-
Ọ Kpara Àgwà Onye Nwere Ezi UcheṄomie Okwukwe Ha
-
-
10 Olee otú ndị agha Devid si mesoo ndị na-azụrụ Nebal atụrụ? Ọ gaara adịrị ha mfe ịkpụrụ atụrụ ha gbuo mgbe ọ bụla ha chọrọ, ma ha emeghị otú ahụ. Kama nke ahụ, ha chebere ìgwè atụrụ Nebal na ndị na-ejere ya ozi. (Gụọ 1 Samuel 25:15, 16.) Ndị ọzụzụ atụrụ na atụrụ ha na-enwe ọtụtụ nsogbu n’ọhịa. Anụ ndị na-eri ibe ha jukwara eju n’ọhịa. Ebe ahụ dịkwa nso n’ebe ala Izrel jedebere n’ebe ndịda. N’ihi ya, ndị ohi na-esikarị ná mba ọzọ abịa ezu ohi ma na-emesi ndị ọzụzụ atụrụ ike n’ebe ahụ.b
-
-
Ọ Kpara Àgwà Onye Nwere Ezi UcheṄomie Okwukwe Ha
-
-
b Ọ ga-abụ na Devid weere ya na ichebe ndị obodo ahụ na atụrụ ha bụ ịrụrụ Jehova Chineke ọrụ. N’oge ahụ, Jehova chọrọ ka ụmụ ụmụ Ebreham, Aịzik, na Jekọb biri n’ala ahụ. N’ihi ya, ichebe ha ka ndị ohi si mba ọzọ ghara imesi ha ike bụ ozi dị nsọ.
-