Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 6/15 p. 19-24
  • Onye Okike Gị—Mụta Ihe Ọ Dị Ka Ya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Onye Okike Gị—Mụta Ihe Ọ Dị Ka Ya
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọ Na-ekpughe Ihe Ọ Dị Ka Ya
  • Onye Ozizi Ukwu Na-enyere Anyị Aka Ịmara Onye Okike
  • Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nyere Ndị Ọzọ Aka Ịmụta Banyere Ya?
  • Mee Ka Okwukwe Gị Sie Ike na E Nwere Onye Kere Ihe Niile
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
  • Onye Okike Pụrụ Ime Ka Ndụ Gị Nwee Nzube
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Ọ Masịrị Ya Inyere Onye Ọzọ Aka
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Ịmụ Banyere Ihe Ị Na-apụghị Ịhụ Anya
    Obi Ụtọ—Ụzọ E Si Enweta Ya
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 6/15 p. 19-24

Onye Okike Gị—Mụta Ihe Ọ Dị Ka Ya

“Mụ onwe m ga-eme ka ịdị mma m nile gabiga n’ihu gị, M ga-akpọkwa òkù banyere aha Jehova n’ihu gị.”—ỌPỤPỤ 33:19.

1. N’ihi gịnị ka Onye Okike ji kwesị nsọpụrụ?

JỌN onyeozi, bụ́ onye dere akwụkwọ ikpeazụ nke Bible, dekọrọ nkwupụta a sara mbara banyere Onye Okike: “Gị, Onyenwe anyị na Chineke anyị, I kwesịrị ịnara otuto nile na nsọpụrụ nile na ike nile: n’ihi na Gị onwe gị kere ihe nile, ọ bụkwa n’ihi ọchịchọ Gị ka ha dịrị, ka e kekwara ha eke.” (Mkpughe 4:11) Dị ka isiokwu bu ụzọ gosiri, nchọpụta dị iche iche nke sayensị oge a mere na-etinye ihe mgbe mgbe n’ihe mere a ga-eji kwere n’Onye Okike nke ihe nile.

2, 3. (a) Gịnị dị ndị mmadụ mkpa ịmụta banyere Onye Okike? (b) N’ihi gịnị ka izute Onye Okike ihu na ihu ji bụrụ ihe ezi uche na-adịghị na ya?

2 Dị ka ọ dị mkpa ịnakwere na e nwere Onye Okike, ọ dịkwa mkpa ịmụta ihe ọ dị ka ya—na ọ bụ onye dị adị n’ezie, nke nwere àgwà na ụzọ ndị na-adọta ụmụ mmadụ n’ebe ọ nọ. Ruo n’ókè ọ bụla ị pụrụ imewo nke ahụ, ọ̀ bụ na ọ gaghị aba uru ịmara ya nke ọma karị? Nke ahụ achọghị izute ya ihu na ihu, n’ụzọ anyị si ezute mmadụ ndị ọzọ.

3 Jehova bụ Onye Okike nke ọbụna kpakpando, anyanwụ anyị bụ nanị kpakpando nta. Ị̀ ga-eche n’echiche ịnwa imetụ anyanwụ ahụ? Ọ dịghị ma ọlị! Ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ na-akpachapụ anya banyere ọbụna igwuru ya anya ma ọ bụ ikwe ka ụzarị ọkụ ya dị ike chaa akpụkpọ ahụ ha ruo ogologo oge. Ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ ya kasịnụ dị ihe dị ka 15,000,000 degrees Celsius (27,000,000°F.). Kwa sekọnd, ite ọkụ ogbunigwe nuklia nke a na-agbanwe ihe dị ka nde tọn mass anọ iji mepụta ike. Nanị obere akụkụ ya na-erute n’elu ụwa dị ka okpomọkụ na ìhè, ma ọ̀tụ̀tụ̀ ahụ na-eme ka ihe nile dị ndụ n’elu ụwa ebe a dịgide. Eziokwu ndị ahụ bụ́ isi kwesịrị ime ka anyị mata ike dị egwu nke Onye Okike nwere. N’ụzọ dabara adaba Aịsaịa dere banyere ‘ịba ụba nke ike nke Onye Okike, na n’ihi na O nwere ume n’ike.’—Aịsaịa 40:26.

