Olee Ụzọ Jisọs Kraịst Si Bụrụ Onye Amụma Dị Ka Mosis?
JEHOVA CHINEKE adịghị ekwu okwu ụgha. (Taịtọs 1:2; Ndị Hibru 6:18) N’ihi ya, amụma nile nke Okwu ya, bụ́ Bible, bụ ihe a pụrụ ịdabere na ha, bụrụkwa eziokwu. Ha bụ ihe e ji n’aka na ha ga-emezu.
Otu n’ime amụma ndị sitere n’ike mmụọ Chineke bụ nke onye amụma ahụ bụ onye Hibru, bụ́ Mosis, dekọrọ banyere Mesaịa ahụ. N’ihota ihe Jehova kwuru, Mosis kwuru, sị: “M ga-eme ka onye amụma, nke dị ka gị [Mosis], bilitere ha [ụmụ Israel] site n’etiti ụmụnne ha; m ga-etinyekwa okwu m nile n’ọnụ ya, ọ ga-agwakwa ha okwu nile nke m ga-enye ya n’iwu.”—Deuterọnọmi 18:17, 18.
Pita onyeozi ji amụma nke a mee ihe banyere Jisọs Kraịst mgbe o dere, sị: “Mosis kwuru n’ezie, sị, Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] Chineke ga-eme ka onye amụma, nke dị ka mụ onwe m, biliere unu site n’etiti ụmụnne unu; onye ahụ ka unu ga-ege ntị n’ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke ọ ga-agwa unu.” (Ọrụ 3:22) N’eziokwu, Jisọs n’onwe ya kwuru, sị: “Ọ bụrụ na unu kwere Mosis, unu ga-ekwe m; n’ihi na ya onwe ya dere ihe banyere m n’akwụkwọ.” (Jọn 5:46) N’ụzọ dịgasị aṅaa ka Jisọs si dị ka Mosis?
Ha Yiritara ná Mmalite nke Ndụ Ha
Ma Mosis ma Jisọs gbanarịchara ogbugbu nke ụmụntakịrị bụ nwoke. E zopụrụ nwa ọhụrụ ahụ bụ Mosis n’etiti ahịhịa mmiri nke dị n’ụsọ Osimiri Naịl, o wee si otú a gbanarị ogbugbu nke ụmụntakịrị nwoke nile bụ ndị Israel dị ka Fero nke Ijipt nyere iwu ka e mee. Mgbe ọ bụ nwata, Jisọs gbanarịkwara ogbugbu nke ụmụntakịrị nwoke ndị gbara site n’afọ abụọ gbadaa na Betlehem na ógbè ndị dị ya gburugburu. Onye nyere iwu mgbukpọ nke a bụ Eze Herọd Onye Ukwu, onye, dị ka Fero, bụ onye iro nke Chineke na ndị Ya.—Ọpụpụ 1:22–2:10; Matiu 2:13-18.
Ma Mosis ma Jisọs gosipụtara mmụọ dị nwayọọ, dịkwa umeala n’obi. Ọ bụ ezie na a zụlitere ya dị ka nwa nwoke n’ezinụlọ nke eze dị ike nke Ijipt, Mosis mesịrị bụrụ onye “dị umeala n’obi nke ukwuu, karịa mmadụ nile ndị nọ n’elu ala.” (Ọnụ Ọgụgụ 12:3) N’iji tụnyere nke ahụ, Jisọs ejewo ozi dị ka onye isi ahụ dị ike bụ Maịkael n’eluigwe ma jiri obi dị umeala bịa n’ụwa. (Daniel 10:13; Ndị Filipaị 2:5-8) Ọzọkwa, Jisọs nwere ọmịiko maka ndi mmadụ, nweekwa ike ikwu, sị: “Nyaranụ yoke nke m n’olu unu, mụtakwanụ ihe n’ọnụ m; n’ihi na abụ m onye nwayọọ na onye wedatara onwe ya ala n’obi: unu ga-ahụkwa izu ike nye mkpụrụ obi unu.”—Matiu 11:29; 14:14.
