Bible Ọ̀ Na-emegide Onwe Ya?
ONYE na-ede akwụkwọ bụ́ Henry Van Dyke dere n’otu mgbe, sị: “N’ịbụ nke a mụrụ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa ma bụrụ nke e depụtara n’ụdị na n’asụsụ ihe atụ nke Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, Bible ji ụkwụ a ma ama na-ejegharị n’ụzọ dị iche iche nke ụwa nile, na-abanyekwa site n’otu ala ruo n’ala ọzọ iji chọta ihe ndị bụ nke ya n’ebe nile. Bible amụtawo ịgwa obi mmadụ okwu n’ọtụtụ narị asụsụ. Ụmụaka ji ịtụnanya na obi ụtọ na-aṅa ntị n’akụkọ ya dị iche iche, ndị ikom maara ihe na-atụgharị uche na ha dị ka ilu dị iche iche nke ndụ. Ndị ajọ omume na ndị dị mpako na-ama jijiji n’ihi ịdọ aka na ntị ya, ma nye ndị ahụ e merụrụ ahụ na ndị nwere nchegharị, o nwere olu nke nne. . . . Ọ dịghị onye nwere akụ nke a dị oké ọnụ ahịa dị ka nke ya nke bụ onye ogbenye ma ọ bụ onye tọgbọrọ n’efu.”
N’ezie, Bible ‘amụtawo ikwu okwu n’ọtụtụ narị asụsụ.’ Ọ dịkarịa ala otu n’ime 66 akwụkwọ ya abụrụwo nke a sụgharịrị gaa na 1,970 asụsụ dị iche iche. Ọtụtụ nde mmadụ na-ele Bible anya dị ka onyinye sitere n’aka Chineke ma jiri obi ụtọ na-agụ ya, na-enwetakwa abamuru. Otú ọ dị, ndị ọzọ na-ekwu na o nwere ebe ndị na-emegide onwe ha n’ime ya, na n’ihi ya a pụghị ịdabere na ya. Gịnị ka nnyocha e jiri nlezianya mee na-ekpughe?
Dị ka e gosiri n’ihe osise anyị dị n’ihu magazin a, Chineke jiri ndị ikom kwesịrị ntụkwasị obi dee Bible. N’ezie, ntụle e jiri nlezianya tụlee Bible na-ekpughe na ihe dị ka 40 ndị ikom dere ya n’ogologo oge dị 16 narị afọ. Hà bụ ndị ọkà n’ide ihe? Ee e. N’etiti ha, mmadụ pụrụ ịchọta onye na-azụ atụrụ, onye na-akụ azụ, onye ọna ụtụ, onye dibia, onye na-akpa ákwà ụlọ ikwuu, onye nchụàjà, onye amụma, na eze. Ọtụtụ mgbe, ihe odide ha na-akpọtụ ndị mmadụ na omenala aha, bụ́ ndị anyị na-amaghị na narị afọ nke 20 nke a. N’ezie, ọ bụghị mgbe nile ka ndị dere Bible ghọtara ihe ihe ha dere pụtara. (Daniel 12:8-10) Ya mere, anyị ekwesịghị inwe ihe iju anya ma ọ bụrụ na anyị ezute ihe ụfọdụ ndị siri ike nghọta mgbe anyị na-agụ Bible.
À pụrụ idozi ihe isi ike ndị dị otú ahụ? Bible ọ̀ na-emegide onwe ya? Iji chọpụta, ka anyị tụlee ihe atụ ụfọdụ.
Ndị A Hà Bụ n’Ezie Ihe Isi Ike?
▪ Olee ebe Ken nwetara nwunye ya? (Jenesis 4:17)
Mmadụ pụrụ iche na mgbe e gbusịrị Ebel, nanị nwanne ya nwoke ikpe mara bụ́ Ken, na ndị mụrụ ha, bụ́ Adam na Iv, bụ ndị fọdụrụ n’elu ala. Otú ọ dị, Adam na Iv nwere ezinụlọ buru ibu. Dị ka Jenesis 5:3, 4 si kwuo, Adam nwere nwa nwoke aha ya bụ Set. Ihe odide ahụ kwukwara, sị: “Ụbọchị nile nke Adam, mgbe ọ mụsịrị Set, bụ narị afọ asatọ: [“Ka ọ dị ugbu a,” NW] ọ mụọ ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.” Ya mere Ken lụrụ nwanne ya nwanyị ma ọ bụ otu n’ime nwa ụmụnne ya. Ebe agbụrụ mmadụ nọ izu òkè mmadụ nso, o doro anya na ụdị alụmdi na nwunye dị otú ahụ ewetaghị ihe ize ndụ ahụ ike, bụ́ nke pụrụ ịbụ ihe ize ndụ nye ụmụ nke si n’ihe njikọ dị otú ahụ taa pụta.
▪ Ònye rere Josef jee Ijipt?
Jenesis 37:27 na-ekwu na ụmụnne Josef kpebiri iresị ya ndị Ishmael. Ma amaokwu nke na-eso na-ekwu, sị: “Ndị Midian, bụ́ ndị ahịa, wee gabiga; ha [ụmụnne Josef] wee sere Josef, si n’olulu dọlite ya, ree Josef nye ndị Ishmael n’iri mkpụrụ ego ọlaọcha abụọ. Ha wee kubata Josef n’Ijipt.” Ọ̀ bụ ndị Ishmael ka ọ̀ bụ ndị Midian ka e resịrị Josef? Otú ọ dị, ọ pụkwara ịbụ na a kpọwo ndị Midian ndị Ishmael, bụ́ ndị ha na ha bụ ụmụnne site na nna nna ha bụ Abraham. Ma ọ bụkwanụ na ndị ahịa bụ́ ndị Midian na otu ìgwè ndị Ishmael na-eme njem so na-aga. Otú o sina dị, ọ bụ ụmụnne Josef rere ya, mgbe e mesịkwara ọ pụrụ ịgwa ha sị: “Mụ onwe m bụ Josef nwanne unu, onye unu rere jee n’Ijipt.”—Jenesis 45:4.
▪ Ndị Israel ole nwụrụ n’ihi isoro ndị inyom Moab kwaa iko na n’ihi itinye aka n’ofufe nke Beal-peoa?
Ọnụ Ọgụgụ 25:9 na-ekwu, sị: “Ndị nwụrụ n’ihe otiti ahụ [site n’aka Chineke n’ihi omume ọjọọ ha] dị puku iri abụọ na anọ.” Otú ọ dị, Pọl onyeozi kwuru, sị: “Ka anyị gharakwa ịkwa iko, dị ka ụfọdụ n’etiti ha [ndị Israel n’ọzara] kwara, wee daa nwụọ n’otu ụbọchị, [puku iri abụọ na atọ].” (1 Ndị Kọrint 10:8) Ma eleghị anya, ọnụ ọgụgụ ndị e gburu egbu dị n’agbata 23,000 na 24,000, nke na nke ọ bụla n’ọnụ ọgụgụ abụọ ahụ ga-ezicha ezi. Ma, akwụkwọ Ọnụ Ọgụgụ karịsịa na-egosi na ndị ikpe gburu “ndị isi nile nke ndị” a tinyere aka ná mmehie nke a. (Ọnụ Ọgụgụ 25:4, 5) Ọ pụrụ ịbụ na e nwere 1,000 “ndị isi” ndị a ikpe mara, na-eme ka e nwee nchịkọta ọnụ ọgụgụ nke 24,000 mgbe a gbakwụnyere ya na 23,000 nke Pọl kpọtụrụ uche. Ebe ọ bụ ihe doro anya na 23,000 nwụrụ kpọmkwem site n’ihe otiti ahụ sitere n’aka Chineke, 24,000 nile natara ihe otiti nke sitere n’aka Jehova n’ihi na nke ọ bụla n’ime ha nwụrụ n’okpuru ikpe ọmụma nke o kwupụtara.—Deuterọnọmi 4:3.
▪ Èbe Egag dịrị ndụ n’oge eze Israel bụ Sọl, izo aka nke Belam zoro n’ebe otu onye ọchịchị Amalek nọ, nke nwere aha ahụ, ọ̀ bụghị ọdịiche?
N’ihe dị ka na 1473 T.O.A., Belam buru amụma na otu eze Israel “ga-adịkwa elu karịa Egag.” (Ọnụ Ọgụgụ 24:7) E zoghị aka ọ bụla ọzọ banyere Egag ruo n’oge ọchịchị nke Eze Sọl (1117-1078 T.O.A.). (1 Samuel 15:8) Otú ọ dị, nke a abụghị ọdịiche, n’ihi na ọ pụrụ ịbụ na “Egag” bụ útú aha usoro ndị eze nke yiri nke Fero n’Ijipt. Ọ pụkwara ikwe mee na Egag bụ aha dịịrị onye, nke ndị ọchịchị nke Amalek jiri mee ihe mgbe mgbe.
▪ Ònye kpatara Devid ji gụọ ndị Israel ọnụ?
Samuel nke Abụọ 24:1 na-ekwu, sị: “Iwe Jehova wee dịkwa ọkụ ọzọ megide Israel, o wee kpalie Devid megide ha, sị, Jee, gụọ Israel na Juda.” Ma, ọ bụghị Jehova bụ onye kpaliri Eze Devid imehie, n’ihi na 1 Ihe Emere 21:1 na-ekwu, sị: “Setan wee guzoo imegide Israel, o wee kpalie Devid ịgụta Israel.” Ihe banyere ụmụ Israel atọghị Chineke ụtọ, n’ihi nke a kwa ọ hapụrụ ka Setan Ekwensu tụkwasị ha mmehie nke a. N’ihi nke a, 2 Samuel 24:1 na-agụ dị ka à ga-asị na ọ bụ Chineke n’onwe ya mere ya. N’ụzọ na-adọrọ mmasị, nsụgharị Joseph B. Rotherham na-agụ, sị: “Iwe nke Yawe nwuuru ọkụ megide Israel, nke na ọ tara Devid ahụhụ ibili megide ha na-asị, Gaa gụọ Israel na Juda ọnụ.”
▪ Olee otú a pụrụ isi mee ka ọnụ ọgụgụ ndị dị iche e nyere maka ndị Israel na ndị Juda n’ọgụgụ ọnụ nke Devid kwekọọ?
Na 2 Samuel 24:9, ọnụ ọgụgụ ndị ahụ bụ 800,000 ndị Israel na 500,000 ndị Juda, ebe 1 Ihe Emere 21:5 na-ekwu na ọnụ ọgụgụ ndị ikom na-alụ agha nke Israel bụ 1,100,000 na Juda bụkwa 470,000. Ndị a na-edeba aha ha mgbe nile n’ije ozi eze bụ 288,000 ìgwè ndị agha, nke e kewara gaa na 12 ìgwè dị iche iche nke 24,000 maka ìgwè nke ọ bụla, ìgwè nke ọ bụla na-eje ozi otu ọnwa n’ime otu afọ. E nwekwara 12,000 ndị ozi ọzọ nye 12 ndị isi nke agbụrụ dị iche iche, na-eme ka e nwee ngụkọta nke 300,000. N’ụzọ doro anya, 1,100,000 nke 1 Ihe Emere 21:5 na-agụnye 300,000 nke a e debataworo aha ha, ebe 2 Samuel 24:9 na-emeghị otú a. (Ọnụ Ọgụgụ 1:16; Deuterọnọmi 1:15; 1 Ihe Emere 27:1-22) Banyere Juda, o doro anya na 2 Samuel 24:9 gụnyere 30,000 ndị ikom nọ n’ìgwè ndị agha nche, bụ́ ndị e mere ka ha nọrọ n’ókèala ebe ndị Filistia nọ ma bụrụ ndị a na-agụnyeghị n’ọnụ ọgụgụ dị na 1 Ihe Emere 21:5. (2 Samuel 6:1) Ọ bụrụ na anyị echeta na ọ bụ ndị ikom abụọ nwere ụzọ ndị dị iche ha si ele ihe anya na nzube ndị dị iche dere 2 Samuel na 1 Ihe Emere, anyị pụrụ ime ka ọnụ ọgụgụ ndị ahụ kwekọọ.
▪ Ònye bụ nna Shealtiel?
Ụfọdụ ihe odide na-egosi na Jekonaịa (Eze Jehoiakin) bụ nna anụ ahụ nke Shealtiel. (1 Ihe Emere 3:16-18; Matiu 1:12) Ma onye dere Oziọma Luk kpọrọ Shealtiel “nwa Niraị.” (Luk 3:27) O doro anya na Niraị nyere Shealtiel ada ya dị ka nwunye. Ebe ndị Hibru na-ezokarị aka n’ebe onye lụrụ nwa ha nwanyị nọ dị ka nwa ha nwoke, karịsịa n’ihe banyere usoro ọmụmụ, Luk pụrụ izi ezi n’ịkpọ Shealtiel, nwa Niraị. N’otu aka ahụ, Luk zoro aka n’ebe Josef nọ dị ka nwa Hili, onye bụ n’ezie nna nke nwunye Josef, bụ́ Meri.—Luk 3:23.
Ime Ka Ihe Odide Ndị Metụtara Jisọs Kwekọọ
▪ Site ná ndị ikom ole ka Jisọs Kraịst chụpụrụ ndị mmụọ ọjọọ ahụ banyere n’ime otu ìgwè ézì buru ibu?
Onye ahụ dere Oziọma bụ́ Matiu kpọtụrụ ndị ikom abụọ aha, ma Mak na Luk zoro aka na nanị otu. (Matiu 8:28; Mak 5:2; Luk 8:27) O yiri ka Mak na Luk hà dọọrọ uche gaa nanị n’otu nwoke nwere ndị mmụọ ọjọọ n’ihi na Jisọs gwara ya okwu, ọnọdụ nke ya pụtakwara ìhè karị. Ọ pụrụ ịbụ na nwoke ahụ na-eme ihe ike karị ma ọ bụ na ọ tawo ahụhụ n’okpuru ike ndị mmụọ ọjọọ ruo ogologo oge karị. Mgbe e mesịrị, ma eleghị anya, nanị otu nwoke ahụ chọrọ isonyere Jisọs. (Mak 5:18-20) N’ọnọdụ ya na nke ahụ yidebere, Matiu kwuru okwu banyere ndị ikom abụọ kpuru ìsì Jisọs gwọrọ, ebe Mak na Luk kpọtụrụ nanị otu aha. (Matiu 20:29-34; Mak 10:46; Luk 18:35) Nke a adịghị emegide onwe ya, n’ihi na ma ọ dịghị ihe ọzọ, e nwere otu nwoke dị otú ahụ.
▪ Àgwà dị aṅaa ka uwe Jisọs yi n’ụbọchị ọnwụ ya nwere?
Dị ka ihe Mak (15:17) na Jọn (19:2) kwuru si dị, ndị agha ahụ yinyere Jisọs uwe na-acha odo odo. Ma Matiu (27:28) kpọrọ ya “uwe uhie,” na-emesi ike na ọ na-acha ọbara ọbara. Ebe odo bụ àgwà ọ bụla nke nwere akụkụ dị ma ọbara ọbara ma anụnụ anụnụ, Mak na Jọn kwetara na uwe ahụ nwere ụcha nke ọbara ọbara. Mgbukepụ nke ìhè na gburugburu ebe ahụ pụrụ inyeworị uwe ahụ ụdị àgwà dị iche iche, ndị ahụ kwa dere Oziọma kwuru okwu banyere àgwà nke kasị pụta ìhè nye ha ma ọ bụ nye ndị ahụ ha nwetara ihe ọmụma ha site n’aka ha. Obere ọdịiche ahụ na-egosi ọdịiche onwe onye nke ndị ahụ dere ha ma na-egosipụta na e nweghị ìzù aghụghọ ọ bụla ha gbara iji duhie ndị mmadụ.
▪ Ònye butere osisi ịta ahụhụ nke Jisọs?
Jọn (19:17, NW) kwuru, sị: “N’iburu osisi ịta ahụhụ ahụ n’onwe ya, [Jisọs] pụrụ gaa n’ebe ahụ a na-akpọ Ebe Okpokoro Isi, bụ́ nke a na-akpọ Golgota na Hibru.” Ma Matiu (27:32, NW), Mak (15:21, NW), na Luk (23:26, NW) na-ekwu na ‘ka ha na-apụ, a manyere Saịmọn onye Saịrini ije ozi nke ibu osisi ịta ahụhụ ahụ.’ Jisọs buru osisi ịta ahụhụ ya, dị ka Jọn kwuru. Otú ọ dị, n’ihe ndekọ ya nke achịkọtara ka ọ dị nkenke, Jọn etinyeghị isi ihe ahụ nke bụ na e mesịrị manye Saịmọn ije ozi nke ibu osisi ahụ. Otú a, ihe ndekọ nke Oziọma ahụ kwekọrọ n’akụkụ nke a.
▪ Olee otú Judas Iskarịọt si nwụọ?
Matiu 27:5 na-ekwu na Judas kwụgburu onwe ya, ebe Ọrụ 1:18 na-ekwu na “o wee daa sụọ isi n’ala, tipuo afọ ya, ngịrị afọ ya nile wee nupụta.” Ebe o yiri ka Matiu ọ̀ na-ekwu banyere otú o si nwaa igbu onwe ya, Ọrụ Ndị Ozi na-akọwa ihe ndị si n’ime ya pụta. Ọ pụrụ ịbụ na Judas kenyere eriri n’alaka osisi, kee ya gburugburu n’olu ya ebe ọ pụrụ isi sechịa, ma nwaa ịkwụgbu onwe ya site n’ịwụpụ site n’ebe dị n’elu. O yiri ka eriri ahụ dọbiri ma ọ bụ alaka osisi ahụ gbajipụrụ nke mere na o siri n’elu daa wee sụwaa afọ ya na nkume ndị dị n’ala. Ọdịdị ala dị gburugburu Jerusalem na-eme ka nkwubi okwu dị otú ahụ bụrụ ihe amamihe dị na ya.
Olee Otú Ị Ga-esi Lee Ihe Anya?
Ọ bụrụ na anyị ezute ihe ndị yiri ka ha bụ ọdịiche e nwere na Bible, ọ dị mma ịghọta na ọtụtụ mgbe ndị mmadụ na-ekwu ihe ndị yiri ka ha na-emegide onwe ha ma dịrị mfe nkọwa ma ọ bụ nghọta. Dị ka ihe atụ, onye ji ego achụ ego pụrụ isoro mmadụ na-ederịta akwụkwọ ozi site n’ịkpọpụtara odeakwụkwọ ya akwụkwọ ozi. Ọ bụrụ na a jụọ ya, ọ ga-asị na ọ bụ ya zijere akwụkwọ ozi ahụ. Ma ebe odeakwụkwọ ya bipụtara ma zipụ akwụkwọ ozi ahụ, ọ pụrụ ikwu na ọ bụ ya zipụrụ ya. N’otu aka ahụ, ọ bụghị imegide onwe ya Matiu (8:5) ikwu na otu ọchịagha bịara ịrịọ Jisọs maka ihu ọma, ebe Luk (7:2, 3) sịrị na nwoke ahụ zigara ndị nnọchianya.
Ihe atụ ndị a a kpọtụworo aha na-egosi na a pụrụ idozi ihe isi ike dị iche iche nke Bible. N’ihi ya, e nwere ezi ihe mere a ga-eji nwee àgwà ziri ezi n’ebe Akwụkwọ nsọ dị. A tụrụ aro maka mmụọ dị otú ahụ n’okwu ndị a pụtara n’otu Bible ezinụlọ nke e bipụtara n’afọ 1876:
“Mmụọ ziri ezi nke a ga-eji mesoo ihe isi ike ndị ahụ bụ iwepụ ha n’ebe dị anya ruo otu o kwere mee, na ịrapagide na ịnọ n’okpuru eziokwu ahụ, ọbụna mgbe a na-apụghị iwepụchasị ihe mgbagwoju anya nile site na ya. Anyị kwesịrị iṅomi ihe nlereanya nke onyeozi ahụ, onye, mgbe ụfọdụ ndị na-eso ụzọ nwere mwute n’ihi ihe ha kpọrọ ‘okwu siri ike,’ wee chọọ ịhapụ Kraịst, jiri nke a mechie ihe ịrụ ụka nile: ‘Onyenwe anyị, ònye ka anyị ga-ejekwuru? Gị onwe gị nwere okwu nile nke ndụ ebighị ebi, o dokwara anyị anya na Gị onwe gị bụ Kraịst ahụ, Ọkpara nke Chineke ahụ dị ndụ.’ . . . Mgbe anyị hụrụ eziokwu nke yiri ka ọ na-emegide eziokwu ọzọ, ka anyị gbalịa mee ka ha kwekọọ, gosikwa ha ndị nile n’ọnọdụ dị otú a kwekọrọ ekwekọ.”—Jọn 6:60-69.
Ị̀ ga-ewere ụdị ọnọdụ dị otú ahụ? Mgbe e nyochasịrị nanị ihe atụ ole na ole ndị na-egosi nkwekọ nke Akwụkwọ nsọ, e nwere olileanya na i kwenyeere onye ọbụ abụ ahụ, bụ́ onye gwara Chineke sị: “Isi ihe nke okwu gị bụ eziokwu.” (Abụ Ọma 119:160) Ndịàmà Jehova nwere echiche ahụ n’ebe Bible dum nọ, ha ga-enwekwa obi ụtọ ikwu ihe mere ha ji nwee okwukwe na ya. Gịnị mere isoroghị ha tụlee akwụkwọ nke a na-enweghị akwụkwọ dị ka ya? Ozi ya na-emesi obi ike pụrụ ime ka ijupụta n’ezi olileanya na obi ụtọ.
[Foto dị na peeji nke 7]
Ị̀ jụwo Ndịàmà Jehova ihe mere ha ji nwee okwukwe na Bible?