4. Gịnị ka Mosis rịọrọ, oleekwa otú Jehova si meghachi omume?

4 Ma, ị̀ maara na ọnwa ụfọdụ mgbe ụmụ Israel hapụsịrị Ijipt na 1513 T.O.A., Mosis rịọrọ Onye Okike, sị: “Biko, mee ka m hụ ebube Gị.” (Ọpụpụ 33:18) N’icheta na Chineke bụ Onye Okike nke ọbụna anyanwụ, ị pụrụ ịghọta ihe mere o ji gwa Mosis, sị: “Ị pụghị ịhụ ihu m anya: n’ihi na mmadụ agaghị ahụ m anya, dịkwa ndụ.” Onye Okike kwere ka Mosis zoo n’otu ebe n’Ugwu Saịnaị mgbe Ọ “na-agabiga.” Mosis hụziri “azụ” Chineke, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ọ hụrụ ụdị mgbuke a na-enwe mgbe ìhè nke ebube ma ọ bụ ọnụnọ nke Onye Okike gasịrị.—Ọpụpụ 33:20-23; Jọn 1:18.

5. N’ụzọ dị aṅaa ka Onye Okike si mezuo arịrịọ Mosis, na-egosipụta gịnị?

5 Ọchịchọ Mosis nwere ịmara Onye Okike nke ọma karị abụghị nke a na-emezughị. N’ikwu okwu site n’ọnụ otu mmụọ ozi dị ka ihe àmà na-egosi, Chineke gabigara Mosis ma kwupụta, sị: “Jehova, Chineke nke nwere obi ebere, Onye na-eme amara, Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Onye na-aba ụba n’ebere na eziokwu; Onye na-edebere [ọtụtụ puku] ebere, Onye na-agbaghara ajọ omume na njehie na mmehie: ma ọ dịghị ụzọ ọ bụla Ọ ga-agụ ndị ikpe mara na ha bụ ndị ikpe na-amaghị.” (Ọpụpụ 34:6, 7) Nke a na-egosi na ịmara Onye Okike anyị nke ọma karị gụnyere, ọ bụghị ịhụ ọdịdị nkịtị, kama inwe echiche ka zuo ezu nke ihe ọ dị ka ya, àgwà ya na ihe ndị e ji mara ya.

6. Olee otú usoro ahụ anyị ji alụso ọrịa ọgụ si bụrụ ihe dị ebube?

6 Otu ụzọ anyị pụrụ isi mee nke ahụ bụ site n’ịghọta àgwà Chineke site n’ihe ndị o kere. Tụlee usoro ahụ gị ji alụso ọrịa ọgụ. N’otu isiokwu banyere ịlụso ọrịa ọgụ, magazin bụ́ Scientific American kwuru, sị: “Site na mgbe a na-amụbeghị mmadụ ruo ọnwụ ya, usoro ahụ ya ji alụso ọrịa ọgụ na-adị njikere mgbe nile. Ọtụtụ molecule na mkpụrụ ndụ dịgasị iche . . . na-echebe anyị pụọ na nje na pathogen dị iche iche. E wezụga nchebe ndị ahụ, ụmụ mmadụ apụghị ịdị ndụ.” Olee ebe usoro ahụ si bịa? Otu isiokwu dị na magazin ahụ kwuru, sị: “Ọtụtụ mkpụrụ ndụ dị egwu ndị na-emekọrịta ihe nke ọma bụ́ ndị na-alụso nje na nje virus ndị na-awakpo ahụ anyị ọgụ na-esite ná mkpụrụ ndụ ole na ole bụ́ ndị na-emepụta ndị ọzọ apụta, bụ́ ndị na-ebu ụzọ apụta n’ihe dị ka izu itoolu mgbe a tụsịịrị ime.” Nwanyị dị ime na-ebufere nwa o bu n’afọ ụfọdụ ihe ndị na-alụso ọrịa ọgụ. E mesịa, site ná mmiri ara ya, ọ na-enyekwa nwa ọhụrụ ya mkpụrụ ndụ ndị na-alụso ọrịa ọgụ na mmiri ọgwụ ndị ga-abara ya uru.

