Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w04 1/1 p. 32
  • Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
w04 1/1 p. 32

Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị?

Ị̀ NA-AHỤ onwe gị dị ka onye ibu mmetụta uche na-anyịgbu n’ihi nsogbu ndị metụtara ezinụlọ, ahụ́ ike, ọrụ gị, ma ọ bụ oké ibu ọrụ ndị ọzọ? Ọtụtụ ndị nọ n’ọnọdụ ahụ. Ònyekwa ka ikpe na-ezighị ezi, mpụ, na ime ihe ike na-adịghị emetụta taa? N’ezie, ọ dị nnọọ ka Bible si kwuo: “Ihe nile e kere eke nọgidere na-asụkọ ude ma na-anọkọ n’ihe mgbu ruo ugbu a.” (Ndị Rom 8:22) Ọ bụghị ihe ijuanya na ọtụtụ mmadụ na-ajụ, sị: ‘Chineke ọ̀ na-eche banyere anyị? Ọ̀ ga-enyere anyị aka?’

Eze Solomọn maara ihe gwara Chineke n’ekpere, sị: “Gị onwe gị amawo obi ụmụ mmadụ, nanị Gị.” Solomọn nwere obi ike ọ bụghị nanị na Chineke maara banyere anyị kamakwa ọ na-eche banyere anyị n’otu n’otu. Ọ bụ ya mere o ji nwee ike ịrịọ Chineke ka “o sikwa n’eluigwe . . . nụrụ” ma zaa ekpere onye ọ bụla nke na-atụ egwu Chineke bụ́ onye na-ekpughere Chineke “ihe otiti ya na ihe mgbu ya.”—2 Ihe E Mere 6:29, 30.

Taa, Jehova Chineke ka na-eche banyere anyị, ọ na-akpọkwa anyị òkù ikpegara ya ekpere. (Abụ Ọma 50:15) Ọ na-ekwe nkwa ịza ekpere ndị e ji ezi obi kpee bụ́ ndị kwekọrọ n’uche ya. (Abụ Ọma 55:16, 22; Luk 11:5-13; 2 Ndị Kọrint 4:7) Ee, Jehova na-ege ntị ‘n’ekpere ọ bụla, ma ọ bụ arịrịọ amara ọ bụla, nke ga-adịrị mmadụ ọ bụla, ma ọ bụ nke ga-adịrị ndị ya nile.’ N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị atụkwasị Chineke obi, na-ekpe ekpere maka enyemaka ya ma na-abịaru ya nso, anyị ga-enweta nlekọta anya na nduzi ịhụnanya ya. (Ilu 3:5, 6) Jems onye so dee Bible na-emesi anyị obi ike, sị: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.”—Jems 4:8.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya