-
Ọ Gwara Chineke Obi Ya n’EkpereỤlọ Nche—2010 | Julaị 1
-
-
HANA nọ na-agbakeri ala, na-akwado maka njem ha na-aga ime, na-agbalị ichefu ụwa ya. Oge ahụ kwesịrị ịbụ oge obi ụtọ; Elkena, bụ́ di ya, na-akpọ ezinụlọ ya aga njem a a na-eme kwa afọ ịga fee ofufe n’ụlọikwuu dị na Shaịlo. Jehova zubere ka oge ahụ bụrụ oge aṅụrị. (Diuterọnọmi 16:15) O doro anya na kemgbe Hana bụ nwata, ọ na-atọ ya ụtọ ịga ememme ndị ahụ. Ma, ihe agbanweerela ya n’afọ ndị na-adịbeghị anya.
-
-
Ọ Gwara Chineke Obi Ya n’EkpereỤlọ Nche—2010 | Julaị 1
-
-
N’isi ụtụtụ, ezinụlọ ahụ dum nọ na-agbakeri ala. Mmadụ niile nọ na-akwado maka njem ahụ, ma ụmụaka. Iji ruo Shaịlo, ezinụlọ ahụ ga-aga ihe ruru kilomita iri atọ n’ógbè Ifrem bụ́ ugwu ugwu.c Ha jiri ụkwụ, njem ahụ ga-ewe ha otu ụbọchị ma ọ bụ abụọ. Hana maara ihe nwunye di ya ga-eme. Ma, Hana asịghị ka ya nọrọ n’ụlọ. O si otú ahụ gosi ndị na-efe Chineke ma n’oge ochie ma n’oge a ihe nlereanya magburu onwe ya. O nweghị mgbe ọ ga-ezi ezi anyị ikwe ka àgwà ọjọọ ndị ọzọ metụta ofufe anyị na-efe Chineke. Ọ bụrụ na anyị ekwe ka nke ahụ mee, ngọzi ndị na-agba anyị ume ịnọgide na-atachi obi ga-akwa nnọọ anyị.
-
-
Ọ Gwara Chineke Obi Ya n’EkpereỤlọ Nche—2010 | Julaị 1
-
-
c Njem ahụ dịruru ogologo otú ahụ n’ihi na o yiri ka obodo Elkena, bụ́ Rema, ọ̀ bụ otu ebe ahụ a maara dị ka Arimatia n’oge Jizọs.
-