Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • dp isi 12 p. 198-209
  • Onye E Mere Ka Ọ Dị Ike Site n’Aka Onye Ozi Chineke Zitere

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Onye E Mere Ka Ọ Dị Ike Site n’Aka Onye Ozi Chineke Zitere
  • Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE NA-AKPATA NCHEGBU
  • ỌHỤỤ NA-EMENYE ỤJỌ
  • E MEE KA ONYE “BỤ IHE A NA-ACHỌSI IKE” DỊ IKE
  • Jehova Ekwee Daniel Nkwa Ụgwọ Ọrụ Magburu Onwe Ya
    Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
  • Gị na Akwụkwọ Daniel
    Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Daniel
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Gị n’Ezie?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
dp isi 12 p. 198-209

Isi nke Iri na Abụọ

Onye E Mere Ka Ọ Dị Ike Site n’Aka Onye Ozi Chineke Zitere

1. Olee otú e si gọzie Daniel maka inwe oké mmasị ná mmezu nke nzube Jehova?

A KWỤGHACHIRI oké mmasị Daniel nwere ná mmezu nke nzube Jehova ụgwọ n’ụba. E nyere ya amụma na-akpali akpali nke izu 70 ahụ banyere oge Mesaịa ga-apụta. A gọzikwara Daniel site n’ime ka ọ hụ ka ndị fọdụrụnụ kwesịrị ntụkwasị obi ná ndị obodo ya laghachiri n’ala ha. Nke ahụ mere na 537 T.O.A., ná ngwụsị nke ‘afọ mbụ nke Saịrọs, bụ́ eze Peasia.’—Ezra 1:1-4.

2, 3. Olee ihe nwere ike ịbụ ya mere Daniel esoghị ndị Juu fọdụrụnụ laghachi n’ala Juda?

2 Daniel esoghị na ndị laghachiri n’ala Juda. Ọ pụrụ ịbụ na ime njem siiri ya ike n’oge agadi ya. Otú o sina dị, Chineke ka bu n’obi inye ya ozi ọzọ na Babilọn. Afọ abụọ gafere. Mgbe ahụ, ihe ndekọ ahụ na-agwa anyị, sị: “N’afọ nke atọ nke Saịrọs, bụ́ eze Peasia, e kpugheere Daniel, onye a kpọrọ aha ya Belteshaza, okwu; ọ bụkwa eziokwu ka okwu ahụ bụ, ọbụna obubuagha ukwu: o wee ghọta okwu ahụ, nghọta dịkwaara ya n’ọhụụ ahụ.”—Daniel 10:1.

3 ‘Afọ nke atọ nke Saịrọs’ ga-adaba na 536/535 T.O.A. Ọ karịala afọ 80 eri a kpụụrụ Daniel na mkpụrụ alaeze na ndị ntorobịa Juda bụ́ ụmụ nke ndị isi bịa Babilọn. (Daniel 1:3) Ọ bụrụ na ọ nọ ná mmalite nke afọ iri na ụma ya mgbe ọ bịarutere Babilọn na nke mbụ ya, ọ ga-adị ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 100 afọ ugbu a. Lee ihe ndekọ magburu onwe ya nke ije ozi n’ikwesị ntụkwasị obi o nwere!

4. N’agbanyeghị agadi Daniel meworo, olee ọrụ dị mkpa ọ ka ga-arụ n’ozi Jehova?

4 Otú ọ dị, n’agbanyeghị ime agadi ya, ọrụ Daniel na-arụ n’ozi Jehova agwụbeghị. Site n’aka ya, Chineke ka ga-akpọsa ozi amụma nke nwere ihe dị ukwuu ọ pụtara. Ọ gaje ịbụ amụma nke ga-adịru n’oge anyị ma gabiga. Iji kwadebe Daniel maka ọrụ ọzọ a, Jehova hụrụ na o kwesiri ekwesị inyere ya aka, ime ka o sie ike maka ozi dị n’ihu.

