-
“M Maara Nnọọ Ihe Mgbu Ha Na-enwe”Ụlọ Nche—2009 | Mach 1
-
-
Otu ụbọchị, ka Mozis na-azụ atụrụ, ọ hụrụ otu ihe tụrụ ya nnọọ n’anya, ya bụ, ọkụ nọ na-enwu n’otu osisi ogwu ma “o reghị osisi ogwu ahụ.” (Amaokwu nke 2) N’ihi otú ihe ahụ si ju ya anya, ọ bịakwuru nso ịchọpụta ihe na-emenụ. Jehova ji otu mmụọ ozi ya gwa Mozis okwu site n’etiti osisi ogwu ahụ, sị: “Abịala nso n’ebe a. Yipụ akpụkpọ ụkwụ gị, n’ihi na ebe i guzo bụ ala nsọ.” (Amaokwu nke 5) Chegodị echiche—ala ahụ ghọrọ ebe dị nsọ n’ihi na o nwere onye nọchiri anya Chineke nọ n’ebe ahụ!
-
-
“M Maara Nnọọ Ihe Mgbu Ha Na-enwe”Ụlọ Nche—2009 | Mach 1
-
-
Ọmịiko Chineke na-eme ka anyị nwee olileanya. N’ihi enyemaka ya, anyị bụ́ ụmụ mmadụ na-ezughị okè nwere ike ịdịtụ nsọ ma na-eme ihe na-atọ ya ụtọ. (1 Pita 1:15, 16) Akụkọ Mozis na osisi ogwu ahụ gbara otu nwaanyị, bụ́ Onye Kraịst nke nkụda mmụọ na obi ịda mba kparala aka ọjọọ, ume ma kasie ya obi. Nwaanyị ahụ kwuru, sị: “Ọ bụrụ na Jehova ga-emeli ka ala nkịtị dị nsọ, m kwesịrịnụ inwetụwa olileanya. Echiche a enyerela m ezigbo aka.”
-