7. Gịnị ka anyị pụrụ ịtụle banyere usoro ahụ anyị ji alụso ọrịa ọgụ, na-eduga ná nkwubi okwu dị aṅaa?

7 I nwere ezi ihe mere ị ga-eji kwubie na usoro ahụ gị ji alụso ọrịa ọgụ karịrị ihe ọ bụla ọgwụ nke oge a pụrụ inye. N’ihi ya, jụọ onwe gị, ‘Gịnị ka nke a na-egosi banyere Onye Malitere na Onye Nyere ya?’ Usoro a, bụ́ nke “na-ebu ụzọ apụta n’ihe dị ka izu itoolu mgbe a tụsịịrị ime,” bụ́kwa nke dị njikere ichebe nwa a mụrụ ọhụrụ, na-egosipụta amamihe na ichepụ echiche n’ihu n’ezie. Ma ànyị pụrụ ịghọta ihe banyere Onye Okike ọbụna karị site n’usoro a? Gịnị ka ihe ka ọtụtụ n’ime anyị na-ekwubi banyere Albert Schweitzer na ndị ọzọ bụ́ ndị tinyere ndụ ha n’inye ndị ụwa na-atụ n’ọnụ nlekọta ahụ ike? Anyị na-ekwukarị na ndị dị otú ahụ nwere ọmịiko, bụ́ ndị kwalitere ọdịmma ndị mmadụ, nwere àgwà ọma. Ná ntụnyere, gịnị ka anyị pụrụ ikwubi banyere Onye Okike anyị, bụ́ onye na-enye ma ndị bara ọgaranya ma ndị ogbenye usoro ahụ ji alụso ọrịa ọgụ? N’ụzọ doro anya, ọ bụ onye na-ahụ n’anya, na-adịghị ele mmadụ anya n’ihu, onye nwere ọmịiko, na onye na-ekpe ikpe ziri ezi. Nke a ó kwekọghị ná nkọwa ahụ Mosis nụrụ banyere Onye Okike?

Ọ Na-ekpughe Ihe Ọ Dị Ka Ya

8. N’ụzọ dị aṅaa pụrụ iche ka Jehova si ekpughere anyị onwe ya?

8 Otú ọ dị, e nwere ụzọ ọzọ isi mara Onye Okike anyị nke ọma karị—site na Bible. Nke a dị mkpa karịsịa n’ihi na e nwere ihe ndị sayensị na eluigwe na ala na-apụghị ikpughe banyere ya ma ọlị, nakwa ihe ndị ọzọ bụ́ ndị doro anya karị n’ime Bible. Otu ihe atụ banyere ihe ndị eluigwe na ala na-apụghị ikpughe bụ aha aka Onye Okike. Nanị Bible na-ekpughe ma aha Onye Okike ma ihe ọ pụtara. N’ihe odide Hibru nke Bible, aha ya pụtara ihe dị ka ugboro 7,000 dị ka mgbochiume anọ bụ́ ndị a pụrụ idegharị n’asụsụ ọzọ ịbụ YHWH ma ọ bụ JHVH, bụ́ nke a na-akpọkarị Jehova n’asụsụ Igbo.—Ọpụpụ 3:15; 6:3.