IHE NA-AKPATA NCHEGBU

5. Olee akụkọ ndị o yiri ka ọ bụ ha kpataara Daniel nchegbu?

5 Ọ bụ ezie na Daniel esoghị ndị Juu fọdụrụnụ laghachi n’ala Juda, o nwere oké mmasị n’ihe na-eme n’ala nna ya ọ hụrụ n’anya. Site n’akụkọ ndị ọ nụrụ, Daniel matara na ihe adịghị aga nke ọma n’ebe ahụ. E wughachiwo ebe ịchụàjà, tọọkwa ntọala nke ụlọ nsọ ahụ na Jerusalem. (Ezra, isi nke 3) Ma mba ndị gbara ha gburugburu na-emegide ọrụ mwughachi ahụ, ha nọkwa na-akpa nkata ọjọọ megide ndị Juu ahụ lọtaworonụ. (Ezra 4:1-5) N’ezie, n’ụzọ dị mfe Daniel pụrụ inweworị nchegbu banyere ọtụtụ ihe.

6. Olee ihe mere ọnọdụ ndị dị na Jerusalem ji na-esogbu Daniel?

6 Daniel maara banyere amụma Jeremaịa. (Daniel 9:2) Ọ maara na e jikọtara nzube Jehova banyere ndị Ya na mwughachi nke ụlọ nsọ ahụ dị na Jerusalem nakwa mweghachi nke ezi ofufe n’ebe ahụ nakwa na ihe a nile ga-ebute mpụta nke Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa ụzọ. N’ezie, Daniel nwere oké ihe ùgwù nke ịnata amụma nke “iri izu asaa” ahụ site n’aka Jehova. Ọ ghọtara site na ya na Mesaịa ahụ ga-abịa “izu” 69 mgbe okwu iweghachi ma wughachi Jerusalem, pụtasịrị. (Daniel 9:24-27) Otú ọ dị, n’ihi Jerusalem ịbụ nke e bibisịrị ebibisị na oge e gburu n’iwu ụlọ nsọ ahụ, ọ dị mfe ịhụ ihe mere Daniel pụrụ ijiworị nwee nkụda mmụọ, obi nkoropụ, na ịda mbà n’obi.

7. Gịnị ka Daniel mere ruo izu atọ?

7 “N’ụbọchị ahụ mụ onwe m, bụ́ Daniel, nọ na-eru újú ogologo izu atọ,” ka ihe ndekọ ahụ na-ekwu. “Nri a na-achọsi ike nke ukwuu ka m na-erighị, anụ na mmanya vine abaghịkwa n’ọnụ m, eteghịkwa m onwe m mmanụ ma ọlị, ruo mgbe ogologo izu atọ ruzuru.” (Daniel 10:2, 3) “Ogologo izu atọ,” ma ọ bụ ụbọchị 21, nke iru újú na ibu ọnụ bụ oge dị nnọọ ogologo gabiga ókè. O yiri ka ọ gwụsịrị “n’ụbọchị nke [iri abụọ na anọ] nke ọnwa mbụ.” (Daniel 10:4) N’ihi ya, oge Daniel buru ọnụ gụnyere oge Ememe Ngabiga, nke a na-eme n’ụbọchị nke 14 nke ọnwa mbụ, bụ́ Nisan, na ememe achịcha na-ekoghị eko na-esochinụ nke na-ewe ụbọchị asaa.

8. Ole mgbe tupu mgbe ahụ ka Daniel chọsiri nduzi Jehova ike, gịnị ka ọ rụpụtawokwara?

8 Daniel enwewo ahụmahụ yiri nke ahụ n’otu oge tupu mgbe ahụ. N’oge ahụ, mmezu nke amụma Jehova banyere afọ 70 nke Jerusalem ga-atọgbọrọ n’efu gbagwojuru ya anya. Gịnị ka Daniel mere mgbe ahụ? “M wee chee Onyenwe anyị Chineke ihu m,” ka Daniel kwuru, “ịchọ Ya n’ekpere na arịrịọ amara dị iche iche, n’obubu ọnụ na ákwà mkpe na ntụ.” Jehova zara ekpere Daniel site n’izitere ya mmụọ ozi Gebriel ka o zie ya ozi gbara ya ume nke ukwuu. (Daniel 9:3, 21, 22) Jehova ọ̀ ga-eme otú ahụ ugbu a ma nye Daniel agbamume dị ya oké mkpa?

ỌHỤỤ NA-EMENYE ỤJỌ

9, 10. (a) Olee ebe Daniel nọ mgbe ọ hụrụ ọhụụ? (b) Kọwaa ihe Daniel hụrụ n’ọhụụ ahụ.

9 E mechughị Daniel ihu. Ọ gara n’ihu ịgwa anyị ihe mezirinụ, na-asị: “Mgbe mụ onwe m nọ n’akụkụ osimiri ukwu ahụ, ya bụ Hidekel, m wee welie anya m abụọ, hụ, ma, lee, otu onye [yi] uwe ọcha, onye e kere ihe okike ọlaedo ọma nke Ufaz n’úkwù ya.” (Daniel 10:4, 5) Hidekel bụ otu n’ime osimiri anọ ndị si n’ogige Iden na-asọpụta. (Jenesis 2:10-14) Na Persian Ochie, a maara Hidekel dị ka Tigra, bụ́ ebe e si nweta aha Grik bụ́ Taịgris. Ógbè dị n’etiti ya na Yufretis ka a kpọrọ Mesopotemia, nke pụtara “Ala Dị n’Etiti Osimiri Abụọ.” Nke a na-akwado na mgbe Daniel natara ọhụụ a, ọ ka nọ n’ala Babylonia, ọ bụ ezie na ma eleghị anya ọ nọghị n’obodo Babilọn.

10 Lee nnọọ ụdị ọhụụ Daniel natara! N’ụzọ doro anya, ọ hụghị mmadụ nkịtị mgbe o leliri anya ya. Daniel nyere nkọwa a doro anya, sị: “Ahụ ya dịkwa ka beryl, ihu ya dịkwa ka àmụ̀mà si dị n’ile ya anya, anya ya abụọ dịkwa ka ọwa na-enwu ọkụ, ogwe aka ya abụọ na ụkwụ ya abụọ dịkwa ka igbu maramara nke ọla a kwọchara akwọcha, olu okwu ya nile dịkwa ka olu ìgwè mmadụ.”—Daniel 10:6.

11. Mmetụta dị aṅaa ka ọhụụ ahụ nwere n’ahụ Daniel na ndị ikom ya na ha nọ?

11 N’agbanyeghị mgbukepụ nke ọhụụ ahụ, “ndị ikom ahụ ndị mụ na ha nọ ahụghị ọhụụ ahụ,” ka Daniel kwuru. N’ihi ihe ụfọdụ a na-ekwughị, “oké ọma jijiji dakwasịrị ha, ha wee gbalaga izobe onwe ha.” Ya mere, a hapụrụ nanị Daniel n’ikperé mmiri ahụ. Ọhụhụ ọ hụrụ “ọhụụ ukwu a” riri ya nnọọ ọnụ nke na o mere nkwupụta, sị: “Ike wee ghara ịfọdụ n’ime m: n’ihi na ebube m gbanwere ghọọ ihe mbibi n’ahụ m, m wee ghara ịnagide ike ọ bụla.”—Daniel 10:7, 8.

12, 13. Gịnị ka a na-egosi banyere onye ozi ahụ site (a) n’uwe ya? (b) n’ọdịdị ya?

12 Ka anyị lerukwuo onye ozi a dị ịrịba ama menyere nnọọ Daniel ụjọ anya. O “[yi] uwe ọcha, onye e kere ihe okike ọlaedo ọma nke Ufaz n’úkwù ya.” N’Israel oge ochie, e ji ezi ákwà ọcha a kpara nke ọma mee ihe okike onyeisi nchụàjà, bụ́ ephod, na ihe igbochi obi, nakwa uwe mwụda nke ndị nchụàjà ndị ọzọ, jirikwa ọlaedo chọọ ha mma. (Ọpụpụ 28:4-8; 39:27-29) Ya mere, uwe onye ozi ahụ na-egosi ịdị nsọ na ịdị ùgwù nke ọkwá ya.