N’ihi ije ozi Jehova, ma Mosis ma Jisọs gbakụtachara ọnọdụ dị elu na oké akụ azụ. Iji jeere Jehova na ndị Ya ozi, Mosis hapụrụ akụ na ụba na ọnọdụ dị ùgwù n’Ijipt. (Ndị Hibru 11:24-26) N’ụzọ yiri nke ahụ, Jisọs hapụrụ ọnọdụ ihe ùgwù dị elu na akụ n’eluigwe ka o wee jeere Chineke na ndị Ya ozi n’elu ala.—2 Ndị Kọrint 8:9.
Mosis na Jisọs ghọchara ndị Chineke e tere mmanụ. Onye amụma ahụ bụ Mosis jere ozi dị ka onye Jehova e tere mmanụ nye mba Israel. Dị ka Pọl onyeozi kwuru, Mosis “gụrụ ịta ụta nke [ịbụ] Kraịst anyị [onye e tere mmanụ] n’akụ dịkarịrị akụ nile nke Ijipt ukwuu.” (Ndị Hibru 11:26; Ọpụpụ 3:1–4:17) Olee mgbe Jisọs ghọrọ Kraịst ahụ, ma ọ bụ Onye e tere mmanụ? Nke a weere ọnọdụ mgbe e ji mmụọ nsọ Chineke, ma ọ bụ ike ọrụ ya, tee ya mmanụ, mgbe e mesịrị ya baptism. N’ihu nwanyị onye Sameria ahụ n’olulu mmiri Jekọb nke dị na Saịka nakwa n’ihu onye isi nchụaja Israel mgbe a na-ekpe ya ikpe, Jisọs gbara àmà na ya bụ Mesaịa ahụ, ma ọ bụ Kraịst.—Mak 14:61, 62; Jọn 4:25, 26.
Ma Mosis ma Jisọs buru ọnụ ruo 40 ụbọchị. Ná mmalite nke ije ozi ya dị ka ọnụ na-ekwuru Chineke, Mosis buru ọnụ ruo 40 ụbọchị mgbe ọ nọ n’ugwu Saịnaị. (Ọpụpụ 34:28) Jisọs buru ọnụ ruo 40 ụbọchị n’ọzara, wee mesịa guzogide ọnwụnwa Setan ná mmalite nke ije ozi ya dị ka Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa.—Matiu 4:1-11.
Ndị Ikom Abụọ Ahụ Nyechara Jehova Otuto
Jehova jiri ma Mosis ma Jisọs mee ihe ibuli aha nsọ Ya elu. Chineke gwara Mosis ka o jekwuru ụmụ Israel n’aha ‘Jehova, bụ Chineke nke nna ha hà.’ (Ọpụpụ 3:13-16) Mosis nọchitere anya Chineke n’ihu Fero, bụ́ onye e debere ndụ ka e wee gosipụta ike Jehova, kwusaakwa aha Ya n’elu ala dum. (Ọpụpụ 9:16) N’otu aka ahụ, Jisọs bịara n’aha Jehova. Dị ka ihe atụ, Kraịst kwuru, sị: “Mụ onwe m abịawo n’aha Nna m, ma unu anaraghị m.” (Jọn 5:43) Jisọs nyere Nna ya otuto, mee ka aha Jehova pụta ìhè n’ihu ndị ahụ Chineke nyeworo ya, meekwa ka a mara ya nke ọma n’elu ala.—Jọn 17:4, 6, 26.
