Ì Nwere Okwukwe Yiri nke Elaịja?
ỌHA mmadụ taa na-ebibi okwukwe. Ndị oké agụmakwụkwọ ji ịdị adị nke Chineke eme ihe ọchị. Ndị ihu abụọ nke okpukpe na-akwa Chineke emo. Ụwa nke ịchụ ego na-eme omume n’ụzọ na-arịwanye elu dị ka a ga-asị na Chineke adịghị nnọọ mkpa. Ma àgwà ndị a hà na-emenye mmadụ ụjọ, ma ọ bụ kụda ya mmụọ, ma ọ bụ mee ka ọ ghara inwe mmasị, ihe ọ sọrọ ya bụrụ ihe ha na-akpata bụ otu ihe: A na-ekpochapụ okwukwe ya. Ka a sịkwanụ ihe mere Pọl onyeozi ji kpọọ okwukwe “mmehie ahụ nke na-ekegide anyị n’ụzọ dị mfe”!—Ndị Hibru 12:1, NW.
Ma eleghị anya ọ bụ ihe mere Pọl ji hụ na ọ dọọrọ uche anyị gaa ná ndụ nke ndị ikom na ndị inyom nwere okwukwe siri ike. (Ndị Hibru, isi nke 11) Ihe atụ ndị ahụ pụrụ ịkpali anyị ma mesie okwukwe anyị ike. Dị ka ihe atụ, ka anyị tụlee Elaịja onye amụma, na-elekwasị anya nanị n’akụkụ mmalite nke ọrụ amụma ya dị ogologo oge ma zuokwa ezu. O biri ndụ n’oge ọchịchị Eze Ehab na nwunye ya na-ekpere arụsị, Eze Nwanyị Jezebel, n’oge mgbe, dị ka ọ dị ugbu a, okwukwe n’ezi Chineke na-adalata ala.
Alaeze Ebo Iri ahụ nke Rụrụ Arụ
Lee ụdị mmadụ abụọ ha bụ! Ehab bụ eze nke asaa n’Alaeze ebo iri nke Israel. Ọ bụ ezie na isii ndị bu ya ụzọ nwere obi ọjọọ, Ehab ka njọ. Ọ bụghị nanị na o mere ka ofufe nwa ehi rụrụ arụ nke mba ahụ gaa n’ihu kama ọ lụrụ nwa eze nwanyị nke mba ọzọ bụ́ Jezebel, si otú ahụ na-ewebata ụdị ofufe chi ụgha ahụ bụ́ Beal nke siri ike karịa nke ọ bụla ọzọ e nweworo ná mba ahụ.—1 Ndị Eze 16:30-33.
Jezebel emikpuwo emikpu n’ofufe Beal site na mgbe ọ bụ nwata. Nna ya bụ Etbeal, onye nchụàjà nke Ashtọret, (nwunye Beal), e jiriwo igbu mmadụ guzobe onwe ya n’ocheeze Saịdọn, alaeze dị nnọọ n’ebe ugwu nke Israel. Jezebel mere ka di ya na-esighị ike n’omume ọma guzobe ofufe Beal n’Israel. Tupu ogologo oge agaa, e nwere 450 ndị amụma nke chi ụgha ahụ na 400 ndị amụma nke chi nwanyị Asherah n’ala ahụ, ha nile na-eso eze anọdụ ná nri. Lee ka ụdị ofufe ha si bụrụ ihe arụ n’anya ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova! Ihe oyiyi dị iche iche nke akụkụ ahụ nwoke, ememe dị iche iche nke ọmụmụ nwa, ndị akwụna ụlọ nsọ (ma ndị ikom ma ndị inyom), ọbụna iji ụmụaka achụ àjà—ụdị ihe ndị ahụ bụ akụkụ ndị rụrụ arụ nke okpukpe a na-asọ oyi. Site ná nkwado Ehab, ọ gbasara n’enweghị mgbochi n’alaeze ahụ dum.
Ọtụtụ nde ndị Israel chezọrọ Jehova, Onye Okike nke ụwa na ngagharị nke mmiri ya. Nye ha ọ bụ Beal na-eji mmiri ozuzo agọzi ala ná ngwụsị nke oge ọkọchị. Kwa afọ, ha na-eji olileanya na-elegara ‘Onye Ahụ Na-anya Igwe Ojii’ anya, bụ́ chi nke a a na-akpọ chi ọmụmụ nwa na udu mmiri, iweta ogologo ọkọchị ahụ ná njedebe. Site n’afọ ruo n’afọ, mmiri ga-ezo. Site n’afọ ruo n’afọ, Beal na-enweta otuto maka ya.
Elaịja Ebuo Amụma Ụkọ Mmiri Ozuzo
Ọ bụ ma eleghị anya ná ngwụsị nke otu oge okpomọkụ dị ogologo, a na-enweghị mmiri ozuzo—kpọmkwem mgbe ndị ahụ na-amalite ịtụ anya ka Beal weta mmiri ozuzo nke na-enye ndụ—ka Elaịja batara n’ọgbọ.a O ji ụda mberede nke égbè eluigwe dabata n’ihe ndekọ Bible. A gwara anyị ihe dị nta banyere nzụlite ya, ọ dịghị ihe e kwuru banyere ndị mụrụ ya. Ma n’adịghị ka égbè eluigwe, Elaịja abụghị onye na-eweta oké mmiri ozuzo. Ọ maara Ehab ọkwa, sị: “Jehova, bụ́ Chineke nke Israel, na-adị ndụ, onye m guzoworo n’ihu ya, igirigi ma ọ bụ mmiri ozuzo agaghị adị ma ọlị n’afọ ndị a, ma ọ bụ nanị dị ka okwu m si dị.”—1 Ndị Eze 17:1.
See onyinyo nwoke nke a, yiri uwe akpụkpọ anụ ya nke onye ime obodo. Ọ bụ onye obodo ugwu ugwu ahụ bụ́ Gilead, yie ka a zụlitere n’etiti ndị dị umeala n’obi na-azụ atụrụ. Ọ na-eguzo n’ihu eze ukwu bụ́ Ehab, ma eleghị anya kpọmkwem n’obí ukwu ya, ya na ụlọ ọdụ ya a ma ama, ụba ihe ịchọ mma ya ndị pụrụ nnọọ iche na arụsị ndị buru ibu. N’ebe ahụ, n’obodo Sameria ahụ e wusiri ike nke na-ekwo ekwo, ebe e chezọworo nnọọ ofufe Jehova, ọ na-agwa Ehab na chi ya nke a, Beal a, enweghị ike, bụ́ ihe na-adịghị adị. N’afọ a na n’afọ ndị na-abịa, ka Elaịja na-ekwupụta, a gaghị enwe mmiri ozuzo ma ọ bụ igirigi!
Olee ebe o si nweta okwukwe dị otú ahụ? Ọ̀ bụ na ụjọ atụghị ya iguzo n’ebe ahụ n’ihu eze isi ike nke a, nke si n’ezi ofufe dapụ. Ma eleghị anya. Mgbe ihe karịrị otu puku afọ gasịrị, onye nne ji ya na Jisọs bụ́ Jemes na-emesi anyị obi ike na Elaịja bụ “mmadụ yiri anyị n’ahụ ya.” (Jemes 5:17) Ma rịba okwu Elaịja ama: “Jehova, bụ́ Chineke nke Israel, na-adị ndụ, onye m guzoworo n’ihu ya.” Elaịja bu n’uche na dị ka onye na-ejere Jehova ozi, ọ na-eguzo n’ihu ocheeze dị elu karịa nke Ehab—ocheeze nke Eze Onyenwe eluigwe na ala! Ọ bụ onye nnọchianya, onye ozi nke ocheeze ahụ. Site n’ọnọdụ nke a, gịnị dị n’ebe Ehab, ntakịrị mmadụ bụ eze nke na-enwekwaghị ngọzi Jehova, nọ nke ọ ga-atụ egwu ya?
Ọ bụghị ihe ndabara na Jehova bụ onye dị adị nye Elaịja. O doro anya na onye amụma ahụ amụwo ihe ndekọ nke otú Chineke si mesoo ndị Ya. Jehova adọwo ndị Juu aka ná ntị na ya ga-eji ụkọ mmiri ozuzo na ụnwụ nri taa ha ahụhụ ma ọ bụrụ na ha echigharịghị pụọ n’ife chi ụgha dị iche iche ofufe. (Deuterọnọmi 11:16, 17) Site n’obi ike na Jehova ga-emezu okwu ya mgbe nile, Elaịja ‘kpere ekpere ka mmiri ghara izo.’—Jemes 5:17.
Igosipụta Okwukwe Site n’Ịgbaso Nduzi
Otú ọ dị, ka ọ dị mgbe ahụ, ihe Elaịja kpọsara tinyere ya n’ihe ize ndụ nke ịnwụ anwụ. Ọ bụ oge a chọrọ akụkụ ọzọ nke okwukwe ya. Iji nọgide ndụ, ọ ghaghị ikwesị ntụkwasị obi n’ịgbaso ntụziaka ndị Jehova na-enye: “Si n’ebe a pụọ, chere onwe gị n’ihu n’iru anyanwụ, zoo onwe gị ná mmiri iyi Kerit, nke dị n’ihu Jọdan. Ọ ga-erukwa, na ị ga-aṅụ mmiri sitere na mmiri iyi ahụ; ọ bụkwa ugoloọma ka m nyeworo iwu ịzụ gị n’ebe ahụ.”—1 Ndị Eze 17:3, 4.
Elaịja rubere isi ozugbo. Ọ bụrụ na ọ chọrọ ịlanarị ụkọ mmiri ozuzo na ụnwụ nri ahụ nke dakwasịrị ala ahụ, ọ ghaghị ịdabere ná ndokwa Jehova meere ya. Nke a adịghị mfe ma ọlị. Ọ pụtara izobe onwe ya, na-ebipụ iche kpam kpam ruo ọtụtụ ọnwa na-akwụsịghị akwụsị. Ọ pụtara iri anụ na achịcha nke ugoloọma na-ebutere ya—bụ́ nnụnụ ndị na-eri ihe nwụrụ anwụ nke e weere n’ihe na-adịghị ọcha n’Iwu Mosis—na ịtụkwasị Jehova obi na anụ ndị dị otú ahụ abụghị nke nwụụrụ onwe ha kama na ha bụ anụ ndị a wụsiworo ọbara ha n’ụzọ kwesịrị ekwesị dị ka iwu si dị. Ọrụ ebube nke a dịrị ogologo oge yiri nnọọ ihe na-apụghị ime eme nye ụfọdụ ndị na-enye nkọwa Bible nke na ha na-atụ aro na okwu mbụ n’ebe a aghaghị ịpụtawo “ndị Arab,” ọ bụghị “ugoloọma” ma ọlị. Ma ugoloọma bụ ihe kasị mma ịhọrọ. Ọ dịghị onye ga-atụ anya na nnụnụ nke dị ala, nke na-adịghị ọcha, nke bu nri ha rifọrọ erifọ efega n’ime ọzara na-azụ Elaịja n’ezie, bụ́ onye Ehab na Jezebel na-achọ n’alaeze nile dị gburugburu!—1 Ndị Eze 18:3, 4, 10.
Ka ụkọ mmiri ahụ nọgidere na-aga n’ihu, ọ pụrụ ịbụworị na Elaịja malitere inwe nchegbu banyere mmiri ọ na-enweta ná ndagwurugwu mmiri iyi Kerit. Ihe ka ukwuu ná ndagwurugwu mmiri iyi ndị nke Israel takpọsịrị n’oge ụkọ mmiri ozuzo, ‘mgbe ụbọchị ụfọdụ gasịkwara,’ nke a takpọkwara. Ị̀ pụrụ iche echiche otú ọ dị Elaịja ka mmiri ahụ ji nwayọọ nwayọọ na-akwụsị ịgbasi ike, ọdọ mmiri ndị ahụ na-agbadakwa kwa ụbọchị? Ọ ghaghị nnọọ inwewo nchegbu banyere ihe ga-eme mgbe mmiri ahụ gwụsịrị. Ka o sina dị, Elaịja ji ikwesị ntụkwasị obi nọgide. Ọ bụ nanị mgbe mmiri ahụ takpọsịrị ka Jehova nyere usoro ọzọ nke ntụziaka ya. Gaa Zarefat, ka a gwara onye amụma ahụ. N’ebe ahụ ọ ga-enweta ihe ga-akwado ndụ ya n’ebe obibi nke otu nwanyị di ya nwụrụ.—1 Ndị Eze 17:7-9.
Zarefat! Obodo ahụ dịịrị obodo ukwu Saịdọn, ebe Jezebel sitere, bụ́kwa ebe nna ya chịworo dị ka eze! Ọ̀ ga-abụ nke ihe ize ndụ na-adịghị ya? Ọ pụrụ inyewo Elaịja nchekasị. Ma “o wee bilie, jee.”—1 Ndị Eze 17:10.
Jehova Na-enye Ihe Nkwado na Ndụ
Ngwa ngwa e nyere nrubeisi ya ụgwọ ọrụ. O zutere nwanyị di ya nwụrụ dị ka e buru ụzọ kwuo, ọ hụkwara n’ime ya kpọmkwem ụdị okwukwe nke a na-enweghị ma ọlị n’etiti ndị mba ya. Nwanyị a di ya nwụrụ nke dara ogbenye nwere nanị ụtụ ọka na mmanụ ga-ezu isi otu ugbo nri maka ya na nwa ya nwoke na-eto eto. Ma, ọbụna n’oké mkpa o nwere, ọ dị njikere ibu ụzọ meere Elaịja achịcha, na-atụkwasị nkwa ya obi nke na Jehova ga-ahụ na udu mmanụ ya na udu ụtụ ọka ya ga-adịgide ruo ogologo oge nile e nwere mkpa. Ka a sịkwa ihe mere Jisọs Kraịst ji cheta ihe atụ ikwesị ntụkwasị obi nke nwanyị ahụ di ya nwụrụ mgbe ọ na-akatọ ndị Israel na-ekwesịghị ntụkwasị obi n’ụbọchị ya!—1 Ndị Eze 17:13-16; Luk 4:25, 26.
Otú ọ dị, n’agbanyeghị ọrụ ebube nke a, a na-achọ itinye okwukwe nwanyị ahụ di ya nwụrụ ma nke Elaịja n’ule dị ike. Nwa ya nwoke nwụrụ ná mberede. N’oké mwute, nwanyị ahụ di ya nwụrụ pụrụ nanị iche na ihe ọdachi nke a aghaghị isite n’aka Elaịja, bụ́ “onye nke Chineke.” Ọ na-eche ma à na-ata ya ahụhụ n’ihi mmehie o mere n’oge gara aga. Ma Elaịja kuuru nwa ya nwoke nke ndụ na-adịghị n’ime site n’aka ya wee buru ya gaa n’ọnụ ụlọ dị n’elu. Ọ maara na Jehova pụrụ inye ihe karịrị ihe nkwado ndụ. Jehova bụ isi iyi nke ndụ n’onwe ya! Ya mere Elaịja kpesiri ekpere ike ugboro ugboro ka ndụ nwata ahụ lọghachite.
Elaịja abụghị onye mbụ nwere okwukwe dị otú ahụ ná mbilite n’ọnwụ, kama n’ihe ndekọ Bible, ọ bụ onye mbụ e jiri mee otu. Nwa nwoke ahụ “wee dị ndụ”! Ọṅụ nne ya aghaghị ịbụ ihe dị mma nkiri ka Elaịja na-akpọtara ya nwa ya nwoke na-ekwu okwu ndị ahụ dị mfe, bụ́: “Lee, nwa gị na-adị ndụ.” Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ bụ n’anya mmiri ka o kwuru, sị: “Ugbu a amawo m nke a na onye nke Chineke ka ị bụ, na okwu Jehova bụkwa eziokwu n’ọnụ gị.”—1 Ndị Eze 17:17-24.