13 Ọdịdị nke onye ozi ahụ menyekwara Daniel ụjọ—mgbukepụ ìhè nke ahụ ya yiri nkume dị oké ọnụ ahịa, oké mgbukepụ nke ihu ya na-egbuke egbuke, ikike na-abami abami nke anya ya na-enwu ka ọkụ, na ịkwọ mụrụ mụrụ nke ogwe aka na ụkwụ ya dị ike. Ọbụna oké ụda olu ya na-atụ egwu. Ihe ndị a nile na-egosi n’ụzọ doro anya na ọ karịrị mmadụ nkịtị. ‘Onye a yi uwe ọcha’ abụghị onye ọzọ ma e wezụga mmụọ ozi nwere ọkwá ukwu, onye jere ozi n’ihu Jehova nke dị nsọ, bụ́ ebe o si jiri ozi bịa.a

E MEE KA ONYE “BỤ IHE A NA-ACHỌSI IKE” DỊ IKE

14. Olee enyemaka dị Daniel mkpa iji nata ozi nke mmụọ ozi ahụ?

14 Ozi nke mmụọ ozi Jehova ga-ezi Daniel dị oké mkpa ma dị mgbagwoju anya. Tupu Daniel enwee ike ịnata ya, ọ chọrọ enyemaka iji gbakee site ná nsogbu elu ahụ na nke uche ya. Ebe o doro anya na ọ maara nke a, mmụọ ozi ahụ ji ịhụnanya nyere Daniel aka, nyekwa ya agbamume n’onwe ya. Ka anyị soro otú Daniel n’onwe ya si kọọ ihe merenụ.

15. Gịnị ka mmụọ ozi ahụ mere iji nyere Daniel aka?

15 “Mgbe m nụrụ olu okwu ya nile mụ onwe m adaworị n’oké ụra kpuo ihu m n’ala, ihu m wee chee n’ala.” Ma eleghị anya, ụjọ na egwu emewo ka Daniel tụbọọ. Gịnị ka mmụọ ozi ahụ mere iji nyere ya aka? Daniel kwuru, sị: “Lee, otu aka metụrụ m, mee ka m guzo na-aṅagharị n’elu ikpere m abụọ na ọbụ aka m abụọ.” Tụkwasị na nke ahụ, mmụọ ozi ahụ gbara onye amụma ahụ ume site n’okwu ndị a: “Daniel, onye bụ ihe a na-achọsi ike nke ukwuu, ghọta okwu nile nke mụ onwe m na-agwa gị, gị guzokwa ọtọ n’ebe nguzo gị; n’ihi na ugbu a ka e ziworo m bịakwute gị.” Enyemaka ahụ na okwu ndị a na-agụgụ obi tụtere Daniel. Ọ bụ ezie na ọ “na-ama jijiji,” Daniel ‘guzoro ọtọ.’—Daniel 10:9-11.

16. (a) Olee otú a pụrụ isi hụ na Jehova na-aza ekpere ndị ohu ya ngwa ngwa? (b) N’ihi gịnị ka mmụọ ozi ahụ ji gbuo oge n’ịbịa nyere Daniel aka? (Gụnye igbe.) (ch) Olee ozi mmụọ ozi ahụ ziri Daniel?

16 Mmụọ ozi ahụ kọwapụtara na ya abịawo kpọmkwem ime ka Daniel dị ike. “Atụla egwu, Daniel,” ka mmụọ ozi ahụ kwuru, “n’ihi na site n’ụbọchị mbụ ahụ mgbe i nyere obi gị ịghọta ihe na iweda onwe gị n’ala n’ihu Chineke gị, a nụrụ okwu gị nile: mụ onwe m abịawokwa n’ihi okwu gị nile.” Mgbe ahụ mmụọ ozi ahụ kọwara ihe mere e ji gbuo oge. Ọ sịrị: “Ma onyeisi alaeze Peasia na-eguzo ná ncherịta ihu m [iri ụbọchị abụọ na otu]; ma, lee, Maịkael, bụ́ otu n’ime ndị isi ndị bụ́ isi, bịara inyere m aka: mụ onwe m wee fọdụ n’ebe ahụ n’akụkụ ndị eze Peasia.” Site n’enyemaka nke Maịkael, mmụọ ozi ahụ nwere ike imezu ihe e ziri ya, ijiri ozi a kasị dịrị ngwa bịakwute Daniel: “Abịawo m ime ka ị ghọta ihe ahụ nke ga-adakwasị ndị gị na mgbe ikpeazụ nke ụbọchị ndị a: n’ihi na ọhụụ fọdụrụ nke dịịrị ụbọchị ndị a.”—Daniel 10:12-14.

