-
Ọ Tachiri Obi Ruo ỌgwụgwụṄomie Okwukwe Ha
-
-
Obi adịghị Ehazaya mma n’ihi ozi a e ziri ya, ya achọọ imesi Ịlaịja ike. O zigara ndị agha dị mmadụ iri ise na onyeisi ha ka ha gaa kpụtara ya Ịlaịja. Mgbe ha hụrụ ka Ịlaịja “nọ ọdụ n’elu ugwu,”a onyeisi ndị agha ahụ ji ọnụ ọjọọ gwa Ịlaịja na eze sị ya ‘gbadata.’ O nwere ike ịbụ na ihe ihe a ha gwara ya pụtara bụ ka ọ bịa ka a gaa gbuo ya. Legodị, n’agbanyeghị na ha ma na Ịlaịja bụ “onye nke Chineke,” ndị agha ahụ chere na ha ga-eyili ya egwu. Ma, ha agaghị emeli ya. Ịlaịja gwara onyeisi ndị agha ahụ, sị: “Ọ bụrụ na m bụ onye nke Chineke, ka ọkụ si n’eluigwe daa rechapụ gị na ndị agha iri ise gị.” Chineke mere ihe ozugbo ahụ. “Ọkụ wee si n’eluigwe daa rechapụ ya na ndị agha iri ise ya.” (2 Ndị Eze 1:9, 10) Ihe a mere ndị agha ahụ na-echetara anyị na obi anaghị adị Jehova mma ma ndị mmadụ na-akparị ndị na-ejere ya ozi.—1 Ihe E Mere 16:21, 22.
-
-
Ọ Tachiri Obi Ruo ỌgwụgwụṄomie Okwukwe Ha
-
-
Olee ihe nyeere Ịlaịja aka ịtachi obi n’agbanyeghị na ọ bụ ndị na-anaghị asọpụrụ Chineke gbara ya gburugburu? Anyịnwa nwere ike ịmụta ihe n’azịza ajụjụ a. Ò nwetụla mgbe ezigbo iwe were gị n’ihi na onye ị hụrụ n’anya jụrụ ige ntị n’ihe ga-abara ya uru ma họrọ ime ihe ga-aghọ ya ahịa? Olee ihe anyị ga-eme ma ụdị ihe a mee? Ebe ndị agha ahụ hụrụ Ịlaịja, ya bụ, “n’elu ugwu,” ga-enyere anyị aka ịma ihe anyị ga-eme. Anyị amaghị ihe mere Ịlaịja ji gaa ebe ahụ. Ma, anyị ma na o jighị ekpere egwu egwu. N’ihi ya, o nwere ike ịbụ na ọ gara ebe ahụ dị jụụ ka ka ọ nọrọ ebe ahụ kpee ekpere. (Jems 5:16-18) Anyị kwesịkwara ịna-ewepụta oge mgbe naanị anyị nọ, na-akọrọ Chineke ihe niile bụ́ mkpa anyị na ihe niile na-echegbu anyị. Mgbe anyị na-eme otú ahụ, anyị kwesịrị ịna-akpọ ya aha ya. Ime otú ahụ ga-enyere anyị aka ịtachi obi ọ bụrụgodị na ndị gbara anyị gburugburu na-eme otú o si masị ha.
-
-
Ọ Tachiri Obi Ruo ỌgwụgwụṄomie Okwukwe Ha
-
-
a Ụfọdụ ndị ọkà mmụta kwuru na ugwu ahụ e kwuru okwu ya ebe a bụ Ugwu Kamel. Ọ bụ ebe ahụ ka Chineke nọ mee ka Ịlaịja merie ndị amụma Bel n’afọ ole na ole gara aga. Ma, Baịbụl akpọghị aha ugwu ahụ.
-