9. Gịnị ka aha aka Onye Okike pụtara, gịnịkwa ka anyị pụrụ ikwubi site na nke a?

9 Iji mara Onye Okike nke ọma karị, ọ dị anyị mkpa ịghọta na ọ bụghị nanị “Ihe Mbụ Kpatara Ihe” nke a na-adịghị aghọta aghọta ma ọ bụ “Abụ M” dị mgbagwoju anya. Aha aka ya na-egosi nke ahụ. Ọ bụ otu ụdị ngwaa Hibru nke pụtara “ghọọ” ma ọ bụ “dịrị.”a (Tụlee Jenesis 27:29; Eklisiastis 11:3, NW.) Aha Chineke pụtara “Ọ Na-eme Ka Ọ Ghọọ,” ọ na-emesikwa ya ike na ọ na-ezube ezube, na-emekwa eme. Site n’ịmara na iji aha ya na-eme ihe, anyị pụrụ ịghọta n’ụzọ ka mma na ọ na-emezu nkwa ya, na-emezukwa nzube ya n’ụzọ dị irè.

10. Nghọta dị aṅaa dị mkpa ka anyị pụrụ inweta site n’ihe ndekọ Jenesis?

10 Bible bụ isi iyi nke ihe ọmụma banyere nzube na àgwà Chineke. Ihe ndekọ Jenesis na-ekpughe na n’otu oge ihe a kpọrọ mmadụ na Chineke dịịrị n’udo, mmadụ nweekwa atụmanya nke ogologo ndụ nwere nzube. (Jenesis 1:28; 2:7-9) N’ikwekọ n’ihe aha ya pụtara, anyị pụrụ ijide n’aka na Jehova ga-akwụsị nhụjuanya na obi nkoropụ nke ụmụ mmadụ nweworo eri oge. Anyị na-agụ banyere mmezu nke nzube ya: “E mere ka elu ala nkịtị bụrụ nke obi nkoropụ, ọ bụghị site n’ọchịchọ nke aka ya, kama site n’ọchịchọ nke Onye Okike, bụ́ onye n’ime ya ka ọ dị otú ahụ, nyere ya olileanya na n’otu ụbọchị ọ pụrụ ịbụ . . . nke e mere ka o kere òkè ná nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke.”—Ndị Rom 8:20, 21, The New Testament Letters, nke J. W. C. Wand dere.

11. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji tụlee akụkọ Bible dị iche iche, gịnị bụ akụkọ zuru ezu nke otu n’ime ha?

11 Bible pụkwara inyere anyị aka ịmara Onye Okike anyị nke ọma karị n’ihi na ọ na-ekpughe omume na mmeghachi omume ya mgbe ọ na-emeso Israel oge ochie ihe. Tụlee otu ihe atụ nke metụtara Elaịsha na Neaman, bụ́ onyeisi usuu ndị agha nke Siria na-ebu iro. Ka ị na-agụ ihe ndekọ a ná 2 Ndị Eze isi nke 5, ị ga-ahụ na nwa agbọghọ Israel a dọọrọ n’agha kwupụtara na site n’enyemaka nke Elaịsha nọ n’Israel na a pụrụ ịgwọ ekpenta Neaman. Neaman gara n’ebe ahụ, na-atụ anya ka Elaịsha fegharịa aka ya n’ụzọ ememe ọgwụgwọ ime mmụọ. Kama nke ahụ, Elaịsha gwara onye Siria ahụ ka ọ saa ahụ n’Osimiri Jọdan. Ọ bụ ezie na ndị nọ n’okpuru Neaman mere ka o kwenye ime otú ahụ, mgbe o mere otú ahụ, a gwọrọ ya. Neaman wepụtara onyinye ndị dị oké ọnụ, bụ́ ndị Elaịsha jụrụ ịnara. Mgbe e mesịrị, onye na-ejere ya ozi mịpụrụ gakwuru Neaman ma nata ụfọdụ ihe onwunwe site n’ịgha ụgha. Akwụwaghị aka ọtọ ya dugara na ya ịbụ onye e tiri ekpenta. Nke a bụ ihe ndekọ na-adọrọ adọrọ nke na-egosipụta àgwà ụmụ mmadụ—nke anyị pụrụ ịmụta ihe site na ya.

12. Gịnị ka anyị pụrụ ikwubi banyere Onye Okike site n’akụkọ banyere Elaịsha na Neaman?

12 Ihe ndekọ ahụ ji ụzọ na-adọrọ mmasị na-egosi na ịdị elu nke Onye Okike Ukwu nke eluigwe na ala emeghị ka ọ ghara iji ihu ọma rịba nwa agbọghọ nta ama, bụ́ nke dị nnọọ iche n’ihe a na-ahụkarị taa n’ọtụtụ ọdịbendị. Ọ na-egosikwa na Onye Okike adịghị emenyere nanị otu agbụrụ ma ọ bụ mba. (Ọrụ 10:34, 35) Ọ dị mma ịmara na kama ịtụ anya ka ndị mmadụ jiri aghụghọ mee ihe—nke ụfọdụ “ndị na-agwọ ọrịa” nke oge gara aga na nke oge a na-emekarị—Onye Okike gosipụtara amamihe dị egwu. Ọ maara otú e si agwọ ekpenta. O gosipụtakwara nghọta na ikpe ziri ezi site n’ekweghị ka wayo gaa nke ọma. Ọzọkwa, ọ̀ bụ na nke ahụ ekwekọghị n’àgwà Jehova nke Mosis nụrụ banyere ya? Ọ bụ ezie na ihe ndekọ Bible ahụ dị mkpirikpi, lee ihe dị nnọọ ukwuu anyị pụrụ ịhụta site na ya banyere ihe Onye Okike anyị dị ka ya!—Abụ Ọma 33:5; 37:28.

13. Nye ihe atụ otú anyị pụrụ isi mụta ihe ndị bara uru site n’akụkọ dị iche iche nke Bible.

13 Ihe ndekọ ndị ọzọ banyere omume enweghị ekele nke Israel na mmeghachi omume nke Chineke na-egosi na Jehova na-echebara mmadụ echiche n’ezie. Bible na-ekwu na ndị Israel nwara ya ugboro ugboro, na-eme ka o nwee mwute na ihe mgbu. (Abụ Ọma 78:40, 41) Ya mere, Onye Okike nwere mmetụta, ọ na-elebakwa anya n’ihe ụmụ mmadụ na-eme. E nwekwara ọtụtụ ihe a ga-amụta site n’akụkọ banyere ndị mmadụ a maara nke ọma. Mgbe a họọrọ Devid ịbụ eze Israel, Chineke gwara Samuel, sị: “Mmadụ na-ele ihe anya na-ahụ, ma Jehova na-ele obi.” (1 Samuel 16:7) Ee, Onye Okike na-ele ihe anyị bụ n’ime, ọ bụghị ọdịdị elu ahụ nkịtị. Lee ihe na-enye afọ ojuju nke a bụ!

14. Ka anyị na-agụ Akwụkwọ Nsọ Hibru, olee ihe bara uru anyị pụrụ ime?

14 E dere 39 n’ime akwụkwọ nile nke Bible tupu oge Jisọs, o kwesịkwara ekwesị ka anyị gụọ ha. Nke a ekwesịghị ịbụ nanị iji mata ihe ndekọ ma ọ bụ akụkọ ihe mere eme nke Bible. Ọ bụrụ na anyị chọrọ n’ezie ịmụta ihe Onye Okike anyị dị ka ya, anyị kwesịrị ịtụgharị uche n’ihe ndekọ ndị ahụ, ikekwe na-eche, sị, ‘Gịnị ka ihe omume a na-ekpughe banyere àgwà ya? Olee àgwà ya nke pụtara ìhè n’ebe a?’b Ime otú ahụ ga-enyere ọbụna ndị nwere obi abụọ aka ịhụ na ọ ghaghị ịbụ na Bible sitere n’aka Chineke, si otú a na-enye ihe ndabere mere ha ga-eji mara Onye Chepụtara ya nke na-ahụ n’anya nke ọma karị.

Onye Ozizi Ukwu Na-enyere Anyị Aka Ịmara Onye Okike

15. N’ihi gịnị ka ihe ndị Jisọs mere na ihe ndị o ziri kwesịrị iji bụrụ ihe na-akụzi ihe?

15 N’eziokwu, ndị na-enwe obi abụọ banyere ịdị adị nke Onye Okike ma ọ bụ ndị echiche ha banyere Chineke na-edoghị anya pụrụ inwe ihe ọmụma dị nta banyere Bible. Ikekwe i zutewo ndị na-apụghị ikwu ma Mosis ọ̀ dịrị ndụ tupu a mụọ Matiu ka ọ̀ bụ mgbe ọ nwụsịrị, ndị ọ fọkwara nke nta ka ọ bụrụ na ọ dịghị ihe ọ bụla ha maara banyere ihe ndị Jisọs mere ma ọ bụ ihe ndị ọ kụziri. Nke ahụ dị mwute karịsịa n’ihi na mmadụ pụrụ ịmụta ihe dị ukwuu banyere Onye Okike site n’aka Onye Ozizi Ukwu ahụ, bụ́ Jisọs. Ebe ya na Chineke nweworo mmekọrịta chiri anya, ọ pụrụ ikpughe ihe Onye Okike anyị dị ka ya. (Jọn 1:18; 2 Ndị Kọrint 4:6; Ndị Hibru 1:3) O mekwara otú ahụ. N’ezie, o kwuru n’otu oge, sị: “Onye hụworo m anya ahụwo Nna m anya.”—Jọn 14:9.

16. Gịnị ka nkwurịta okwu Jisọs so nwanyị Sameria nwee na-egosi?

16 Tụlee ihe atụ a. N’otu oge, mgbe ike gwụrụ Jisọs site n’ime njem, o sooro nwanyị Sameria kwurịta okwu na nso Saịka. Ọ gwara ya eziokwu ndị gbara ọkpụrụkpụ, na-adabere ná mkpa ọ dị “ịkpọ isiala nye Nna [ya] n’ime mmụọ na eziokwu.” Ndị Juu nke oge ahụ na-ezere ndị Sameria. N’ụzọ dị iche, Jisọs gosipụtara ịdị njikere nke Jehova ịnabata ndị ikom na ndị inyom nke mba nile bụ́ ndị nwere obi eziokwu, ọbụna dị ka anyị hụrụ site n’ihe ahụ mere n’etiti Elaịsha na Neaman. O kwesịrị imesi anyị obi ike na Jehova adịghị akwado ibu iro okpukpe nke ekweghị ibe nọrọ bụ́ nke na-agbasa n’ụwa taa. Anyị pụkwara ịrịba eziokwu bụ́ na Jisọs dị njikere izi nwanyị ihe, ama, n’oge a kwa ọ bụ nwanyị nke ya na nwoke na-abụghị di ya bi. Kama ịma ya ikpe, Jisọs mesoro ya ihe n’ụzọ dị ùgwù, n’ụzọ pụrụ inyere ya aka n’ezie. Mgbe nke ahụ gasịrị, ndị Sameria ndị ọzọ gere Jisọs ntị ma kwubie, sị: “[Anyị maara] na Onye a bụ Onye nzọpụta nke ụwa n’ezie.”—Jọn 4:2-30, 39-42; 1 Ndị Eze 8:41-43; Matiu 9:10-13.