17, 18. Olee otú e si nyere Daniel aka na nke ugbo abụọ ya, gịnịkwa ka nke ahụ mere ka o nwee ike ime?

17 Kama Daniel ịbụ onye atụmanya nke ịnata ozi na-akpali akpali dị otú ahụ kpaliri, o yiri ka ihe ndị ọ nụrụ nwere mmetụta na-adịghị mma n’ahụ ya. Ihe ndekọ ahụ na-ekwu, sị: “Mgbe ọ kpanyeere m ụka dị ka okwu ndị a sị dị, m wee chee ihu m n’ala, daa ogbi.” Ma mmụọ ozi ahụ nke bịara ozi dị njikere iji ịhụnanya nye aka—nke ugbo abụọ. Daniel kwuru, sị: “Lee, otu onye nke dị ka oyiyi ụmụ nke mmadụ na-emetụ egbugbere ọnụ m abụọ aka: m wee saghee ọnụ m, kwuo okwu.”b—Daniel 10:15, 16a.

18 E mere ka Daniel dị ike mgbe mmụọ ozi ahụ metụrụ egbugbere ọnụ ya aka. (Tụlee Aịsaịa 6:7.) Ebe e weghachiworo ikike ikwu okwu ya, Daniel nwere ike ịkọwara mmụọ ozi ahụ bịara ozi ihe isi ike ọ nọ na-edi. Daniel kwuru, sị: “Onyenwe m, site n’ọhụụ a ahụ ụfụ m nile dakwasịrị m na mberede, m wee ghara ịnagide ike ọ bụla. Ohu nke onyenwe m nke a ga-esikwa aṅaa nwee ike ịkpanyere onyenwe m nke a ụka? ma mụ onwe m, site n’ugbu a ike adịghị eguzogidekwa n’ime m, ume afọdụghịkwa n’ime m.”—Daniel 10:16b, 17.

19. Olee otú e si nyere Daniel aka nke ugbo atọ ya, gịnịkwa ka ọ rụpụtara?

19 Daniel adịghị eme mkpesa ma ọ bụ na-eme ngọpụ ọ bụla. Nanị ihe ọ nọ na-eme bụ ikwupụta nsogbu ya, mmụọ ozi ahụ nabatakwara ihe o kwuru. N’ihi ya, na nke ugbo atọ ya, mmụọ ozi ahụ bịara ozi nyeere Daniel aka. “Otu onye nke dị ka mmadụ n’ile ya anya wee metụkwa m aka ọzọ, mee ka m dị ike,” ka onye amụma ahụ kwuru. Mgbe onye ozi ahụ metụsịrị ya aka ahụ na-enye ume, o kwuru okwu ndị a na-agụgụ obi: “Atụla egwu, gị onye bụ ihe a na-achọsi ike nke ukwuu: udo dịrị gị, dị ike, ee, dị ike.” Mmetụ aka ịhụnanya ahụ na okwu ndị ahụ na-ewuli elu yiri ka ọ bụ kpọmkwem ihe Daniel chọrọ. Gịnị ka ọ rụpụtara? Daniel kwupụtara, sị: “Mgbe ọ kpanyeere m ụka, m wee mee onwe m ka m dị ike, sị, Ka onyenwe m kwuo; n’ihi na i mewo ka m dị ike.” Daniel dị njikere ugbu a maka ọrụ ọzọ tara akpụ.—Daniel 10:18, 19.

20. N’ihi gịnị ka o ji chọọ mgbalị ka mmụọ ozi ahụ bịara ozi wee rụzuo ọrụ ya?

20 Mgbe o mesịrị ka Daniel dị ike ma nyere ya aka inwetaghachi ikike uche na nke elu ahụ ya, mmụọ ozi ahụ kwughachiri ihe o jiri maka ya bịa. Ọ sịrị: “Ị̀ maara ihe m jiri bịakwute gị? ma ugbu a m ga-alaghachi ibuso onyeisi Peasia agha: ma mgbe mụ onwe m na-apụ, lee, onyeisi Jevan [Gris] ga-abata. Ma otú ọ dị, m ga-egosi gị ihe a kara aka n’ihe e dere n’akwụkwọ nke eziokwu: ma ọ dịghị otu onye na-eme onwe ya ka ọ dị ike n’akụkụ m imegide ndị a, ma ọ bụghị nanị Maịkael, bụ́ onyeisi unu.”—Daniel 10:20, 21.

21, 22. (a) Site n’ahụmahụ Daniel, gịnị ka anyị pụrụ ịmụta banyere ụzọ Jehova si emeso ndị ohu ya ihe? (b) Maka ime gịnị ka e mere ka Daniel dị ike ugbu a?

21 Lee ka nke a si bụrụ ịhụnanya na nchebara echiche n’ebe Jehova nọ! Ọ na-emeso ndị ohu ya ihe mgbe nile n’ụzọ kwekọrọ n’ikike ha na ihe ha pụrụ imeli. N’otu aka, ọ na-enye ha ọrụ kwekọrọ n’ihe ọ maara na ha pụrụ ịrụzu, ọ bụ ezie na mgbe ụfọdụ o nwere ike ha agaghị eche otú ahụ. N’aka nke ọzọ, ọ dị njikere ịṅa ha ntị ma nyezie ha ihe dị ha mkpa iji nyere ha aka ịrụzu ọrụ ha. Ka anyị na-eṅomi Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Jehova, mgbe nile site n’iji ịhụnanya na-agba ndị anyị na ha na-efekọ ofufe ume ma na-eme ka ha dị ike.—Ndị Hibru 10:24.

22 Ozi nkasi obi nke mmụọ ozi ahụ gbara Daniel ume nke ukwuu. N’agbanyeghị ime agadi ya, e mere ka Daniel dị ike ma kwadebe ya ugbu a ịnata na idekọ amụma ọzọ dị ịrịba ama maka abamuru anyị.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Ọ bụ ezie na a kpọghị aha mmụọ ozi a, o yiri ka ọ bụ otu onye ahụ a nụrụ olu ya ka ọ na-agwa Gebriel ka o nyere Daniel aka ịghọta ọhụụ ọ ka hụpụrụ. (Jiri Daniel 8:2, 15, 16 tụnyere Da 12:7, 8.) Ọzọkwa, Daniel 10:13 na-egosi na Maịkael, “otu n’ime ndị isi ndị bụ́ isi,” bịara inyere mmụọ ozi a aka. Ya mere, mmụọ ozi a a na-akpọghị aha aghaghị inweworị obi ụtọ n’ihe ùgwù nke isoro Gebriel na Maịkael na-arụ ọrụ n’ụzọ chiri anya.

b Ọ bụ ezie na otu mmụọ ozi ahụ nke na-akpanyere Daniel ụka pụrụ imetụwo egbugbere ọnụ ya aka ma tụtee ya, okwu e jiri mee ihe n’ebe a pụkwara ịpụta na mmụọ ozi ọzọ, eleghị anya Gebriel, mere nke a. Otú o sina dị, mmụọ ozi nke bịara ozi mere ka Daniel dị ike.

Gịnị Ka Ị Ghọtara?

• N’ihi gịnị ka mmụọ ozi Jehova ji gbuo oge ịbịa nyere Daniel aka na 536/535 T.O.A.?

• Gịnị ka uwe na ọdịdị nke mmụọ ozi Chineke na-egosi banyere ya?

• Olee enyemaka dị Daniel mkpa, oleekwa otú mmụọ ozi ahụ si nyere ya aka ugbo atọ?

• Olee ozi mmụọ ozi ahụ ziri Daniel?

Igbe dị na peeji nke 204, 205]

Ndị Mmụọ Ozi Na-eche Nche Ka Ọ̀ Bụ Ndị Mmụọ Ọjọọ Na-achị Achị?

ANYỊ pụrụ ịmụta ọtụtụ ihe site n’ihe akwụkwọ Daniel na-ekwu banyere ndị mmụọ ozi. Ọ na-agwa anyị banyere òkè ha na-ekere n’imezu okwu Jehova na mgbalị ha na-eme iji rụzuo ọrụ ha.

Mmụọ ozi Chineke kwuru na mgbe ọ na-aga ịgwa Daniel okwu, na “onyeisi alaeze Peasia” gbochiri ya. Mgbe ya na ya gbasịrị mgba ruo ụbọchị 21, mmụọ ozi ahụ bịara ozi nwere ike ịgawa ebe ọ na-aga nanị site n’enyemaka “Maịkael, bụ́ otu n’ime ndị isi ndị bụ́ isi.” Mmụọ ozi ahụ kwukwara na ya ga-ebuso onye iro ahụ agha ọzọ tinyekwara “onyeisi Jevan [Gris]” ma eleghị anya. (Daniel 10:13, 20) Ọrụ a adịghị mfe, ọbụna nye mmụọ ozi! Otú ọ dị, olee ndị bụ ndị isi Peasia na Gris a?

Nke mbụ, anyị na-arịba ama na a kpọrọ Maịkael “otu n’ime ndị isi ndị bụ́ isi” na “onyeisi unu.” Ka oge na-aga, e zoro aka n’ebe Maịkael nọ dị ka “onyeisi ukwu ahụ nke na-eguzo n’akụkụ ụmụ ndị [Daniel].” (Daniel 10:21; 12:1) Nke a na-ezo aka n’ebe Maịkael nọ dị ka mmụọ ozi Jehova nyere ọrụ iduru ụmụ Israel gabiga n’ọzara ahụ.—Ọpụpụ 23:20-23: 32:34; 33:2.

Okwu Jud onye na-eso ụzọ bụ́ na “Maịkael onyeisi mmụọ ozi, mgbe ya na ekwensu na-arụrịta ụka banyere ahụ Mosis, ka ọ na-ekwugide ya” na-akwado nkwubi okwu a. (Jud 9) Ọkwá, ike, na ikike Maịkael nwere mere ya n’ezie “onyeisi mmụọ ozi,” nke na-apụta “mmụọ ozi kasịnụ,” ma ọ bụ “mmụọ ozi bụ́ isi.” N’ụzọ kasị daba adaba, ọ dịghị onye ọzọ a pụrụ iji ọkwá a dị elu mee ihe banyere ya karịa Jisọs Kraịst, bụ́ Ọkpara Chineke, tupu na mgbe o bisịrị ndụ n’elu ụwa.—1 Ndị Tesalọnaịka 4:16; Mkpughe 12:7-9.

Nke a ọ̀ pụtara na Jehova họpụtakwara ndị mmụọ ozi ka ha na-eduzi mba ndị dị ka Peasia na Gris n’ihe ndị ha na-eme? Jisọs Kraịst, bụ́ Ọkpara Chineke, kwuru hoo haa, sị: ‘Onyeisi nke ụwa enweghị ihe ọ bụla n’ime m.’ Jisọs sịkwara: “Alaeze m esiteghị n’ụwa nke a . . . alaeze m esighị n’ebe a pụta.” (Jọn 14:30; 18:36) Jọn onyeozi kwupụtara na “ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) O doro anya na ọ dịghị mgbe mba ndị dị n’ụwa nọ n’okpuru nduzi ma ọ bụ ọchịchị nke Chineke ma ọ bụ Kraịst, ha anọghịkwa n’okpuru ya ugbu a. Ọ bụ ezie na Jehova kwere ka “ndị na-achị isi” dịrị ma na-achịkwa ihe gọọmenti ụwa na-eme, ọ dịghị ahọpụta ndị mmụọ ozi ya iduzi ha. (Ndị Rom 13:1-7) Ọ bụ nanị “onyeisi nke ụwa” bụ́ Setan Ekwensu pụrụ ido “ndị isi” ma ọ bụ “ndị ọchịchị” ịchị ha. Ha ga-abụrịrị ndị mmụọ ọjọọ na-achị achị kama ịbụ ndị mmụọ ozi na-eche nche. Ya bụrụ otú ahụ, e nwere ndị mmụọ ọjọọ a na-adịghị ahụ anya, ma ọ bụ “ndị isi,” na-eduzi ndị ọchịchị a na-ahụ anya, ibu agha mba na mba na-agụnyekwa ihe karịrị ụmụ mmadụ nkịtị.

[Foto dị na peeji nke nke 199]

[Foto dị na peeji nke nke 207]

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya