-
Chineke Ya Kasiri Ya ObiỤlọ Nche—2011 | Julaị 1
-
-
Olee ihe Jehova mere maka ihe ndị ahụ na-echegbu Ịlaịja na ụjọ ahụ ji ya? Mmụọ ozi ahụ gwara Ịlaịja ka o guzoro n’ọnụ ọgba ahụ. O mere ihe a gwara ya n’agbanyeghị na ọ maghị ihe na-aga ime. Oké ifufe malitere ife! Ọ ga-abụrịrị na ifufe ahụ mere mkpọtụ dị egwu n’ihi na ọ gbawasịrị ugwu na nkume ndị dị ebe ahụ. Weregodị ya na ị na-ahụ ka Ịlaịja ji otu aka kpuchie anya ya ma were aka nke ọzọ jide uwe ajị ajị o yi ka ifufe ahụ ghara iburu ya. Mgbe ifufe ahụ fechara, ala ọma jijiji malitere nke mere ka Ịlaịja chọwa ihe ọ ga-eme ka ọ ghara ịda. Mgbe ala ọma jijiji ahụ mechara, nnukwu ọkụ malitere ịgba nke mere ka Ịlaịja banye n’ime ọgba ahụ ka ọkụ ahụ ghara imerụ ya ahụ́.—1 Ndị Eze 19:11, 12.
Baịbụl kwuru na Jehova anọghị ma n’oké ifufe ahụ ma n’ala ọma jijiji ahụ ma n’ọkụ ahụ. Ịlaịja maara na Jehova abụghị chi nkịtị, dị ka Bel, bụ́ chi ndị na-efe ya na-akpọ “Chi Na-achị Ígwé Ojii,” ma ọ bụ chi na-eweta mmiri ozuzo. Ọ bụ Jehova mere ka ihe ndị dị ka ifufe na mmiri na-akpa ike dị egwu, ma yanwa dị ike karịa ihe ọ bụla o kere eke. Eluigwe enweghịdị ike ịba ya! (1 Ndị Eze 8:27) Ma, oleezi otú ihe niile a merenụ si nyere Ịlaịja aka? Cheta na ụjọ ji ya. Ebe ọ bụ na Jehova, bụ́ onye nwere ike dị egwu, kwụ ya n’azụ, o kwesịghị ịtụwa Ehab na Jezibel ụjọ!—Abụ Ọma 118:6.
Mgbe ọkụ ahụ nyụrụ, ebe niile dara jụụ, Ịlaịja wee nụ “olu dị ala, nke dịkwa nwayọọ.” Olu ahụ jụkwara Ịlaịja ajụjụ ahụ a jụrụ ya na mbụ. Nke a mere ka Ịlaịja kwuokwa otú obi dị ya ọzọ.b O nwere ike ịbụ na ohere nke ugboro abụọ a o nwetara ikwu otú obi dị ya mere ka ahụ́ rukwuo ya ala. Ma, o doro anya na ihe ka gbaa Ịlaịja ume bụ ihe ‘olu ahụ dị ala, nke dịkwa nwayọọ’ gwaziri ya. Jehova mere ka o doo Ịlaịja anya na o kwesịghị ichewe na ọrụ ya bụ n’efu. Olee otú o si mee nke a? Chineke gwara Ịlaịja ọtụtụ ihe ya ka ga-eme iji wepụ ofufe Bel n’Izrel. O doro anya na ọrụ Ịlaịja rụrụ abụghị n’efu n’ihi na ihe Jehova bu n’obi ime ga-emezurịrị. Ihe ọzọkwa bụ na Jehova ka chọrọ ka Ịlaịja soro mezuo ihe ahụ Jehova bu n’obi ime, ọ bụ ya mere o ji nye ya ọrụ ọ ga-arụkwu, gwakwa ya otú ọ ga-esi rụọ ya.—1 Ndị Eze 19:12-17.
-
-
Chineke Ya Kasiri Ya ObiỤlọ Nche—2011 | Julaị 1
-
-
b O nwere ike ịbụ na ‘olu ahụ dị ala, nke dịkwa nwayọọ’ bụ mmụọ ozi ahụ nke “okwu Jehova” si n’ọnụ ya ruo Ịlaịja ntị, dị ka e kwuru ná 1 Ndị Eze 19:9. N’amaokwu nke 15, a kpọrọ mmụọ ahụ “Jehova.” Nke a nwere ike ime ka anyị cheta mmụọ ozi Jehova ji duo ndị Izrel mgbe ha nọ n’ala ịkpa. Chineke kwuru banyere mmụọ ozi ahụ, sị: “Aha m dị n’ime ya.” (Ọpụpụ 23:21) Anyị agaghị asị na ọ ga-abụrịrị Jizọs nwe olu ahụ, ma ọ dị mma icheta na tupu Jizọs abịa n’ụwa, o jere ozi dị ka “Okwu ahụ,” ya bụ, Ọnụ Na-ekwuchitere Chineke, bụ́ onye Jehova si n’aka ya zie ndị na-efe ya ozi.—Jọn 1:1.
-