Site n’ike Chineke, Mosis na Jisọs rụchara ọrụ ebube ndị wetaara Chineke otuto. Mosis rụrụ ọrụ ebube iji gosipụta na ọ bụ Jehova Chineke zitere ya. (Ọpụpụ 4:1-31) N’oge ije ozi ya dum, Mosis, bụ́ onye Chineke jiri mee ihe ikewa Osimiri Uhie ahụ, nọgidere na-arụ ọrụ ebube ndị wetaara Jehova otuto. (Ọpụpụ 5:1–12:36; 14:21-31; 16:11-18; 17:5-7; Abụ Ọma 78:12-54) N’otu aka ahụ, Jisọs wetaara Chineke otuto site n’ịrụ ọtụtụ ọrụ ebube. Nke a dị otú a n’ụzọ dị ukwuu nke na Jisọs pụrụ ikwu, sị: “Kwerenụ m na mụ onwe m nọ n’ime Nna m, Nna m nọkwa n’ime m: ma ọ bụghị, kwerenụ m n’ihi ọrụ m onwe ha.” (Jọn 14:11) Otu n’ime ọrụ ebube ndị ọ rụrụ bụ ime ka oké ifufe na-efesi ike kwụsị, ka Osimiri Galili wee dajụọ.—Mak 4:35-41; Luk 7:18-23.
Myirịta Ndị Ọzọ Dị Mkpa
E jikọrọ ma Mosis ma Jisọs na inye nri n’ụzọ ọrụ ebube. Mosis bụ onye amụma Jehova mgbe e ji ụzọ ọrụ ebube nye ụmụ Israel nri. (Ọpụpụ 16:11-36) N’ụzọ yiri nke ahụ, n’oge abụọ dị iche iche e mere ihe ndekọ ha na Bible, Jisọs ji ụzọ ọrụ ebube nye ìgwè mmadụ dị iche iche nri anụ ahụ.—Matiu 14:14-21; 15:32-38.
E jikọtara manna nke si n’eluigwe na ije ozi nke ma Mosis ma Jisọs. Mosis nọ na-edu ụmụ Israel mgbe e nyere ha manna nke si n’eluigwe, dị ka a pụrụ ikwu ya. (Ọpụpụ 16:11-27; Ọnụ Ọgụgụ 11:4-9; Abụ Ọma 78:25) Dị ka ihe a pụrụ iji tụnyere nke ahụ ma bụrụ nke dị mkpa nke ukwuu, Jisọs nyere anụ ahụ nke onwe ya dị ka manna nke si n’eluigwe maka ndụ nke ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi.—Jọn 6:48-51.
Ma Mosis ma Jisọs dupụtara ụmụ mmadụ site n’agbụ banye ná nnwere onwe. Chineke jiri Mosis mee ihe iduru ụmụ Israel pụọ n’agbụ nke ndị Ijipt wee baa ná nnwere onwe dị ka ndị Ya. (Ọpụpụ 12:37-42) N’otu aka ahụ, Jisọs Kraịst anọwo na-edu ndị na-eso ụzọ ya banye ná nnwere onwe. Kraịst ka ga-eduru ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi banye ná nnwere onwe pụọ n’agbụ nke nzukọ Setan bụ Ekwensu, pụọkwa ná mmehie na ọnwụ.—1 Ndị Kọrint 15:24-26; Ndị Kọlọsi 1:13; 1 Jọn 5:19.
Ma Mosis ma Jisọs bụcha ndị ogbugbo nke ọgbụgba ndụ. Mosis bụ onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ Iwu ahụ n’etiti Jehova Chineke na ụmụ Israel. (Ọpụpụ 19:3-9) Jisọs bụ Onye Ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ n’etiti Chineke na Israel ime mmụọ.—Jeremaịa 31:31-34; Luk 22:20; Ndị Hibru 8:6-13.
E nyere ma Mosis ma Jisọs ike ikpe ikpe. Mosis jere ozi dị ka onye ikpe na onye na-enye iwu nye Israel nke anụ ahụ. (Ọpụpụ 18:13; Malakaị 4:4) Jisọs na-eje ozi dị ka Onye ikpe, o nyewokwa “Israel nke Chineke” iwu ya nile. (Ndị Galetia 6:16; Jọn 15:10) Kraịst n’onwe ya kwuru, sị: “Nna m adịghị ekpekwa mmadụ ọ bụla ikpe, kama o werewo ikpe nile nye Ọkpara ya; ka mmadụ nile wee sọpụrụ Ọkpara ahụ, dị ka ha na-asọpụrụ Nna ya. Onye na-adịghị asọpụrụ Ọkpara adịghị asọpụrụ Nna nke zitere ya.”—Jọn 5:22, 23.
E ji ntụkwasị obi nye ma Mosis ma Jisọs ọnọdụ nke ịbụ isi n’ụlọ Chineke. Mosis kwesịrị ntụkwasị obi dị ka onye bụ isi n’ụlọ Chineke n’Israel oge ochie. (Ọnụ Ọgụgụ 12:7) N’ụzọ a pụrụ iji tụnyere nke ahụ, e mere ka Jisọs bụrụ Isi nke ụlọ ime mmụọ nke Jehova nke ụmụ ya ndị ikom, o gosipụtawokwa onwe ya ịbụ onye kwesịrị ntụkwasị obi n’ọnọdụ ahụ. N’eziokwu, Jisọs “bụ onye kwesịrị ntụkwasị obi n’ebe Onye ahụ nọ, bụ́ onye mere ya ka ọ bụrụ onyeozi na onye isi nchụaja, dị ka Mosis dịkwa n’ezinụlọ ya dum. N’ihi na a gụwo onye a n’onye kwesịrị otuto karị Mosis, n’ụzọ ha otú ahụ onye rụrụ ezinụlọ nwere nsọpụrụ karịa ezinụlọ ya. . . . Mosis kwesịrị ntụkwasị obi n’ezinụlọ ya dum dị ka onye na-eje ozi, ka ọ bụrụ ihe àmà nke ihe nile a gaje ikwu; ma Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi dị ka Ọkpara, nke bụ onye isi n’ezinụlọ ya; onye anyị onwe anyị bụ ezinụlọ ya, ma ọ bụrụ na anyị ejidesie nkwuwa okwu anyị na ịnya isi nke olileanya anyị ike ruo ọgwụgwụ ihe nile.”—Ndị Hibru 3:2-6.
Ọbụna n’ihe banyere ọnwụ ha, Mosis na Jisọs yirịtara. Ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa? Ee, Jehova bupụrụ ozu Mosis wee si otú a gbochie ụmụ mmadụ imerụ ya ma ọ bụ iji ya mere ihe ofufe. (Deuterọnọmi 34:5, 6; Jud 9) N’otu aka ahụ, Chineke bupụrụ ahụ Jisọs, ghara ikwe ka ọ hụ ire ure, wee sikwa otú a gbochie ya ịghọ nkume mkpọbi ụkwụ nye okwukwe.—Abụ Ọma 16:10; Ọrụ 2:29-31; 1 Ndị Kọrint 15:50.
Gee Ntị n’Amụma
Ndị a bụ ụfọdụ n’ime ụzọ ndị Jisọs Kraịst si gosipụta onwe ya ịbụ onye amụma dị ka Mosis. Lee nnọọ ụzọ dị ebube okwu Chineke gwara Mosis banyere ọbịbịa nke onye amụma ahụ si mezuo!
E nweghị ihe ịrụ ụka ọ bụla na Jehova mezuru nkwa amụma ya iwelite onye amụma dị ka Mosis. E mezuru okwu ahụ dị na Deuterọnọmi 18:18 ná ndụ na ahụmahụ nile nke Jisọs Kraịst. Mmezu dị otú ahụ na-enyekwa anyị ihe mere anyị ga-eji nwee obi ike n’akụkụ ndị ọzọ dị n’amụma nke Okwu Chineke. N’ihi ya, ka anyị nọgide na-ege ntị n’amụma Bible.