17. Nkwubi okwu dị aṅaa ka akụkọ banyere mbilite n’ọnwụ Lazarọs na-eduga na ya?

17 Ka anyị tụlee ihe atụ ọzọ banyere otú anyị pụrụ isi mụta banyere Onye Okike site n’ịmata ihe ndị Jisọs mere na ihe ndị ọ kụziri nke ọma. Tụgharịa uche n’oge enyi Jisọs bụ́ Lazarọs nwụrụ. Jisọs egosipụtawo na mbụ na ya nwere ike ịkpọghachi ndị nwụrụ anwụ ná ndụ. (Luk 7:11-17; 8:40-56) Ma, olee otú o si meghachi omume mgbe ọ hụrụ nwanne nwanyị Lazarọs bụ́ Meri ka ọ na-eru újú? Jisọs ‘sụrụ udè n’ime mmụọ Ya, meekwa ka obi lọọ Ya mmiri.’ O gosighị enweghị mmasị ma ọ bụ omume nke onye ọ na-agbasaghị; “anya mmiri pụrụ [ya] n’anya.” (Jọn 11:33-35) Nke a abụghịkwa ngosipụta nkịtị nke mmetụta uche. A kwaliri Jisọs ime ihe ziri ezi—ọ kpọlitere Lazarọs n’ọnwụ. Ị pụrụ iche n’echiche otú nke a si nyere ndị ozi aka ịghọta mmetụta na omume nke Onye Okike. O kwesịkwara inyere anyị na ndị ọzọ aka ịghọta àgwà na ụzọ nile nke Onye Okike.

18. Olee mmetụta ndị mmadụ kwesịrị inwe banyere ịmụ Bible?

18 E nweghị ihe mere ị ga-eji na-eme ihere ịmụ Bible na ịmụtakwu ihe banyere Onye Okike anyị. Bible abụghị akwụkwọ oge ya gabigaworo. Otu onye mụrụ ya ma ghọọ ezi enyi Jisọs bụ Jọn. O mesịrị dee, sị: “Anyị matara na Ọkpara Chineke abịawo, nyekwa anyị uche, ka anyị wee mara Onye eziokwu ahụ, anyị nọkwa n’ime Onye eziokwu ahụ, n’ime Ọkpara Ya, bụ́ Jisọs Kraịst. Nke a bụ ezi Chineke, na ndụ ebighị ebi.” (1 Jọn 5:20) Mata na itinye “uche” iji nweta ihe ọmụma banyere “Onye eziokwu ahụ,” bụ́ Onye Okike, pụrụ iduga ná “ndụ ebighị ebi.”

Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nyere Ndị Ọzọ Aka Ịmụta Banyere Ya?

19. Nzọụkwụ dị aṅaa ka e werewooro iji nyere ndị nwere obi abụọ aka?

19 A chọrọ ọtụtụ ihe iji mee ka ụfọdụ mmadụ kwenye na e nwere Onye Okike nwere ọmịiko bụ́ onye na-eche banyere anyị nakwa iji ghọta ihe ọ dị ka ya. E nwere nde kwuru nde mmadụ bụ́ ndị ka nwere obi abụọ banyere Onye Okike ma ọ bụ ndị echiche ha nwere banyere ya na-adịghị ekwekọ n’ihe a na-achọta na Bible. Olee otú ị pụrụ isi nyere ha aka? Ná mgbakọ distrikti na nke mba nile nke Ndịàmà Jehova nke 1998/1999, e wepụtara ngwá ọrụ ọhụrụ dị irè n’ọtụtụ asụsụ—akwụkwọ bụ́ Is There a Creator Who Cares About You?

20, 21. (a) Olee otú a pụrụ isi jiri akwụkwọ Creator mee ihe n’ụzọ gara nke ọma? (b) Kọọ ahụmahụ ndị na-egosi otú akwụkwọ Creator siworo bụrụ nke dịwororịị irè.

20 Ọ bụ mbipụta nke ga-akwalite okwukwe gị n’ebe Onye Okike anyị nọ na nghọta gị banyere àgwà na ụzọ ya nile. N’ihi gịnị ka nke a ji bụrụ ihe e ji n’aka? N’ihi na e mewo akwụkwọ a bụ́ Is There a Creator Who Cares About You? n’ụzọ pụrụ iche na-eburu ihe mgbaru ọsọ ndị dị otú ahụ n’uche. Isiokwu bụ́ isi n’akwụkwọ ahụ bụ “Gịnị pụrụ ime ka ndụ gị nwekwuo nzube?” E dere ihe dị na ya n’ụzọ nke na ọbụna ndị gụrụ akwụkwọ ga-ahụ ya dị ka ihe na-akpali mmasị. Ma, ọ na-ekwu banyere ọchịchọ ndị anyị nile na-enwe. E nwere ihe ndị na-adọrọ mmasị na ndị na-eme ka e kwenye nye ndị ga-agụ ya bụ́ ndị na-enwe obi abụọ banyere ịdị adị nke Onye Okike. Akwụkwọ ahụ adịghị ewere ya na onye na-agụ ya kwenyere n’Onye Okike. Ụzọ e si kọwaa nchọpụta na echiche dị iche iche na-adịbeghị anya nke sayensị ga-adọrọ mmasị nke ndị na-enwe obi abụọ. Ọbụna eziokwu ndị dị otú ahụ ga-eme ka okwukwe ndị kwere na Chineke sikwuo ike.

21 Ka a na-amụ akwụkwọ ọhụrụ a, a ga-ahụ na akụkụ ya ụfọdụ na-enye ntụle dị mkpirikpi nke akụkọ ihe mere eme nke Bible n’ụzọ na-eme ka akụkụ nile nke àgwà Chineke pụta ìhè, na-enyere ndị na-agụ ya aka ịmara Chineke nke ọma karị. Ọtụtụ ndị gụworo ya ekwuwo otú nke ahụ si bụrụ eziokwu nye ha. (Lee isiokwu na-esonụ, peji nke 25-26.) Ka nke ahụ dịkwa otú ahụ n’ebe ị nọ ka ị na-amara akwụkwọ ahụ nke ọma ma jiri ya na-eme ihe inyere ndị ọzọ aka ịmara Onye Okike ha nke ọma karị.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Ọka mmụta bụ́ onye Jesuit, bụ́ M. J. Gruenthaner, n’oge ọ bụ onyeisi edemede nke The Catholic Biblical Quarterly, kwuru banyere ngwaa nke a otu ihe ahụ o kwuru banyere ngwaa ndị yiri ya, na ọ “dịghị mgbe ọ bụla ọ na-enye echiche nke ịdị adị n’ụzọ a na-adịghị aghọta aghọta kama ọ na-egosipụta mgbe nile ịbụ ma ọ bụ ịghọ ihe a pụrụ ịghọta, ya bụ, na-egosipụta onwe ya n’ụzọ doro anya.”

b Ka ndị mụrụ ụmụ na-akọrọ ụmụ ha akụkọ Bible dị iche iche, ha pụrụ inyere ụmụ ha aka site n’ịjụ ajụjụ ndị dị otú ahụ. N’ụzọ dị otú a, ndị ntorobịa pụrụ ịmara Chineke nke ọma, mụtakwa ịtụgharị uche n’Okwu ya.

Ị̀ Rịbara Ama?

◻ Olee otú Mosis si mara Jehova nke ọma karị n’Ugwu Saịnaị?

◻ N’ihi gịnị ka ịmụ Bible ji bụrụ ihe na-enye aka n’ịmara ihe Chineke dị ka ya?

◻ Ka anyị na-agụ Bible, gịnị ka anyị pụrụ ime iji bịaruo Onye Okike anyị nso karị?

◻ Olee ụzọ i si eme atụmatụ iji akwụkwọ Creator mee ihe?

[Foto dị na peeji nke 20]

Gịnị ka usoro ahụ anyị ji alụso ọrịa ọgụ na-enye echiche ya banyere Onye Okike?

[Foto dị na peeji nke 21]

Otu akụkụ nke Akwụkwọ Mpịakọta nke Osimiri Nwụrụ Anwụ, bụ́ nke e mere ka Tetragrammaton (aha Chineke n’asụsụ Hibru) pụta ìhè na ya

[Ebe E Si Nweta Foto]

Site n’ikike nke Shrine of the Book, Israel Museum, Jerusalem

[Foto dị na peeji nke 23]

Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ụzọ Jisọs si meghachi omume n’iru újú Meri?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya