwa, buda ya n’okpuru onwe unu; nweekwanụ ike n’ahụ azụ nke oké osimiri, na n’ahụ anụ ufe nke eluigwe, na n’ahụ anụ nile ọ bụla dị ndụ nke na-akpụ akpụ n’elu ụwa.”—Jenesis 1:25, 28; 2:18, 21-23.

5 Rịba ama na ọ bụ “ha” ka e nyere ọrụ nke a, bụ́ ma nwoke ma nwanyị ahụ. Mmekọ ha na-emekọ ihe agaghị abụ nke a kpaara ókè nanị maka imejupụta ụwa. Ọ ga-agụnyekwa ibuda ụwa n’okpuru onwe ha, na inwekwa ike kwesịrị ekwesị n’elu ihe okike ndị ọzọ dị ala karị. Ọ ga-achọ ha inwe iru eru dị iche iche nke ọgụgụ isi na nke àgwà ime mmụọ, ma nwoke ma nwanyị ahụ nwekwara ikike dị mkpa iji zụlite àgwà ndị a n’ụzọ kwekọrọ n’uche Chineke.

Ọrụ Ezi Uche Dị na Ya nke Dịịrị Onye Bụ Nwanyị

6. (a) Gịnị ka Bible gosiri banyere ike ọkpụkpụ aka nke nwoke na nke nwanyị? (b) Olee ụzọ ndị inyom kwesịrị isi chee echiche ka ha wee nakwere ụzọ Jehova siworo dokwaa ihe?

6 N’eziokwu, ibuda ụwa n’okpuru onwe ha ga-achọkwa ike ọkpụkpụ aka. N’amamihe ya nke a na-akparaghị ókè, Jehova bu ụzọ kee Adam, mesịa kee Iv. E kere nwanyị ahụ ‘site na nwoke,’ “n’ihi nwoke,” ọ pụtakwara ìhè na o nwere ike ọkpụkpụ aka dị ala karị nke nwoke. (1 Timoti 2:13; 1 Ndị Kọrint 11:8, 9; tụlee 1 Pita 3:7.) Nke a bụ eziokwu dị ná ndụ nke ọtụtụ ndị na-achọ ọdịmma ndị inyom, na ụfọdụ ụmụ nwanyị ndị ọzọkwa, yiri ka hà nwere ihe isi ike ịnakwere. Ha ga-enwe obi ụtọ karị n’ezie ma ọ bụrụ na ha agbalịa ịghọta ihe mere Jehova ji dokwaa ihe n’ụzọ dị otú a, wee si otú ahụ na-anakwere ọrụ Chineke nyere ha. A pụrụ iji ndị na-eme mkpesa banyere ndokwa nile nke Chineke tụnyere nnụnụ nightingale nke nọ n’akwụ ya na-ewe iwe n’ihi na o sirughị ike dị ka nnụnụ sea gull, kama ifego n’alaka osisi dị elu ma na-abụ abụ n’inwe ekele maka onyinye ndị pụrụ iche Chineke nyeworo ya.

7. N’ihi gịnị ka Adam ji nọrọ n’ọnọdụ dị mma ịbụ isi Iv na ụmụ ọ bụla ha gaje ịmụ, ma nke a ọ̀ ga-abụ iji megbuo Iv?

7 Tupu e kee Iv, ihe ịrụ ụka adịghị ya na Adam nwetara ahụmahụ dị ukwuu n’ịdị ndụ. N’ime oge a, Jehova nyere ya ntụziaka ụfọdụ. Adam gaje ịkọrọ nwunye ya ntụziaka ndị a, wee si otú a na-arụ ọrụ dị ka ọnụ na-ekwuru Chineke. N’ụzọ ezi uche dị na ya, o kwesịrị ibuteworị ụzọ n’ihe omume nile metụtara ofufe na ọrụ dị iche iche nke nsọpụrụ Chineke ndị ha gaje ịrụ ná nzube nke ịrụzu ọrụ e kenyere ha. Mgbe a mụrụ ụmụ, ọ gaje ịbụ onye isi ezinụlọ, ma nke a agajeghị ịbụ n’ụzọ ga-emegbu nwunye ya. Kama nke ahụ, ọ ga-abụ n’ụzọ ga-abara ya uru n’ihi na ọ ga-enwe onye ọzọ ga-akwado ya mgbe o ji ikike nke Chineke nyeworo ya onwe ya na-eme ihe n’ebe ụmụ ya nọ.

8. Usoro ndokwa dị aṅaa nke Chineke mere ka e setịpụrụ n’ime Bible?

8 Dị ka ndokwa nke Chineke si dị, Adam ga-aza Jehova ajụjụ, Iv nọ n’okpuru ọbụbụ isi nke Adam, ụmụ ọ bụla ha ga-amụ ga-anọ n’okpuru nduzi nke ndị mụrụ ha, anụmanụ ndị ahụ dịkwa n’okpuru ihe a kpọrọ mmadụ. Nwoke na nwanyị nwere ọrụ dị iche iche e kenyere ha, nke ọ bụla n’ime ha pụkwara ịdị ndụ obi ụtọ nke na-arụpụta ihe. Otú a, ‘ihe nile ga-enwe ike iwere ọnọdụ n’ụzọ dị mma n’anya na n’usoro.’—1 Ndị Kọrint 11:3; 14:33, 40.

Mmehie Mebiri Ọnọdụ nke Onye Bụ Nwanyị

9, 10. Ihe ndị dị aṅaa mere nwoke na nwanyị ahụ n’ihi ndaba ha dabara ná mmehie, gịnịkwa ka nke a rụpụtawooro ọtụtụ ndị inyom?

9 Dị ka a pụrụ ịtụ anya ya, mwabata nke mmehie na ezughị okè n’ime Paradaịs mbụ ahụ mebiri ndokwa ihe nke a dị n’usoro. (Ndị Rom 7:14-20) O wetaara nwoke ahụ na-enupụ isi na nwunye ya nke na-adịghị erube isi ihe isi ike. (Jenesis 3:16-19) Eri mgbe ahụ, ọtụtụ ụmụ nwoke na-achọ ọdịmma nanị onwe ha ejiriwo ịbụ isi ha nke ziri ezi mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, na-ewetara ndị inyom nhụjuanya dị ukwuu n’ime ọgbọ nile ndị gaworo aga.

10 N’ịhụta ihe nke a ga-esi ná mmehie pụta tupu o mee, Jehova gwara Iv, sị: “N’ebe di gị nọ ka ọchịchọ gị ga-adị, ya onwe ya ga-achịkwa gị.” (Jenesis 3:16) Ọchịchị mmekpọ ọnụ nke a abụbeghị iji ọbụbụ isi na-eme ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị. O gosipụtawo ọnọdụ mmehie nke mmadụ nakwa ezughị okè nke onye bụ nwanyị, n’ihi na mgbe ụfọdụ, ndị inyom atawo ahụhụ n’ihi na ha nwara iweghara ọnọdụ ịbụ isi nke di ha.

11. Gịnị bụ eziokwu banyere ọtụtụ ndị inyom, gịnịkwa ka otu onye na-ede akwụkwọ dere banyere ndị inyom n’oge ndị nna ochie?

11 Ma ruo ókè a gbasoworo ụkpụrụ nile nke Bible, ọtụtụ ndị inyom enwetawo afọ ojuju na obi ụtọ. Ọ dị otú ahụ ọbụna n’oge ndị nna ochie. N’ikwu banyere oge ahụ n’akwụkwọ ya bụ La Bible au Féminin (Bible nke Dị na Nnọchiaha Ndị Inyom), onye dere ya, bụ́ Laure Aynard dere, sị: “Ihe kasị pụta ìhè n’ihe ndekọ ndị a nile bụ ọnọdụ dị mkpa ụmụ nwanyị nọ na ya, ùgwù a na-akwanyere ha n’anya ndị nna ochie ndị ahụ, otú ha na-esi jiri anya ike na-eme ihe, na ọnọdụ nnwere onwe ha biri n’ime ya.”

Ndị Inyom n’Okpuru Iwu Mosis

12, 13. (a) Gịnị bụ ọnọdụ ndị inyom n’okpuru Iwu Mosis? (b) Olee otú ihe si gaara ndị inyom n’ụzọ ime mmụọ n’okpuru Iwu ahụ?

12 Dị ka iwu Jehova nyere site n’aka Mosis si kwuo, ndị bụ nwunye ga-abụ ndị ‘e bu n’obi.’ (Deuterọnọmi 13:6) E kwesịrị ịkwanyere ndị bụ nwunye ùgwù n’ihe banyere mmekọahụ, e kwesịghịkwa imetọ nwanyị ọ bụla n’ụzọ mmekọahụ. (Levitikọs 18:8-19) Ndị nwoke na ndị nwanyị bụ ndị hà nhata n’ihu Iwu ahụ ma ọ bụrụ na ikpe amaa ha n’ihi ịkwa iko ndị lụrụ di na nwunye, mmekọahụ ndị ikwu, ma ọ bụ iso anụmanụ enwe mmekọahụ. (Levitikọs 18:6, 23; 20:10-12) Iwu nke ise chọrọ ka a sọpụrụ nna na nne n’ụzọ hà nhata.—Ọpụpụ 20:12.

13 Karịsịa ihe nile, Iwu ahụ nyere ndị inyom ohere zuru ezu iwulite ọdịdị ime mmụọ ha. Ha ritere uru site n’ọgụgụ a na-agụ Iwu ahụ. (Joshua 8:35; Nehemaịa 8:2, 3) E lere ha anya n’aka idebe ememe okpukpe ndị ahụ nile. (Deuterọnọmi 12:12, 18; 16:11, 14) Ha keere òkè n’Ụbọchị Izu Ike ahụ a na-edebe kwa izu, ha pụkwara ịṅụ iyi ndị Naziraịt. (Ọpụpụ 20:8; Ọnụ Ọgụgụ 6:2) Ha nwere mmekọrịta onwe onye n’etiti ha na Jehova, na-ekpekwara ya ekpere n’otu n’otu.—1 Samuel 1:10.

14. Gịnị ka otu onye ọkà mmụta Bible bụ onye Katọlik kwuru banyere ndị inyom bụ ndị Hibru, gịnịkwa ka a pụrụ ikwu banyere ọnọdụ ndị inyom n’okpuru Iwu ahụ?

14 N’ikwu okwu n’ihe banyere ndị inyom bụ ndị Hibru, onye ọkà mmụta Bible bụ onye Katọlik, bụ́ Roland de Vaux dere, sị: “O doro anya na ọrụ ike nile dị n’ụlọ dịịrị nwanyị ahụ; ọ na-elekọta ìgwè ewu na atụrụ, na-arụ ọrụ n’ubi, na-esi nri, na-akpa ákwà, na-emekwa ihe ndị ọzọ. Otú ọ dị, ọrụ ike ndị a nile, n’abụghị iweda ọnọdụ ya n’ala ma ọlị, na-ewetara ya nsọpụrụ. . . . Akụkụ ihe odide ole na ole ndị ahụ ndị nyetụrụ anyị ohere ileba anya n’ọnọdụ mmekọrịta chiri anya na-adị n’ime ndụ ezinụlọ na-egosi na onye bụ nwunye, bụ́ onye Israel, bụ onye di ya hụrụ n’anya, na-egekwa ya ntị, na-emesokwa ya dị ka onye ya na ya hà nhata. . . . E nweghịkwa ihe ịrụ ụka ọ bụla dịnụ na nke a bụ otú ọnọdụ dị n’ụzọ bụ isi. Ọ bụ ngosipụta kwesịrị ntụkwasị obi nke ozizi ahụ e chebere dị ka ihe dị nsọ na Jenesis, ebe e kwuru na Chineke kere nwanyị dị ka onye ga-enyere nwoke aka, onye ọ ga-arapara n’ahụ ya (Jen 2:18, 24); isiakwụkwọ ikpeazụ nke Ilu na-ajakwa onye bụ ezi nwunye mma, ụmụ ya na-agọzi ya, ọ bụkwa onye di ya na-eji anya isi (Ilu 31:10-31).” (Ancient Israel—Its Life and Institutions) Ajụjụ ọ bụla adịghị ya na mgbe a gbasoro Iwu ahụ n’Israel, a dịghị emeso ụmụ nwanyị mmeso ọjọọ.

Ndị Inyom Ndị Pụrụ Iche

15. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka àgwà Sera si mee ihe atụ nke mmekọrịta kwesịrị ekwesị n’etiti nwoke na nwunye ya? (b) N’ihi gịnị ka okwu banyere Rehab ji bụrụ ihe kwesịrị ịrịba ama?

15 Akwụkwọ nsọ Hibru nwere ọtụtụ ihe nlereanya nke ndị inyom ndị bụ ndị ohu Jehova Chineke kwesịrị ịrịba ama. Sera bụ ihe atụ dị mma nke ụzọ nwanyị nke na-asọpụrụ Chineke pụrụ isi bụrụ onye doro onwe ya n’okpuru di ya, bụrụkwa n’otu mgbe ahụ onye na-enyere ya aka n’ime mkpebi. (Jenesis 21:9-13; 1 Pita 3:5, 6) Okwu banyere Rehab kwesịkwara ịrịba ama. Ọ na-egosi na ebubo ahụ abụghị eziokwu nke bụ na Jehova nwere ịkpọasị nke agbụrụ, na ọ na-emesikwa ndị inyom ike. Rehab bụ nwanyị na-akwa iko nke na-abụghị onye Israel. Ọ bụghị nanị na Jehova nakweere ya dị ka onye na-efe ya ofufe, kama n’ihi okwukwe dị ukwuu o nwere, bụ́ nke e ji ọrụ kwadoo, nke gụnyere ịgbanwe ụzọ ndụ ya, ọ gụrụ ya n’onye ezi omume. Tụkwasị na nke ahụ, o nyeghachiri ya ụgwọ ọrụ site n’inye ya ihe ùgwù ahụ pụrụ iche nke ịbụ otu n’ime ndị Mesaịa ahụ sitere n’usoro ọmụmụ ha.—Matiu 1:1, 5; Ndị Hibru 11:31; Jemes 2:25.

16. Gịnị ka ihe nlereanya banyere Abigail na-eme ihe atụ ya, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka ihe o mere ji bụrụ nke ziri ezi?

16 Ihe atụ nke na-egosi na Jehova adịghị achọ ka onye bụ nwunye doo onwe ya n’okpuru di ya n’echeghị echiche ọ bụla bụ okwu banyere Abigail. Di ya bụ nwoke bara ọgaranya, onye nwere ìgwè ewu na atụrụ buru ibu. Ma o “siri ike n’obi, jọọkwa njọ n’omume nile.” Abigail jụrụ iso di ya n’ụzọ ọjọọ ya. N’igosi inwe uche, ezi echiche, ịdị umeala n’obi, na iche echiche ngwa ngwa, o gbochiri ọnọdụ nke gaara abụworị ihe oké ọdachi nye ezinụlọ ya, Jehova gọzikwara ya n’ụba.—1 Samuel 25:2-42.

17. (a) Ihe ùgwù dị aṅaa pụrụ iche ka ụfọdụ ndị inyom nwere n’Israel? (b) Ihe mmụta dị aṅaa dị n’ihe nlereanya Miriam nye ndị inyom bụ ndị Kraịst, ndị a pụrụ inye ụfọdụ ihe ùgwù ije ozi?

17 Ọbụna na ndị inyom ole na ole bụ ndị amụma nwanyị. Otú ahụ ka ọ dị n’ihe banyere Debọra, n’oge Ndị Ikpe. (Ndị Ikpe, isi 4 na 5) E jiri Hulda mee ihe dị ka onye amụma nwanyị na Juda, nwa mgbe nta tupu mbibi Jerusalem. (2 Ndị Eze 22:14-20) Okwu banyere Miriam kwesịkwara ịrịba ama. Ọ bụ ezie na e kwuru okwu banyere ya dị ka onye amụma nwanyị, nke Jehova zitere, o doro anya na ihe ùgwù nke a mere ka ọ dịrị mpako n’otu oge. O doghị onwe ya n’okpuru ikike Jehova nyeworo nwanne ya nwoke nke ọ tọrọ, bụ́ Mosis idu Israel, a takwara ya ahụhụ maka nke ahụ, ọ bụ ezie na ihe àmà gosiri na o chegharịrị, e wee wetaghachi ya n’ọnodụ ya.—Ọpụpụ 15:20, 21; Ọnụ Ọgụgụ 12:1-15; Maịka 6:4.

Ndị Inyom n’Okpuru Okpukpe Ndị Juu

18, 19. Gịnị bụ ọnọdụ ndị inyom n’okpuru okpukpe ndị Juu, oleekwa otú nke a si malite?

18 Dị ka anyị hụworo, Iwu Mosis chebere ihe ruuru ndị inyom, mgbe a gbasokwara ya, o nyere ndị inyom ohere ibi ndụ na-eju afọ. Ma ka oge na-aga, karịsịa mgbe e bibisịrị Jerusalem n’afọ 607 T.O.A., okpukpe ndị Juu bilitere, bụ́ nke dabeere n’omenala okwu ọnụ efu karịa ịbụ n’Iwu Jehova e dere ede. Malite na narị afọ nke anọ T.O.A. gaa n’ihu, okpukpe ndị Juu nabatara nkà nchepụta echiche ndị Grik n’ụzọ dị ukwuu. N’ozuzu ya, ndị ọkà nchepụta echiche ndị Grik echebaghị echiche dị ukwuu n’ihe ruuru ndị inyom, ya mere e nwere ndalata kwekọrọ na nke ahụ n’ọnọdụ ndị inyom n’ime okpukpe ndị Juu. Malite na narị afọ nke atọ T.O.A., a malitere ime nkewa n’etiti ndị inyom na ndị ikom n’ụlọ nzukọ okpukpe dị iche iche nke ndị Juu, gharakwa ịgba ha ume ịgụ Torah ahụ (Iwu Mosis). Akwụkwọ Encyclopaedia Judaica nakweere, sị: “N’ihi nke a, ọ bụ nanị ndị inyom ole na ole bụ ndị maara akwụkwọ.” Ọzụzụ mmụta akwụkwọ dịịrị ụmụntakịrị nwoke n’ụzọ bụ isi.

19 N’akwụkwọ ya bụ Jerusalem in the Time of Jesus, J. Jeremias dere, sị: “Ná nchịkọta, ọnọdụ ndị inyom n’iwu okpukpe bụ nke a kọwara n’ụzọ kasị mma n’okwu nke a a na-ekwughachi ọtụtụ mgbe: ‘Ndị inyom, ndị ohu (bụ ndị Jentaịl) na ụmụntakịrị.’ . . . Anyị pụrụ ịtụkwasị na nke a na e nwere ọtụtụ echiche nleda anya e kwupụtara banyere ndị inyom. . . . N’ihi ya, anyị nwere echiche ahụ nke bụ na okpukpe ndị Juu n’oge Jisọs nwekwara echiche dị ala banyere ndị inyom.”

Ndị Inyom Kwesịrị Ntụkwasị Obi Ndị Nọ Na-echere Mesaịa ahụ

20, 21. (a) N’agbanyeghị àgwà ịkwa emo ndị ndú okpukpe ndị Juu nwere n’ebe ndị inyom nọ, olee ndị so ná ndị nọ na nche n’oge mgbe ọbịbịa Mesaịa ahụ na-eru nso? (b) Gịnị gosiri na Elizabet na Meri nwere nsọpụrụ Chineke dị omimi?

20 Omume ịkwa emo nke a e nwere n’ebe ndị inyom nọ bụ ụzọ ọzọ ndị rabaị ndị Juu si ‘mee ka okwu Chineke bụrụ ihe efu site n’omenala ha.’ (Mak 7:13) Ma n’agbanyeghị nleda anya nke a, ka oge ọbịbịa Mesaịa na-eru nso, ụfọdụ ndị inyom na-atụ egwu Chineke mụ anya ma na-echere ya. Otu n’ime ndị a bụ Elizabet, bụ́ nwunye nke onye nchụaja ahụ bụ onye ebo Livaị, bụ́ Zekaraịa. Ya na di ya “bụ ndị ezi omume n’ihu Chineke, na-aga n’ihe nile Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] nyere n’iwu na n’ihe nile ọ gụrụ n’ihe ziri ezi na-adịghị ịta ụta.” (Luk 1:5, 6) Jehova meere Elizabet ihe ọma n’ihi na, ọ bụ ezie na ọ bụ nwanyị àgà nke mewokwara agadi, ọ ghọrọ nne nke Jọn Onye Na-eme Baptism.—Luk 1:7, 13.

21 N’ịbụ onye mmụọ nsọ kpaliri, Elizabet gosipụtara ịhụnanya dị omimi maka nwanyị ọzọ nke na-asọpụrụ Chineke n’oge ya, bụ́ onye ikwu ya aha ya bụ Meri. N’ihe dị ka oge ọgwụgwụ nke afọ 3 T.O.A., mgbe mmụọ ozi bụ Gebriel gwara Meri na ọ gaje ịtụrụ ime otu nwa (Jisọs) n’ụzọ ọrụ ebube, ọ gwara ya okwu, sị: “Gị onye Chineke meworo ka ị nara amara,” na-ekwukwa, sị: “Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] nọnyeere gị.” N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, Meri jere ileta Elizabet, bụ́ onye gọziri ya na nwa nke o bu n’afọ, na-akpọ Jisọs ‘Onyenwe ya’ ọbụna tupu a mụọ ya. Mgbe nke ahụ mere, Meri tiwapụrụ mkpu otuto nye Jehova, bụ́ nke na-agba akaebe nye nsọpụrụ dị omimi o nwere n’ebe Chineke nọ.—Luk 1:28, 31, 36-55.

22. Mgbe a mụsịrị Jisọs, olee nwanyị nke na-atụ egwu Chineke nke gosiri na ya so ná ndị nọ na-echere Mesaịa ahụ?

22 Mgbe a mụrụ Jisọs, Meri wee kuru ya bịa n’ụlọ nsọ ahụ dị na Jerusalem iche ya n’ihu Jehova, otu nwanyị ọzọ na-atụ egwu Chineke, bụ́ onye amụma nwanyị ahụ meworo agadi, bụ́ Ana, kwupụtara ọṅụ ya. O kelere Jehova, kwuokwa okwu banyere Jisọs gwa ndị nile na-echeresi Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa ike.—Luk 2:36-38.

23. Olee ụzọ Pita onyeozi si kwuo okwu banyere ndị inyom kwesịrị ntụkwasị obi ndị biri tupu oge ndị Kraịst, oleekwa ajụjụ ndị a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

23 Otú a, mgbe oge ije ozi elu ala nke Jisọs na-abịaru nso, a ka nwere ‘ndị inyom ndị dị nsọ, ndị na-ele anya Chineke.’ (1 Pita 3:5) Ụfọdụ n’ime ndị inyom ndị a ghọrọ ndị na-eso ụzọ Kraịst. Olee ụzọ Jisọs si mesoo ha? È nwekwara ndị inyom n’oge a ndị ji obi ụtọ na-anakwere ọnọdụ ha dị ka e setịpụrụ ya na Bible? Ndị a bụ ajụjụ ndị a ga-enyocha n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a  Mpịakọta 3, peji 1055.

b  N’otu aka ahụ, “Adam ikpeazụ” ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst, bụkwa mmadụ zuru okè, ọ bụ ezie na o nweghị nwunye ọ bụla bụ mmadụ.—1 Ndị Kọrint 15:45.

Ajụjụ maka Ntụleghachi

◻ Olee otú ụzọ e si mesoo ndị inyom n’Israel si dị iche n’ihe a na-eme n’ala ndị ozọ?

◻ Ọnọdụ dịgasị aṅaa ka Adam na Iv nwere, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

◻ Ọnọdụ dị aṅaa ka ụmụ nwanyị ndị Israel nwere n’okpuru Iwu ahụ, hà nọkwa n’ọnọdụ ebe e megburu ha emegbu n’ụzọ ime mmụọ?

◻ Gịnị bụ ihe mmụta ụfọdụ a pụrụ inweta site ná ndụ nke ndị inyom ụfọdụ pụtara ìhè n’Akwụkwọ nsọ Hibru?

◻ Ezi ihe nlereanya dịgasị aṅaa nke okwukwe ka a pụrụ ịchọta n’agbanyeghị ụzọ e si ele ihe anya n’okpukpe ndị Juu?

[Igbe dị na peeji nke 10]

“NWANYỊ NKE NA-ATỤ EGWU JEHOVA”

“10 Nwanyị nke na-ejide onwe ya nke ọma, ònye ga-achọpụta ya? N’ihi na ọnụ ahịa ya karịrị ruby nke ukwuu. 11 Obi di ya atụkwasịwo ya obi, ọ dịghịkwa ihe nkwata na-akọ nwoke ahụ. 12 Nwanyị ahụ emesowo ya ezi ihe, ọ bụghịkwa ihe ọjọọ, ụbọchị nile nke ndụ ya. 13 Ọ chọwo ajị́ anụ na flax, wee na-arụ ọrụ na-atọ aka ya abụọ ụtọ. 14 Ọ dị ka ụgbọ onye ahịa; site n’ebe dị anya ka ọ na-eweta nri ya. 15 Ọ na-ebilikwa mgbe abalị na-adịkwa, wee nye ụlọ ya nri, nyekwa ụmụ agbọghọ ya òkè ha. 16 O zuwo ìzùzù ọhịa, wee nweta ya: site n’ihe aka ya abụọ rụtara ka ọ kụworo ubi vine. 17 O kewo ike n’úkwù ya dị ka ihe okike, meekwa ka ógwè aka ya abụọ nwee ume. 18 Ọ matawo na ihe ahịa ya dị mma: oriọna ya adịghị anyụ n’abalị. 19 Aka ya abụọ ka o setịworo n’osisi ịkụkụ ogho, ọbọ aka ya abụọ ejidesiwokwa ozele ike. 20 Ọbọ aka ya ka ọ gbasapụworo nye onye e wedara n’ala; ee, aka ya abụọ ka o setịworo ruo ogbenye ahụ. 21 Ọ dịghị atụ egwu snow, na ọ ga-eme ụlọ ya ihe; n’ihi na ụlọ ya nile na-eyi uwe uhie [“uwe abụọ abụọ,” NW]. 22 Ákwà mgbaba mara mma ka ọ kpawooro onwe ya; ezi ákwà ọcha na ákwà odo odo ka uwe ya bụ. 23 Onye a maara n’ọnụ ụzọ ama ka di ya bụ, mgbe ọ na-anọdụ n’etiti ndị okenye ala. 24 Uwe ákwà ọcha ka nwanyị ahụ kpaworo, wee ree ya; ihe okike ka o nyeworo onye ahịa. 25 Ike na ịma mma bụ uwe oyiyi ya; ọ na-achịkwa ụbọchị dị n’ihu ọchị. 26 Ọnụ ya ka ọ sagheworo n’amamihe; iwu nke ebere dịkwasịkwa n’ire ya. 27 Ọ na-eche ojije nile nke ezinụlọ ya nche nke ọma, ọ bụghịkwa nri umengwụ ka ọ na-eri. 28 Ụmụ ya ebiliwo, kpọọ ya nwanyị ihe na-agara nke ọma [“obi ụtọ,” NW]; di ya kwa, ọ na-etokwa ya, sị: 29 Ọtụtụ ụmụ ndị inyom emewo omume kwesịrị ndị inyom na-ejide onwe ha nke ọma, ma gị onwe gị kachasị ha nile. 30 Amara bụ ụgha, ịma mma bụkwa ihe efu: ma nwanyị nke na-atụ egwu Jehova, nwanyị ahụ ga-enwe otuto. 31 Nyenụ ya ihe sitere na nke aka ya abụọ rụtara; ka ọrụ ya nile tookwa ya n’ọnụ ụzọ ama nile.”—Ilu 31:10-31.

[Foto dị na peeji nke 8, 9]

Ọnọdụ onye bụ nwanyị n’ime ezinụlọ bụ nke dị ùgwù

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya