Nkebi nke 1
Onye Okike Nyere Mmadụ Paradaịs
Ọ bụ Chineke kere eluigwe na ụwa na ihe niile dị ndụ n’ụwa; o kere nwoke na nwaanyị zuru okè, mee ka ha nọrọ n’otu ogige mara mma ma nye ha iwu ndị ha ga-edebe
“NÁ MMALITE, Chineke kere eluigwe na ụwa.” (Jenesis 1:1) A kpọrọ okwu ndị a okwu mmalite a kacha mara amara. Baịbụl ji okwu ndị ahụ dị mfe ma maa mma kọwaara anyị Onye kacha mkpa e kwuru okwu ya n’Akwụkwọ Nsọ niile, ya bụ, Jehova, bụ́ Chineke pụrụ ime ihe niile. Amaokwu mbụ ahụ dị na Baịbụl gosiri na ọ bụ Chineke kere eluigwe nakwa ụwa a anyị bi na ya. Amaokwu ndị ọzọ kọwara na o were Chineke ogologo oge dị iche iche a kpọrọ ụbọchị, iji meziere anyị ụwa, bụ́ ebe anyị ga-ebi. O kekwara ihe niile dị ịtụnanya n’ime ya.
Ọ bụ mmadụ kacha mkpa n’ihe niile Chineke kere n’ụwa. E kere ya n’onyinyo Chineke, ya bụ, o nwere àgwà ụfọdụ Jehova nwere, dị ka ịhụnanya na amamihe. Chineke ji ájá si n’ala kpụọ mmadụ ma gụọ ya Adam. O mere ka ọ nọrọ na paradaịs, ya bụ, ogige Iden. Ọ bụ Chineke ji aka ya dozie ogige ahụ ma kụọ osisi ndị mara mma na-amị mkpụrụ na ya.
Chineke chọpụtara na nwoke ahụ kwesịrị inwe nwunye. N’ihi ya, o ji otu ọgịrịga Adam kpụọ nwaanyị ma kpọnye ya Adam ka ọ bụrụ nwunye ya. Adam mechara gụọ ya Iv ma jiri ọṅụ bụọ abụ, sị: “Ehee! Onye a bụ ọkpụkpụ nke si n’ọkpụkpụ m na anụ ahụ́ nke si n’anụ ahụ́ m.” Chineke kwuru, sị: “Ọ bụ ya mere nwoke ga-eji hapụ nna ya na nne ya wee rapara n’ahụ́ nwunye ya, ha ga-aghọkwa otu anụ ahụ́.”—Jenesis 2:22-24; 3:20.
Chineke nyere Adam na Iv iwu abụọ. Nke mbụ, ọ gwara ha ka ha na-akọ ihe n’ebe obibi ha ma na-elekọta ya, nakwa ka ha mụjuo ya ụmụ. Nke abụọ, ọ gwara ha erila mkpụrụ si n’otu osisi dị ná nnukwu ogige ahụ dum, nke bụ́ “osisi ịma ihe ọma na ihe ọjọọ.” (Jenesis 2:17) Ọ bụrụ na ha enupụ isi, ha ga-anwụ. Iwu ndị ahụ Chineke nyere nwoke na nwaanyị ahụ ga-eme ka ha nwee ike igosi na ha chọrọ ka ọ na-achị ha. Ọ bụrụ na ha erube isi, ọ ga-egosikwa na ha hụrụ Chineke n’anya nakwa na obi dị ha ụtọ n’ihi ihe o meere ha. E nweghị ihe kwesịrị ime ka ha jụ ọchịchị obiọma ya. Mmadụ abụọ ahụ zuru okè enweghị ntụpọ ọ bụla. Baịbụl gwara anyị, sị: “Chineke hụrụ ihe niile o mere, ma, lee! ha dị nnọọ mma.”—Jenesis 1:31.
—O si na Jenesis isi nke 1 na nke 2.
◼ Gịnị ka Baịbụl kwuru banyere otú e si kee ụmụ mmadụ na ụwa ha bi?
◼ Olee ụdị ndụ Chineke chọrọ ka nwoke na nwaanyị na-ebi?
◼ Olee iwu abụọ Chineke nyere nwoke na nwaanyị mbụ?
Igbe dị na peeji nke 4]
AHA CHINEKE
E ji utu aha dị iche iche kọwaa Chineke n’Akwụkwọ Nsọ, dị ka Onye Okike na Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile. Utu aha ụfọdụ kọwara ihe ndị e ji mara Chineke, dị ka ịdị nsọ ya, ike ya, ikpe ziri ezi ya, amamihe ya, na ịhụnanya ya. Ma, Chineke gụkwara onwe ya aha pụrụ iche bụ́ Jehova. N’asụsụ ndị mbụ e ji dee Baịbụl, aha Chineke pụtara ihe dị ka ugboro puku asaa. Ebe mbụ ọ pụtara bụ na Jenesis 2:4. Jehova pụtara “Ọ Na-eme Ka Ọ Ghọọ.” Nke ahụ na-eme ka obi sie anyị ike, n’ihi na ọ pụtara na Chineke ga-emezu ihe ọ bụla o bu n’obi na ihe ọ bụla o kwere anyị ná nkwa.
[Chaatị dị na peeji nke 4]
● Jenesis
Ọpụpụ
Levitikọs
Ọnụ Ọgụgụ
Diuterọnọmi
Jọshụa
Ndị Ikpe
Rut
1 Samuel
2 Samuel
1 Ndị Eze
2 Ndị Eze
1 Ihe E Mere
2 Ihe E Mere
Ezra
Nehemaya
Esta
Job
Abụ Ọma
Ilu
Ekliziastis
Abụ Sọlọmọn
Aịzaya
Jeremaya
Abụ Ákwá
Ezikiel
Daniel
Hosia
Joel
Emọs
Obedaya
Jona
Maịka
Nehọm
Habakọk
Zefanaya
Hagaị
Zekaraya
Malakaị
Matiu
Mak
Luk
Jọn
Ọrụ Ndịozi
Ndị Rom
1 Ndị Kọrịnt
2 Ndị Kọrịnt
Ndị Galeshia
Ndị Efesọs
Ndị Filipaị
Ndị Kọlọsi
1 Ndị Tesalonaịka
2 Ndị Tesalonaịka
1 Timoti
2 Timoti
Taịtọs
Faịlimọn
Ndị Hibru
Jems
1 Pita
2 Pita
1 Jọn
2 Jọn
3 Jọn
Jud
Mkpughe