-
Ọ Gwara Chineke Obi Ya n’EkpereṄomie Okwukwe Ha
-
-
9. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’otú Hana si kpebie ịga Shaịlo n’agbanyeghị na ọ ma otú nwunye di ya ga-esi kpaso ya àgwà?
9 N’isi ụtụtụ, ndị ezinụlọ Elkena nọ na-agbakeri ala. Mmadụ niile nọ na-akwado maka njem ahụ, ma ụmụaka. Ezinụlọ a ga-aga ihe ruru kilomita iri atọ n’ógbè Ifrem bụ́ ugwu ugwu tupu ha eruo Shaịlo.b Ebe ọ bụ na ha ga-eji ụkwụ, ọ ga-ewe ha otu ụbọchị ma ọ bụ abụọ. Hana ma ihe nwunye di ya ga-eme. Ma, Hana asịghị ka ya nọrọ n’ụlọ. Ndị na-efe Chineke taa kwesịrị ịmụta ihe n’ihe a Hana mere. Anyị ekwesịghị ikwe ka ihe ọjọọ ndị ọzọ na-eme mee ka anyị kwụsị ife Chineke. Ọ bụrụ na anyị ekwe ka nke ahụ mee, anyị agaghị enweta ihe ndị ga-enyere anyị aka ịna-atachi obi.
-
-
Ọ Gwara Chineke Obi Ya n’EkpereṄomie Okwukwe Ha
-
-
b Ihe mere o ji bụrụ na njem ahụ ga-ewe ihe dị ka kilomita iri atọ bụ na ọ dị ka ọ̀ bụ obodo Elkena bụ́ Rema ka a na-akpọzi Arimatia n’oge Jizọs.
-