“Chineke M Bụ Jehova”
Lee ihe na-emetụ n’obi, leekwa ka o si bụrụ ihe kwesịrị ekwesị, na aha Elaịja pụtara “Chineke M Bụ Jehova”! N’oge ụkọ mmiri na ụnwụ nri, Jehova nyere ya nri na ihe ọṅụṅụ; n’oge ọgba aghara n’omume, Jehova nyere ya nduzi dị mma; n’oge ọnwụ, Jehova jiri ya weghachi ndụ. O yikwara ka n’oge ọ bụla a kpọrọ Elaịja igosipụta okwukwe ya n’ebe Chineke nọ—site n’ịtụkwasị Ya obi inye ihe, site n’ịgbaso nduzi Ya nile, site n’ịdabere n’ebe Ọ nọ ido aha Ya nsọ—e ji ihe ndị ọzọkwa ọ ga-eji nwee okwukwe na Jehova nyeghachi ya ụgwọ ọrụ. Otú a ka ọnọdụ na-adị ka ọ nọgidere na-anara ọrụ ndị siri ike na ọbụna na-atụ ụjọ site n’aka Chineke ya, Jehova; n’ezie, ụfọdụ n’ime ọrụ ebube ya ndị na-ebu isi karịsịa ka na-abịa n’ihu ya.—Lee 1 Ndị Eze, isi nke 18.
Ọ dịkwaara nnọọ ndị na-ejere Jehova ozi taa otú ahụ. Ọ pụrụ ịbụ na a gaghị enye anyị nri n’ụzọ ọrụ ebube ma ọ bụ jiri anyị kpọlite mmadụ n’ọnwụ; nke a abụghị ọgbọ maka ọrụ ebube ndị dị otú ahụ. Otú ọ dị, Jehova n’onwe ya agbanwebeghị ma ọlị eri ụbọchị Elaịja.—1 Ndị Kọrint 13:8; Jemes 1:17.
A pụkwara ikenye anyị onwe anyị ọrụ ụfọdụ na-akụda obi, ókèala ụfọdụ siri ike ma na-eyi egwu a ga-eji ozi Chineke nyere ruo. Anyị pụkwara iche mkpagbu ihu. Anyị pụrụ ọbụna ịnọ n’agụụ. Ma nye ndị na-ekwesị ntụkwasị obi na nye nzukọ ya n’ozuzu ya, ugboro ugboro Jehova egosipụtawo na ya ka na-eduzi ma na-echebe ndị na-ejere ya ozi. Ọ ka na-enye ha ike ịrụ ọrụ ọ bụla o kenyere ha ịrụ. Ọ ka na-enyekwara ha aka ịtachi obi n’ule ọ bụla pụrụ ịbịakwasị ha n’ụwa nke a nsogbu jupụtara.—Abụ Ọma 55:22.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ma Jisọs ma Jemes kwuru na mmiri e zoghị n’ala ahụ ruo “afọ atọ na ọnwa isii.” Ma, a sịrị na Elaịja guzoro n’ihu Ehab iweta ụkọ mmiri ozuzo ahụ “n’afọ nke atọ”—ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ bụ ịgụ site n’ụbọchị a mara ọkwa ụkọ mmiri ozuzo ahụ. Ya mere, ọ ghaghị ịbụwo mgbe otu oge ọkọchị nke mmiri na-ezoghị na ya nke dị ogologo gasịrị mgbe o guzoro nke mbụ ya n’ihu Ehab.—Luk 4:25; Jemes 5:17; 1 Ndị Eze 18:1.
[Foto dị na peeji nke 18]
Dị ka Elaịja, ì nwere okwukwe na Jehova ga-elekọta mkpa ndị na-ejere ya ozi?